Òtù Ndị Ọrụ Injinia Agaala Njem Nleta n'Ogige Ụlọ Ezumezu Anambra

Sep 5, 2021 - 21:07
 0
Òtù Ndị Ọrụ Injinia Agaala Njem Nleta n'Ogige Ụlọ Ezumezu Anambra

Izunna Okafor dere akụkọ a


Òtù jikọtara ndị ọrụ Injinia n'ala Nigeria a maara dịka 'Nigeria Society of Engineers (NSE)', ngalaba nke Awka agaala njem nleta n'ebe ahụ a na-arụ ụlọ ezumezu mba ụwa n'Awka bụ isi obodo steeti Anambra, iji hụ ka ọnọdụ ọrụ siri gbata kwụrụ n'ebe ahụ.

N'okwu ya oge ọ na-edugharị ha n'ebe ahụ, Kọmishọna na-ahụ maka ọrụ na steeti ahụ, bụ Maazị Injinia Marcel Ifejiofor mèrè ka a mara na ọrụ ahụ nọzị n'àgbà nke ikpeazụ ya ugbua, ma nyekwa nkọwa banyere etu ya bụ ọrụ siri gbata kwụrụ, ogoogo na akụrụngwa e ji arụ ya.

Dịka ọrụ siri gbata kwụrụ n'ebe ahụ ugbua, a rụchaala elu ụlọ ahụ maa mabụrụ n'ala ya, ebe a hụkwara ka ọrụ na-agawanye n'ihu n'ogige ahụ, bụ ebe ndị ọrụ jupụtakwara.

Kọmishọna Ifejiofor, onye kwuru na ụlọ ezumezu ahụ so n'ọrụ ncheta ga-adị ọkpụtọrọkpụ Gọvanọ Obianọ rụụrụ ndị Anambra, mekwazịrị ka a mara na a na-atụ anya ịrụchapụ ya bụ ogige n'ime ọnwa abụọ.

N'okwu nke ya, onyeisioche ndị òtù ahụ n'Awka, bụ Injinia Dọkịta Victor Okonkwo gosipụtara afọ ojuju ya na ndị òtù ya banyere etu ọrụ si agawanye n'ihu n'ebe ahụ, ogoogo e ji arụ ya, na ogoogo ya bụ ọrụ nọzị na ya ugbua, ma kwuo na Kọntraktọ ji ya bụ ọrụ ngo na-agbaso ụkpụrụ na usoro kwesiri ekwesi were arụ ya.

Na ntụnye nke ya, onyeisioche òtù jikọtara ụmụnwaanyị bụ Injinia n'ala Nigeria, bụ òtù a maara dịka 'Association of Professional Women Engineers Nigeria, APWEN' bụ Injinia Nneka Ezeani kèlèkwàrà aka na-achị steeti Anambra bụ Gọvanọ Willie Obianọ maka agadaga ọrụ ahụ, ma kelekwa ụlọọrụ ngo dị icheiche so arụ ya bụ ọrụ, maka ogoogo ha ji arụ ya.

Ndị ọzọ kwuru okwu na mmemme ahụ gụnyere osote onyeisioche òtù 'Association of Professional Women Engineers Nigeria, APWEN', bụ Injinia Fimbarr Ajegwu; osote onyeisi òtù ahụ n'oge mbụ, bụ Injinia Oluchi Okoli, tinyere ọtụtụ ndị ọzọ, bụkwa ndị toro Gọvanọ Obianọ, maka ịhụta mkpa ọ dị na Anambra nwere ụdị agadaga ụlọ ezumezu dị etu ahụ, bụkwa nke ga-eme ya steeti mbụ nwere ụdị ụlọ ezumezu mba ụwa ahụ na mpaghara ndịda ọwụwa anyanwụ ala Nigeria.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484