Ndị Uweojii Anambra Ejidela Onye Pụnaara Mmadụ Àkpà Ego Ya n'Awka

Jun 10, 2020 - 16:40
Jan 24, 2021 - 16:41
 0
Ndị Uweojii Anambra Ejidela Onye Pụnaara Mmadụ Àkpà Ego Ya n'Awka

By Izunna Okafor, Awka, Nigeria

Ụbọchị niile nwere ike bụrụ nke onye ohi n'ezie, mana otu ụbọchị ga-abụrịrị nke onye nwe ụlọ. Ka ọ dị taa, aka ndị uweojii na steeti Anambra ejidela otu nwata nwoke a na-enyo enyò na ọ bụ onye ohi, oge ọ pụnaara mmadụ àkpà ego ya n'ike ma chọọ ka o rie oso.

Nwata nwoke ahụ bụ onye a nwụchikọrọ na mpaghara njikọ ụzọ Regina Caeli dị n'Awka, n'okporo ụzọ awara-awara ahụ siri Enugu gaa Ọnịtsha, ma bụrụkwa onye ndị mmadụ chọdịrịrị itigbu etigbu oge e jidere ya tupu ndị uwe ojii wee zọpụta ma buru ya pụọ.

Dịka akụkọ siri kọọ, ya bụ nwokorobịa, bụ Maazị Chukwuemeka Afor (gbárá ahọ iri abụọ na ise ma bụrụkwa onye obodo Akpoga dị n'okpuru ọchịchị ime obodo Nkanu South nke steet Enugu) jìrì égbè wee pụnara otu nwoke bụ Maazị Ebuka Ukeakpu àkpà ya nnukwu ego dị n'ime ya n'ihu ọba ego 'Fidelity Bank' dị na mpaghara ebe ahụ.

Ma mgbe ọ chọpụtara na ndị mmadụ na-achọ ịwakpò ya, ọ malitere ịgbalisi egbe elu iji chụsasịa ha, wee chọzie ka o rie mbọmbọ ọsọ, tupu e wee nwụchikọọ ya ma napụta ya égbè 'pump action' ahụ o ji, ya na àkpa ego ahụ o zuru. Ndị mmadụ nọ ebe ahụ gbakọzịkwara wee tụọ ya ụtụ aka n'ahụ, ma kwechiri na ndị uwe ojii agaghị akpụ ya wee pụ ruo mgbe ha mèchàrà ya ihe dị ha n'obi. 

Otu ọ dị, ndị uwe ojii ahụ mere ngwangwa ozigbo tinye ya n'ụgbọala, ma buru ya waa, gaba n'ụlọọrụ ha.

Akụkọ kọkwara na mpempe mgbọ egbe ahụ nwokorobịa ahụ gbara oge ahụ metụrụ mmadụ anọ nọ n'ebe ahụ, n'agbanyeghị na o merụghị ha ahụ nke ukwu maọbụ metụta ha na njọ.

Dịka ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ, bụ Maazị Haruna Mohammed siri kọwaa, a kpọzịrị mmadụ anọ ahụ wee gaa ụlọọgwụ maka inye ha ọgwụgwọ, tinyekwuoro nwata nwoke ahụ, n'ihi na ndị mmadụ kụrụ ya isi aba okpu ụbọchị ahụ. 

Ọ sịkwazị na nnyocha ka na-aga n'ihu bànyere okwu ahụ ugbua, nke, mgbe e mechara ya, a kpụpụ nwa amadi ahụ ụlọ ikpe.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.