Omenugha Agbapuorola Ndị Nnobi Mmiri Ọñụñụ, Tinyesie Ọkụ Okporo Ụzọ

Mar 11, 2021 - 14:34
Mar 11, 2021 - 17:49
 0
Omenugha Agbapuorola Ndị Nnobi Mmiri Ọñụñụ, Tinyesie Ọkụ Okporo Ụzọ
Omenugha Agbapuorola Ndị Nnobi Mmiri Ọñụñụ, Tinyesie Ọkụ Okporo Ụzọ
Omenugha Agbapuorola Ndị Nnobi Mmiri Ọñụñụ, Tinyesie Ọkụ Okporo Ụzọ
Omenugha Agbapuorola Ndị Nnobi Mmiri Ọñụñụ, Tinyesie Ọkụ Okporo Ụzọ

Izunna Okafor dere akụkọ a


Ọ kpọtụrụ akpọtụ ma zụọ azụọ na nsonso a dịka Dọkịta Nelson Omenụgha gbapuuru ndị obodo ya mmiri ọñụñụ, ma tinyesikwara ha ọkụ okporoụzọ ji ike si n'anyanwụ were arụ ọrụ.

Ya bụ mmiri bụ nke Dọkịta Omenugha gbapuuru ndị Umuru dị na Nnobi, n'okpuru ọchịchị ime obodo 'Idemili North' nke steeti Anambra, ebe ọkụ okporoụzọ ahụ bụkwa nke a rụnyesiri n'okporoụzọ dị n'ógbè ahụ.

N'okwu ya oge ọ na-agbape mmiri ọñụñụ ahụ, Bishọọpụ ụka Katọliiki na Dayọsiisi Ekwulọbịa, bụ 'Most Revd' Peter Okpalaeke, kọwara ọrụ ọma ahụ dịka nke magburu onwe ya, ma kèléé Dọkịta Omenụgha maka ịmalite, ịrụchapụ na inyefè mmiri ahụ n'aka obodo ahụ, bụkwa nke ọ kọwara dịka ihe kwesiri nñòmi.

Ọ kọwara nwaokorobịa ahụ bụ Dọkịta Omenụgha dịka onye nne na nna ya zụrụ nke ọma, zụlite ya n'egwu Chineke, ma kụnyekwa ezi mkpụrụ n'ime ya, bụkwazị nke o gosipụtagoro site n'ezi ọrụ. 

Dịka ọ na-agọzi mmiri ahụ, Bishọọpụ Ọkpalaeke gọziri nwoke ahụ gbapuru ya bụ mmiri, kpeere ya ekpere ọganihu, ma kpọkukwazie ndị ọzọ bụ ndị Chineke gọziri n'otu ụzọ maọbụ nke ọzọ, ka ha ñòmie ọmarịcha akparamagwa ahụ, site n'iji akụnụba na ihe ndị ọzọ Chineke jiri gọzie ha wee jeere Chineke, ụmụ mmadụ na obodo ozi.

N'okwu nke ya n'ebe ahụ, otu onye ọzọ sonyere na mmemme ịgbape mmiri ahụ, ma bụrụkwa Kọmishọna na-ahụ maka ihe e ji enyere ndụ aka, bụ Maazị Emeka Ezenwanne; ya na ògbò ya bụ Kọmishọna na-ahụ maka agụmakwụkwọ dị ala na steeti ahụ, bụ Ọkammụta Kate Omenugha fọrọ ekele n'ụkpa wee bunye ya bụ nwaokorobịa rụụrụ obodo ya ihe ndị ahụ. Ha kpọkuzịkwara ndị ntorobịa obodo ahụ ka ha na-echeta ụlọ na obodo ha oge niile site n'iwelata akụnụba ha ụlọ ma na-arụnye ihe n'obodo ha, iji mee ka obodo dị mma.

Ụfọdụ ndị ọzọ sonyere na mmemme ahụ, nke gụnyere onye na-anọchite anya ọgbọ nta nkwàdo Aguata nke abụọ n'ụlọ omeiwu steeti Anambra, bụ Maazị Okechukwu Okoye; ògbò ya nke na-anọchite anya ọgbọ nta nkwàdo Njikọka nke abụọ, bụ Maazị Pete Ibida; na onyeisi ụlọọrụ atụmatụ ahụike 'Anambra State Health Insurance Agency' bụ Dọkịta Simon Onyemaechi mere ka a mara na ihe ahụ nwata nwoke ahụ mere bụ nnukwu ntụnye pụtara ihè n'ịkwàlite ọnọdụ mmepe obodo ahụ, ọbụladị dịka ha gwara ndị ntorobịa obodo ndị ọzọ ka ha ñomie ma meekwa ntụnye dị etu ahụ n'ịkwalite ọnọdụ mmepe obodo ha dị icheiche, maka na a gaghị echebekwanụ gọọmentị ka o mee ihe niile.

Na mbụ n'okwu ya, ya bụ nwa amadi rụrụ ọrụ ahụ, bụ Dọkịta Omenugha mere ka a mara na ihe kpaliri mmụọ ya ịgbapu mmiri ahụ bụ n'ihi etu ndị obodo ahụ si akpagharị achọ ezigbo mmiri ọñụñụ oge niile, kemgbe ọtụtụ ahọ gara aga.

O kwuru na o kpebiri ịrụrụ ha mmiri ahụ iji gosipụta ezi nzọpụụkwụ, dịka onye ndu ndị ntorobịa ọ bụ, ma sikwazie n'ụzọ dị etu ahụ tụnye ụtụ n'ụzọ pụtara ìhè n'ịkwàlitè mmepe obodo ya, maka na ọ na-adị mma isi n'ụlọ mara mma wee pụba ama.

Mmemme ịgbape mmiri ahụ bụ nke dọtara ọtụtụ ndị dị icheiche e ji okwu ha agba ìzù na ngalaba dị icheiche, bụ ndị siri mpaghara ọtụtụ ebe na steeti ahụ wee bịa iji anya ha hụ ma nabata ya bụ ezi ọrụ Dọkịta Omenụgha rụrụ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484