N'Awka, Dayọsiisi Ụka Angịlịkan Echiela Ndị Ụkọchukwu Ọhụrụ

N'Awka, Dayọsiisi Ụka Angịlịkan Echiela Ndị Ụkọchukwu Ọhụrụ

Dec 17, 2020 - 00:39
Jan 19, 2021 - 00:39
 0
N'Awka, Dayọsiisi Ụka Angịlịkan Echiela Ndị Ụkọchukwu Ọhụrụ

By Izunna Okafor

Ọ bụ nnọọ oge ọñụ na oge inye ike maka ije oziọma, dịka Bishọọpụ ụka Angịlịkan na Dayọsiisi Awka, onye bụkwa Ashbishọọpụ nke mpaghara Niger, bụ Ashbishọọpụ Alexander Ibezim chiri mmadụ iri na ise ụkọchukwu ma nyekwa ha ikike ije ozi dịka ndị nchụaja Chineke.

Mmemme ichi ụkọchukwu ahụ bụ nke e mere n'ofufe nro pụrụ iche weere ọnọdụ n'ụlọụka St. Faith dị n'Ọka (Awka) bụ isi obodo steeti Anambra, ma bụrụkwa nke dị ọrụ ụka nakwa ọtụtụ ndị ọzọ sitere ebe dị iche iche sonyere na ya.

N'okwuchukwu ya n'ofufe nro ahụ, Ashịdikin nke Mbaukwu Ashịdikinri, bụ Venerebụlụ David Chukwudi kọwara na a na-echi ndị ụkọchukwu ma na-ezipụkwa ha n'ime ụwa iji kụtara Kraịstị mkpụrụ obi, mee ka ibu dịrị ndị mmadụ mfe, ma gwakwa ụwa eziokwu, ọkachasị dịka o siri metụta alaeze eligwe.

Ọ kọwara na ichi ma zipụ ndị ụkọchukwu abụghị ka ha ga were oziọma wee chụba ego, ọbụladị dịka ọ kpọkuru ndị ụka ka ha na-akwàdo ndị ọrụ ụka ma na-ekpekwara ha ekpere, iji rụzupụta ebumnobi ọkpụkpọ oku Chineke kpọrọ ha, maka na ya bụ ọrụ abụghịkwanụ ihe dị mfe.

N'okwu ya nye ndị ahụ e chiri ụkọchukwu, Bishọọpụ ụka Angịlịkan na Dayọsiisi Nsukka, bụ Bishọọpụ Aloysius Eze Agboh gwara ha ka ha were egwu Chineke wee jee ozi, bụrụ ndị na-eweta udo na ịhụnanya, mee ka mkpụrụ obi na-efu èfu laghachikwute Kraịstị, ma zisakwara ụwa oziọma ahụ a kụghị mmiri.

N'okwu ya oge ọ na-echi ndị ụkọchukwu ọhụrụ ahụ, Ashbishọọpụ Alexander Ibezim chètààrà ha na ọkpụkpọ oku Chineke kpọrọ ha bụ ka ha jeere Ya ozi ma rụọrọ ya ọrụ dịka ndị ọzụzụ atụrụ, ma gwa ha ka ha si n'ọnụ ha na n'omume ha zisàá oziọma Kraistị.

Ọ gwakwara ha ka ha were ịhụnanya wee jeere Chineke ozi, ma bụrụkwa ndị Chineke ga-agbara ama ezi ọrụ ha rụrụ dịka ndị ozi ya n'ụbọchị ngụkọ, maka na mmadụ ọbụla ga-azarịrị ajụjụ banyere etu o siri gaa ozi ya nakwa etu o siri chịkwaa ìgwè atụrụ Chineke hanyere n'aka ya.

N'okwu ya n'aha ndị ọzọ, otu onye n'ime ndị ahụ e chiri ụkọchukwu ọhụrụ, bụ Ụkọchukwu Linus Okeke kèlèrè Chineke maka mbulin'ọkwa ahụ, kelekwa Bishọọpụ Ibezim maka ịhụta ha dịka ndị tozùrù oke, ma rịọkwa amara, nchekwa na enyemaka Chineke, na nkwàdo na ekpere ụmụ mmadụ, iji nyere ha aka ịga ozi ha nke ọma n'ikwesi ntụkwasịobi, bụkwa nke o kwere nkwa na ha ga-eme.

Mmadụ ise bụbụ Ọdịnandị ka e buliri n'ọkwa Dikin ụbọchị ahụ, ebe mmadụ iri na ise bụbụ Dikin bụ ndị e chiri Ụkọchukwu ma bụrụkwa ndị e duru n'iyi ọrụ site n'aka Chanselọ dayọsiisi ahụ, bụ Ọkaikpe O.J. Okeke.

Onye ndu òtù ụmụnwaanyị na ụmụagbọghọ na dayọsiisi ahụ nakwa na mpaghara Niger, bụ Oriakụ Chioma Ibezim na ọtụtụ ndị ọzọ sonyèrè na mmemme ahụ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.