Ọtụtụ Ndị Mmadụ Ezigarala Soludo Ozi Ekele, Ka Ọ Natachara Asambodo

Nov 22, 2021 - 20:38
 0
Ọtụtụ Ndị Mmadụ Ezigarala Soludo Ozi Ekele, Ka Ọ Natachara Asambodo
: :
playing

Izunna Okafor dere akụkọ a

Ka ọ gachaara abalịa olenaole nwa amadi ahụ a họpụtara ọhụrụ ịbụ gọvanọ steeti Anambra, bụ Ọkammụta Charles Soludo, nà osote ya, bụ Dọkịta Onyekachukwu Ibezim nwètèchara asambodo ha site n'aka ụlọọrụ ahụ na-ahụ maka nhọpụta ọchịchị, bụ ụlọọrụ 'Independent National Electoral Commission (INEC)'; ọtụtụ ndị mmadụ ka na-ezigara ya ozi ekele banyere ya bụ mmeri dara ụda o nwetere na nhọpụta ọchịchị ahụ.

Ọ dị ncheta na n'ịgbaso ihe dị na mpaghara iri asaa na ise nke akwụkwọ iwu na-achị nhọpụta ọchịchị n'ala Nigeria, bụ 'section 75 of the Electoral Act 2010 (as amended)', ụlọọrụ INEC nọrọ ụbọchị Fraịdee izuụka gara aga wee nye Ọkammụta Soludo na osote ya asambodo ahụ n'isi ụlọọrụ ahụ dị n'Awka.

N'okwu ya na mmemme inye asambodo ahụ, onye ji ọkwa 'Supervising National Commissioner' maka nhọpụta ọkwa gọvanọ ahụ e mere na steeti Anambra n'ahọ a, bụ Ọkaiwu Festus Okoye kelere ndị Anambra maka nkwụdosiike ha n'ọchịchị onye kwuo uche ya, ya na etu ha siri wee sonyesie ike na mmemme nhọpụta ọchịchị ahụ ma hụkwa na e mere ya n'ụzọ udo.

N'okwu ya banyere nhọpụta ahụ, onyeisi ụlọọrụ INEC na steeti Anambra, bụ Dọkịta Nkwachukwu Orji kọwara nhọpụta ahụ dịka nke gara siriri-werere, n'ụzọ udo na n'ụzọ ghe anya oghe, ma kelekwazie Ndị Anambra na ndị otu dị icheiche nyere aka ịhụ na ya bụ nhọpụta ọchịchị gara nke ọma ma gakwa n'ụzọ udo, n'agbànyèghị ihe ọdachi na ihe egwu niile dapụtara na mbido nà oge a na-akwado ya bụ ntụliaka.

N'okwu ya oge ọ na-anabata mmeri ahụ, Ọkammụta Soludo, onye ọñụ jupụtara obi, kọwara na ọ bụ ọchịchọobi Chineke na ọ ga-enwete ya bụ mmeri, maka na ọ bụ Chukwu na-eme eze, ọbụladị dịka o kelekwara ụmụafọ steeti Anambra maka ezi ntụkwasịobi ha nwere na ya na n'otu ndọrọndọrọ ọchịchị APGA, wee nye ya nkwado dị ịtụnanya. Dịka ọ na-ekwu na ọ bụ ahọ iri na abụọ gara aga ka ndị Anambra malitere chọba ya ka o jeere ha ozi, bụzị nke Chineke mezịrị ka ọ pụta ihe ugbua, o kwekwazịrị nkwà na ọ gaghị agharịpụ ha, site n'inye aka Chineke na ezi nkwàdo ha.

O kelere aka na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Willie Obianọ, ndị ndu na ndịisi otu ndọrọndọrọ APGA, ụlọọrụ INEC, ndị Anambra na na ọtụtụ ndị ọzọ nyere aka ime ka nrọ ahụ pụta ìhè, ma kwezie nkwà na ọ gaghị agharịpụ Ndị Anambra.

Ka nke ahụ gachara, ọtụtụ ndị mmadụ na ndị otu dị icheiche gara n'ihu na-ezigara ya bụ nwa amadi, bụ Ọkammụta Soludo na onye otu ya ozi ekele maka mmeri ahụ dara ụda ha nwetara ma na-ekwekwa ha nkwà nkwado.

Ụfọdụ ndị na otu zigaara ya ozi ekele na nsonso a gụnyèrè ndị òtù ahụ jikọtara ndị eze ọdịnala na mpaghara Agụata ochie, ndị obodo Ụmụọba Anam, otu jikọtara ndị eze ọdịnala n'ime obodo dị icheiche dị n'okpuruọchịchị 'Awka South'.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484