Ndị Ụmụeri Emee Mmemee Iri Ji Ọhụụ Ka Ọ Gachara Ahọ Iri Abụọ Na Abụọ

Sep 18, 2017 - 02:45
Jan 23, 2021 - 17:50
 0
Ndị Ụmụeri Emee Mmemee Iri Ji Ọhụụ Ka Ọ Gachara Ahọ Iri Abụọ Na Abụọ

Izunna Okafor, Awka, Nigeria

Nke bụ nnukwu oke ọñụ dara nnọọ n'obodo Ụmụeri nke dị n'okpuru ọchịchị 'Anambra East' na steeti Anambra, dịka ụmụafọ obodo ahụ, ndị dị iche iche selitere isi n'ọrụ gọọmenti , ndị enyị, ikwu na ibe nupụtara n'igwe iji wee mee mmemme iri ji ọhụụ nke obodo ahụ nke mbụ na mbụ ya ka ọ gachara ahọ iri abụọ na abụọ.

Nke bụ nnukwu oke ọñụ dara nnọọ n'obodo Ụmụeri nke dị n'okpuru ọchịchị 'Anambra East' na steeti Anambra, dịka ụmụafọ obodo ahụ, ndị dị iche iche selitere isi n'ọrụ gọọmenti , ndị enyị, ikwu na ibe nupụtara n'igwe iji wee mee mmemme iri ji ọhụụ nke obodo ahụ nke mbụ na mbụ ya ka ọ gachara ahọ iri abụọ na abụọ.

Ya bụ mmemme bụ nke weere ọnọdụ n'obi eze ọdịnala obodo ahụ, bụ Igwe Ben Emeka. Igwe Emeka na nwunye ya bụ lọọlọ Ocheze Chinwe, tinyere ndị ichie igwe nọrọ na mmemme ahụ wee gbaa egwu ịgbaeze na uhie, ebe a gbazịkwara ọtụtụ egwu ọdịnala dị iche iche.

Ya Igwe site na nnọnyere ndị ichie nọrọ n'oge ahụ wee mee omenala ịwa ji, nke ọ nọ na ya wee warịe otu mba ji ụzọ atọ, nke nọchitere anya mpaghara atọ mejupụtara obodo ahụ, bụ: mpaghara Ifite, mpaghara Ikenga na mpaghara Ezi ma nyefee ya n'aka ndị isi mpaghara atọ ahụ. A nọzịkwara n'oge ahụ wee kesaara ndị bịara ebe ji ahụrụ ahụ, nke ejiri ụkpaka, ụtazị na mmanụ nri na-akwọ mụrị mụrị wee hazie, tinyere mmanya ngwọ na nkwụ elu e jiri wee gbanyere ya ụgbọ nwamkpi.

Igwe Emeka kọwara mmemme iri ji ọhụụ dịka oge iji kele Chineke n'ihi owuwe ihe ubi, sị na ndị Ogidi bụ ndị e jiri ọrụ ugbo mara, ma sịkwazie na obi dị ya ụtọ etu ụmụafọ obodo ahụ siri nuputa n'igwè isonye na ya bụ mmemme pụrụ iche.

N'okwu nke ya, onyeisi ndị uwe ojii na steeti Anambra bụ maazị Garba Umar na onye 'Inspector General' ndị uwe ojii lagoro ezumike nka bụ maazị Paul Okafor kọwara na ezi nchekwa tọrọ atọ na nnukwu owuwe ihe ubi e nwere n'obodo ahụ bụ n'ihi ezi mbọ pụrụ iche ọchịchị gọvanọ Willie Obianọ gbagoro na ngalaba nchekwa, ngalaba ọrụ ugbo na ngalaba dị iche iche na steeti ahụ.

Na ntụnye nke ya, kọmishịọna na-ahu maka agụm akwụkwọ na steeti ahụ bụ ọkammụta Kate Omenugha kọwara mmemme iri ji ọhụụ dịka oge e ji e gosiopụta ihe dị iche e jiri mara ndị Igbo, ma keleziekwa Igwe Emeka maka mpụta ya na nsonyesi ike ya n'ihe dị iche iche a na-eme.

Ndị ọzọ kwuru okwu na mmemme ahụ gụnyere ọkamụta Ọgụgụa Ikpeze, bụ otu n'ime ndị ichie igwe; 'Chief' Chris Udealor, onye isi otu 'Committee of Friends Nteje na steeti Anambra, Igwe Ezenebo III nke Akwaeze, 'Chief Innocent Edozie' tinyere ndị ọzọ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.