N'Anambra: Pastọ Egbuola Nwadibịa, Sị Na Ọ Bụ Chineke Gwara Ya Gbuo

Sep 9, 2020 - 21:34
Jan 28, 2021 - 21:35
 0
N'Anambra: Pastọ Egbuola Nwadibịa, Sị Na Ọ Bụ Chineke Gwara Ya Gbuo

Izunna Okafor

Igbo sị na ọ na-abụ onye a gwara agwa mana ọ nụghị anụ, o mee emee, ọ hụ ahụ.

Ka ọ dị taa, ndị ọrụ uweojii n'ime steeti Anambra anwụchiela onye pastọ (bụ onye ọrụ ụka) maka iji mmà gbuo otu nwadibịa aha ya bụ bụ Maazị Oliver Chukwudi Ugwu (gbara ahọ iri isii) ma biri na mpaghara Umusiome dị na Nkpor n'okpuru ọchịchị ime obodo 'Idemili North'.

Dịka ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ, bụ SP Haruna Mohammed siri kọọ, nwa amadi ahụ e gburu egbu bụ onye obodo Abor dị n'okpuru ọchịchị ime obodo Udi nke steeti Enugu; ebe pastọ ahụ gburu ya egbu bụ Maazị Uchenna Chukwuma (gbárá ahọ iri abụọ na otu) ma bụrụkwa onye obodo Amagunze dị n'okpuru ọchịchị ime obodo 'Nkanu East' nke steeti Enugu. Ha abụọ bikwà na mpaghara Umusiome dị na Nkpor, n'okpuru ọchịchị ime obodo 'Idemili North' nke steeti Anambra.

Oge a na-agba ya ajụjụ ọnụ banyere ihe mere o jiri gbuo nwadibịa ahụ, ya bụ nwoke kwuru ọ bụ pastọ, ma kọwaa na ọ bụ Chineke zigara ya ka o gbuo nwoke ahụ. O kwuru na nwadibịa ahụ anaghị ekwe ya ñụrụ mmiri tọgbọ iko, nke na ọ na-enyekwuzị ya nsogbu n'ime mmụọ, ma na-egbochikwa ya ịga n'ihu n'ihe nke mmụọ maọbụkwanụ ịkpata ego.

Ndị uweojii gakwazịrị n'ebe ahụ ya bụ ihe nọrọ mee ụbọchị ahụ, ma jiri anya ha hụ ka ọnọdụ siri gbata kwụrụ. E bukwara nwadibịa ahụ ya na ọbara nille juru ya n'ahụ wee gaa ụlọọgwụ Iyi Enu dị n'Ogidi, bụ ebe dọkịta nọrọ wee lelechaa ya ahụ, wee gwa ha na ụkwa a na-apị, na mkpụrụ adịghị ya; nke pụtara na ya bụ nwoke alaala mmụọ. E mechaziere dọnye ozu nwa amadi ahụ n'ụlọ nchekwa ozu dị n'ụlọọgwụ ahụ.

Ndị uweojii ahụ napụtakwara pastọ ahụ mmà ahụ o jiri gbuo ya bụ nwoke, ma werezie okwu ahụ nyefèé n'aka ngalaba 'State Criminal investigation Department' dị n'Awka maka ime nnyocha miri èmì, nke, mgbe e mechaara ya, a kpụpụ ya ụlọikpe, ebe a ga-anọ kpee ya ikpe maka ihe o mere.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.