Ndị Ọrụ Uwe Ojii n'Anambra Anwụchikọọna Ndị A na-Enyo Enyo na Ha Bụ Ndị Ohi na Ndị Otu Nzuzo

Sep 18, 2017 - 06:01
Jan 23, 2021 - 17:48
 0
Ndị Ọrụ Uwe Ojii n'Anambra Anwụchikọọna Ndị A na-Enyo Enyo na Ha Bụ Ndị Ohi na Ndị Otu Nzuzo

Izunna Okafor, Awka, Nigeria

Ndị ọrụ uwe ojii na steeti Anambra nọrọ n'izu gara aga wee nwụchikọọ mmadụ dị iri atọ n'ọnụ ọgụgụ, bụ ndị a na-enyo enyo na ha bụ ndị ohi na ndị otu nzuzo. Mmadụ iri abụọ na abụọ n'ime ndị omekoomè a ka a na-enyo enyo na ha bụ ndị otu nzuzo, ebe mmadụ asatọ ndị ọzọ bụ ndị a na-enyo na ha bụ ndị ekperima.

Ndị ọrụ uwe ojii na steeti Anambra nọrọ n'izu gara aga wee nwụchikọọ mmadụ dị iri atọ n'ọnụ ọgụgụ, bụ ndị a na-enyo enyo na ha bụ ndị ohi na ndị otu nzuzo. Mmadụ iri abụọ na abụọ n'ime ndị omekoomè a ka a na-enyo enyo na ha bụ ndị otu nzuzo, ebe mmadụ asatọ ndị ọzọ bụ ndị a na-enyo na ha bụ ndị ekperima.

Ihe e nwetasịrị n'aka ndị ahụ gụnyere: egbe 'AK47' na-agba ọnụ narị atọ iri isii na isii; ọtụtụ nsụnsụ egbe dị iche iche, uwe ndị otu IPOB, ọgwụ agwọrọ agwọ na otụtụ ihe ndị ọzọ e ji ebibi ndụ.

Ka ọ na-akpụgharị ndị ahụ n'isi ụlọ ọrụ ndị uwe ojii dị n'Amawbịa, onye isi ndị uwe ojii na steeti Anambra bụ maazị Garba Umar sị na mmadụ abụọ n'ime ndị ahụ --- Peter Onyebụchi na Nnaemeka Ugwuokpe bụ ndị 'otu mmadụ isii', ndị ahụ gbagburu otu uwe ojii ma zukwa ohi n'ebe dị iche iche a na-ere mmanụ ọkụ na steeti ahụ n'ọnwa gara aga.

Ọ sị na otu onye n'ime ndị ahụ a na-enyo enyo, bụ Kenneth Chiemezie bụ onye otu ọzọ na-eji ọgbaa tum tum ezu ndị aka ha dị ọcha ohi ma sịkwa na o duuru ndị uwe oji wee ga gosi ha ebe ndị na-amụgosi ha ọrụ na-ezo.

Maazị Umar sị na ndị ahụ niile ekwupụtachago ihe dị iche iche ha mere na akụmakụ ha kụrụ; na ha na-enyezịkwara ndị uwe ojii ahụ aka na nnyocha ha iji wee nwụchikọọ ndị otu ha ndị fọrọ afọ.

Ka ọ na-ekwupụta ihe o mere, Peter Onyebụchi, onye sịrị na ọ bụ onye na-azụ ahịa n'ahịa ebe a na-ere ihe ndị e ji arụ ụlọ n'Ogidi, kwetara ma kwuo hoohaa na egbe 'AK47' ahụ e nwetere n'ụlọ ya bụ nke otu enyi ya a na-akpọ 'Trigger', bụ onye ọ sị na ọ na-akwapụ n'ụlọ ya ugbu a.

Ndị a bụzịkwa ndi a ga-anọ oge na-adịghị anya wee kpụpụ ụlọ ikpe ma e mechaa nnyocha, ka e wee jiri usoro iwu wee nyụchaa ha anya.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.