Ijummiri Achụpụla Onyeisi Obodo Na Ụfọdụ Ndị Obodo Ya n'Ụlọ

Oct 21, 2021 - 20:57
 0
Ijummiri Achụpụla Onyeisi Obodo Na Ụfọdụ Ndị Obodo Ya n'Ụlọ


Izunna Okafor dere akụkọ a

Ụfọdụ ndị obodo Ikot Obio Atai dị n'okpuruọchịchị Itu nke steeti Akwa Ibom ahapụla ụlọ ha ma rie mbọmbọ ọsọ maka ndụ ha, ka ijummiri wakpòrò ụlọ ha dị icheiche ma tochie ebe niile.

Ọtụtụ ndị obodo ahụ, ndị enweghị ego ịkwagharị n'ụlọ ọzọ, bụkwàzị ndị a hụrụ ka ha na-eji ihe ekupusi mmiri n'ụlọ ha oge ọbụla, ọkachasị oge mmiri zoro.

Akụkọ kọrọ na ya bụ ijummiri achụpụla onyeisi obodo Obong Mkpong n'ụlọ ya, ya na ọtụtụ ụmụafọ obodo ahụ ruru narị ise n'ọnụọgụgụ n'ihi na mmiri etokpòla ụlọ karịrị otu narị na iri abụọ n'ọnụọgụgụ na mpaghara ebe ahụ.

Otu onye bi na mpaghara ma bụrụkwa otu onye n'ime ndị ijummiri ahụ wakpòrò ụlọ ha, bụ Maazị Ekpe Sunday, kwuru na mmiri na-etoju n'ime ụlọ ya oge ọbụla mmiri zoro. O kwukwara na ọ kà bi n'ebe ahụ n'ihi na o nweghị ego iji rụọ maọbụ kwaje n'ụlọ ọzọ, nke mezịrị o ji ka biri n'ebe ahụ ma jiri ihe na-ekusi mmiri n'ime ụlọ ya oge ọbụla mmiri na-ezo.

N'okwu nke ya, otu onye ọzọ ajọ ọnọdụ ahụ metụtara, ma bụrụkwa onye na-ere garrị, bụ Mercy kwara arịrị na ijummiri ahụ metụtara ha n'ụdị dị ukwuu ma metụtakwa ahịa  ha n'ihi na ụmụakwụkwọ mahadum UNIUYO bigasị na mpaghara ahụ apụọla n'ihi ijummiri ahụ, nke mezịrị ka azụmahịa ha maa afọ n'ala, maka na ọ bụ ụmụakwụkwọ ahụ kacha agba ha aka ahịa na garrị ebe ahụ.

Onyeisi ọchịchị obodo ahụ, Maazị Mkpong kwuru na nsogbu ijummiri ahụ agafeela ihe obodo ahụ ga-egbònwu, ma mekwa ka a mara na ọ bụ kemgbe ahọ 1999 ka ha jiri wee debe akwụkwọ ma rịọba enyemaka gọọmenti banyere nsogbu ahụ, mana o nwebeghị ihe e mere kemgbe ahụ.

Ọ kpọkukwazịrị gọọmenti na aka na-achị steeti ahụ, bụ Gọvanọ  Emmanuel Udom, maka na nsogbu ahụ akarịala.

N'okwu ya banyere nke ahụ, onye na-anọchite anya ọgbọ nta nkwàdo Itu n'ụlọ omeiwu steeti ahụ, bụ Kufre Edidem kpọpụtasịkwara ọtụtụ mbọ dị icheiche ọ gbagoro dịka onye ọrụ gọọmenti iji weta nsogbu ahọ n'isi njedobe, bụkwa nke amịtaghị mkpụrụ ọbụla wee ruo taa. Ọ kpọkuzịrị gọọmentị na ụlọọrụ 'National Emergency Management Agency (NEMA)' ka ha mee ngwangwa gbata ọsọ enyemaka n'ebe ahụ ngwangwa.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484