Na Niger, E Jidela Mmadụ Ise Maka Izu Ohi Akụrụngwa Ọkụ Latiriiki

Nov 22, 2021 - 20:34
 0
Na Niger, E Jidela Mmadụ Ise Maka Izu Ohi Akụrụngwa Ọkụ Latiriiki
: :
playing

Izunna Okafor dere akụkọ a

Ndị uweojii na steeti Niger akpụgharịala mmadụ ise a na-enyo ènyò na ha bụ ndị ohi ma bụrụkwa ndị zuru ohi n'obì ọkụ latiriiki dị na mpaghara Lapai-Gwari nke Minna bụ isi obodo steeti ahụ.

Ọ bụ onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhaneze na ndị uweojii na steeti ahụ, bụ DSP Wasiu Abiodun kwupụtara nke a site n'ozi ọ kụpụụrụ ndị nta akụkọ banyere nke ahụ na nsonso a, ma bụrụkwa ozi o sitere na ya wee kọwaa na ọ bụ ndị uweojii nọ na mpaghara Chanchaga nwụchikọrọ ndị ahụ

Ọ kpọpụtasịrị aha ndị ahụ dịka Hussaini Adamu (gbara ahọ iri abụọ na atọ), Mustapha Umar (gbara ahọ iri na asaa), Mande Magaji (gbara ahọ iri na asaa), Suleiman Zubairu (gbara ahọ iri na isii), na Salisu Usman (gbara ahọ iri abụọ 25); ma kọwakwa na ha niile bụcha ụmụafọ obodo Kasuwan-Gwari dị na Minna.

O kwuru na ọ bụ na mpaghara Lapai-Gwari ka a nwụchikọrọ ndị ahụ site n'aka ndị uweojii nọ n'ọrụ ngagharị na gburugburu ebe ahụ, ma kwukwa na ndị ahụ gbara ìzù n'onwe ha, tọsàá ma zukọsịa ihe bara uru n'ime obi ọkụ latiriiki abụọ ma buru ihe ndị ahụ gbafuo

Ọ kọwara na oge a na-agba ha ajụjụọnụ, na mmadụ anọ n'ime ndị ohi ahụ e jidere n'ebe ahụ kpọnkwem jiri ọnụ ha wee sàá asịsà na ha mere ihe ahụ n'eziokwu, wee duruzie ndị uweojii wee gaa gosi ha Maazị Salisu Usman na mpaghara Kasuwan-Gwari, bụ onye ha resiri eriri ọkụ na ihe ndị ọzọ ahụ ha zutere.

Ihe dị icheiche e nwekọtara n'aka ndị ahụ gụnyèrè akụrụngwa insuletọ atọ na okpokoro obi ọkụ latiriiki ha zukọsịarala ihe dị n'ime ya.

Ka ọ dị ugbua, Kọmishọna ndị uweojii na steeti ahụ, bụ CP Monday Bala Kuryas kelere ndị ọrụ ya maka ezi ọrụ ahụ ha rụrụ ịnụwchikọ ndị ahụ. O kwuru na a ka na-eme nnyocha banyere ndị ahụ na  ihe ha mere, ma kwe nkwa na a ga-akpụpụ ha ụlọikpe ngwangwa e mechara nk ahụ. 

Ọ gwakwazịrị ndị ohi, ndị arụrụala na ndị omekoome ndị ọzọ nọgasị na steeti ahụ ka ha kwakọrọ ngwongwo ha rie mbọmbọ ọsọ, n'ihi na steeti ahụ agaghị abàta ha.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484