Gọọmenti Anambra Ekesàárala Ndị Ọkụ Ọchanja Metụtara Akwụkwọ Ndọrọ Ego

Nov 21, 2019 - 02:26
Jan 24, 2021 - 05:54
 0
Gọọmenti Anambra Ekesàárala Ndị Ọkụ Ọchanja Metụtara Akwụkwọ Ndọrọ Ego

Izunna Okafor, Awka

Ọchịchị steeti Anambra ekesàala akwụkwọ ndọrọ ego karịrị otu narị nde naịra nyegara ndị ahụ ajọ ọkụ ọgbụgba ahụ gbara n'ahịa Ọchanja Ọnịtsha na nso-nso a metụtara, iji tie ha aka n'obi ma kwàdo ha. Mmemme nkesà ego ahụ bụ nke weere ọnọdụ n'ebe obibi Gọvanọ dị n'Amawbịa, ma bụrụkwa nke dọtara ọtụtụ ndị dị iche iche selitere isi n'ọchịchị steeti ahụ, nke gụnyere onyeisi oche otu ndọrọ-ndọrọ APGA, bụ Maazị Victor Oye; odeakwụkwọ izugbe steeti ahụ, bụ Maazị Solo Chukwulobelụ; Kọmishọna na-ahụ maka azụmahịa, bụ Maazị Uchenna Okafor, tinyere ọtụtụ ndị ọzọ.

', '

N'okwu ya oge ọ na-enye ndị ahụ ya bụ akwụkwọ ndọrọ ego, aka na-achị achị bụ Gọvanọ Willie Obianọ mere ka a mara na ọ bụ gọọmenti steeti ahụ wepụtara ya bụ ego ka e kesàára ndị ahụ, na-agbanyeghị ụka onye na-aga, otu ndọrọ-ndọrọ onye nọ na ya, maọbụ àgbụrụ onye sì.

O kwuru na ebumnobi nke ahụ bụ iji nyere ndị ahụ aka ịmalitekwa ndụ ha ọzọ, dịka ọkụ gbarikọchara ebe ha na-azụ ahịa, ngwọahịa ha nakwa ihe ha nwère n'ọdụ ahịa ahụ. O kwekwazịrị nkwà na gọọmenti na-agbasi mbọ ike ịhụ na ụdị ọdachi dị otu ahụ adapụtaghị ọzọ na ya bụ ahịa maọbụ na mpaghara ebe ọbụla na steeti ahụ, site n'ọtụtụ atụmatụ dị iche iche e tinyegoro n'ọrụ ugbua banyere nke ahụ.

Ọ dị ncheta na ka ọnwa Ọktoba dị na mkpụrụ ụbọchị iri na isi, nnukwu ajọ ọkụ ọgbụgba dabìdòrò ahịa Ọchanja dị n'Ọnịtsha wee gbaa ya bụ ahịa pịataa, merụọ ọtụtụ ndị mmadụ ahụ, ma wètakwa ọnwụ mmadụ isii, nke gụnyere otu nwaanyị na nwa ya. Ndị ya bụ ajọ ọnọdụ metụrara karịrị narị asaa n'ọnụ ọgụgụ, ebe ọdụ ahịa o metụtara dị otu narị na iri asaa na isii.

Ndị ga-eri ndị ahụ nwụrụ anwụ ékpé ka e nyègasịrị otu nde naịra, ma nye mmadụ abụọ gbajiri ụkwụ narị puku naịra ise n'otu n'otu, kwụkwazie ụgwọ e jiri nye ha ọgwụgwọ n'ụlọ ọgwụ.

N'akụkọ dịkwa ka ibè ya, Gọvanọ Obianọ gàkwàzịrị akwamozu nwaanyị ahụ na nwa ya ọkụ ahụ gbàgbùrù otu ụbọchị ahụ, bụ ndị a kààrà ụka akwamozu n'ụlọụka 'Joseph's Catholic Church' dị n'Awka Etiti'
Ya bụ nwaanyị, bụ Oriakụ Ifeọma Obi, ka e kwùrù na ọ gbàrà ahọ iri atọ na anọ, ebe nwa ya nwoke ahụ dị naanị ọnwa asatọ.

N'okwuchukwu ya na ya bụ mmemme, Ọzilarị Bishọọpụ nke ụka Katọliiki na Dayọsiisi Ọnịtsha, bụ Bishọọpụ Dennis Isizọ chetaara ndị mmadụ na onye ọbụla bụ ọbịa n'ụwa, ma dụkwazie ha ka ha were nkenke ogè ha nwèrè n'ụwa wee jeere Chineke na mmadụ ozi ma chọọkwa alaeze eligwe, n'ihi na ụwa bụ naanị nwa mgbe ntà ka ọ na-adị. O kpekwazịrị ka mkpụrụ obi ya bụ nwaanyị na nwa ya nwoke zuo ike na ndokwa.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.