Na Niger, Ndị Uweojii Anwụchiela Mmadụ 16 Maka Otu Nzuzo

Jul 14, 2021 - 20:30
 0
Na Niger, Ndị Uweojii Anwụchiela Mmadụ 16 Maka Otu Nzuzo

Izunna Okafor dere akụkọ a


Aka ndị uweojii na steeti Niger akpàrálá mmadụ iri na isii a na-enyo ènyò na ha bụ ndị otu nzuzo na mpaghara okpuru ọchịchị ime obodo Lapi nke steeti ahụ.

DSP Wasiu Abiodun bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ ya kwupụtara nke a n'ozi ọ kụpụụrụ ndị ntaakụkọ banyere njide ahụ e jidere ndị ahụ, ma bụrụkwa nke o sitere na ya wee mee ka a mara na ndị ahụ bụ ndị òtù nzunzo 'Black Axe'.

O kwuru na ọ bụ n'ụlọ ụmụakwụkwọ  Gwaranyo ka e jidere ndị ahụ ebe ha na-eme emume 7/7 ha, bụ nke ha na-eme kwà ahọ ọbụla.  

Ọ kpọpụtasịrị aha ndị ahụ dịka Joseph Biyama (gbara ahọ iri abụọ na abụọ), Adewale Sunday (gbara ahọ iri abụọ na asatọ), Ahmed Ahmed (gbara ahọ iri abụọ na atọ), Victor Dada (gbara ahọ iri abụọ na atọ), Kazeem Yahaya (gbara ahọ iri abụọ na isii), Emmanuel Ogbadu (gbara ahọ iri abụọ na anọ), na Shittu Babatunde (gbara ahọ iri abụọ na atọ), bụ ndị bụcha ụmụakwụkwọ mahadum.

O kwuru na ndị ọzọ gụnyèrè Mikailu Yahaya (gbara ahọ iri abụọ na otu), Abdullahi Mohammed (gbara ahọ iri abụọ na isii), Shekwolo Lamech (gbara ahọ iri abụọ na atọ), Damilola Idris (gbara ahọ iri abụọ), Taiwo Hussaini (gbara ahọ iri abụọ na ise), Haruna Lanre (gbara ahọ iri abụọ na anọ), Saheed Saheed (gbara ahọ iri abụọ na abụọ) bụkwa dị gụchagoro akwụkwọ. Ndị ọzọ gụnyere John Simeon (gbara ahọ iri abụọ na atọ), na Agbonika Ojoma gbara ahọ iri abụọ na anọ), bụ ndị abụghị ụmụakwụkwọ, kama ha sitekwara na mpaghara Lapi ahụ.

O kwuru na ndị otu nzuzo ahụ, ndị ọtụtụ n'ime ha bụ ụmụakwụkwọ mahadum bụ n'ime ụlọ otu nwata akwụkwọ ibe ha bụkwa onye otu ha ka ha nọ were na-eme mmemme ahụ ma na-anabatakwa ndị ọhụrụ batara n'otu nzuzo ahụ ụbọchị ahụ, tupu e wee nwụchikọọ ha.

Ya bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii gara n'ihu kwuo na ihe dị iche iche e nwetere n'aka ndị ahụ gụnyèrè anyike, uwe na okpu ndị ọrụ agha ala Nigeria, otu itè ahịhịa kpọrọ nkụ a na-enyo ènyò na ọ bụ igbo nn'ime ya, ihe e ji agbanye mmiri ruru lita iri na ise a gbajuru ihe a na-enyo enyo na ọ bụ mmanya ike na ọgwụ ike a gwakọrịtara agwakọrịta, karama abụọ mmanya castello na-aba n'anya, na MP3 e ji akpọ egwu, tinyere ụfọdụ ihe ndị ọzọ.

Dịka ọ na-adụ ndị nne na nna ọdụ ka ha kpachapụ anya n'ụdị ndụ ụmụ ha na-ebi ma n'ụlọ ma n'ụlọakwụkwọ, ọ gakwazịrị n'ihu kwuo na a ka na-eme nnyocha banyere okwu ahụ, nke mgbe e mechaara ya, a kpụpụ ha ụlọikpe, ebe a ga-eji usoro iwu wee gwọọ ha ji mmanụ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484