Ndị Uweojii Azọpụtala Mmadụ Atọ Ndị Ntọ Zoro n'Ime Ọhịa Zamfara

Feb 13, 2022 - 22:27
 0
Ndị Uweojii Azọpụtala Mmadụ Atọ Ndị Ntọ Zoro n'Ime Ọhịa Zamfara

Izunna Okafor dere akụkọ a

Mmadụ atọ ndị ntọ jidere ma zoo n'ime ọhịa Kunchin Kalgo dị na steeti Zamfara abụrụla ndị nweere onwe ha, dịka ndị uweojii na ndị ọrụ nchekwa steeti ahụ zọpụtàrà ha n'ebe e zoro ha.
 
Onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhaneze na ndị uweojii na steeti ahụ, bụ Mohammed Shehu bụ ya kwupụtara nke a n'ozi ọ kụpụụrụ ndị nta akụkọ, bụkwa nke o sitere na ya kọwaa ọ bụ oge ndị uweojii ahụ na-awagharị n'ime ọhịa ahụ na-achọ ndị omekoome na ndị e ji eji ka ha hụrụ ma zọpụta mmadụ ise ahụ, bụcha ụmụnwoke.

Dịka ọ na-akọwa na ọ bụ n'okpuru ọchịchị ime obodo Tsafe ka ime ọhịa ahụ dị, o mèkwàrà ka a mara na mmadụ anọ n'ime ndị ahụ a zọpụtàrà bụ ndị sitere okpuru ọchịchị ime obodo Zuru nke steeti Kebbi, ma bụrụkwa ndị a tọọrọ n'ogologo ụzọ awara awara ahụ siri Yankara gaa Tsafe. O kwukwazịrị na otu onye nke ọzọ bụ onye a tọọrọ na mpaghara okpuru ọchịchị ime obodo Kontagora nke steeti Niger.

Maazị Shehu gàkwàzịrị n'ihu kwuo na ndị ahụ nọrọ mkpụrụ ụbọchị iri na otu n'ime ọhịa ahụ n'aka ndị ahụ tọọrọ ha. O mere ka a mara na ndị uweojii ahụ duru ha gaa ụlọọgwụ maka ilekọta ha anya oge ahụ a zọpụtachara ha, ma mechakwa, gbaa ha ajụjụọnụ banyere etu ha na ihe siri jee.

O kwupụtara na Kọmishọna na-ahụ maka ndị uweojii na steeti ahụ, bụ CP Ayuba Elkanah mètèèrè ndị ahụ ebere oge ọ hụrụ ha, ọkachasị n'ihi ihe ha gabigara n'aka ndị ntọ ahụ n'ime ọhịa ebe ahụ e zoro ha.

Dịka ọ na-ekèle ndị ọrụ ya maka ezi ọrụ ahụ ha rụrụ, ya bụ onyeisi ndị uweojii kwèzịrị nkwà na site na njikọaka ụlọọrụ nchekwa ndị ọzọ dị icheiche, na ha ga-aga n'ihu ịrụsi ọrụ ike na ịgbasi mbọ ike, iji hụ na a zọpụtara ma tọhapụchaa ndị niile e ji eji na steeti ahụ.

Ọ gwakwara ndị ntọ na ndị omekoome ndị ọzọ nọgasị na steeti ahụ ka ha sepụ aka n'arụrụala maọbụ kwakọrọ ngwongwo ha rie mbọmbọ ọsọ na steeti ahụ, maka na ụlọọrụ ya agaghị ezu ike, ruo mgbe ha memìlàchàrà akaọrụ ndị omekoome na steeti ahụ ma kwàlitekwa ezi ọnọdụ nchekwa tọrọ àtọ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484