Soludo Akasiela Ndị Be Ezeife Obi Maka Ọnwụ Oriakụ Ezeife

Apr 28, 2022 - 23:14
 0
Soludo Akasiela Ndị Be Ezeife Obi Maka Ọnwụ Oriakụ Ezeife

Izunna Okafor dere akụkọ a

Aka na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Chukwuma Soludo nọrọ na mmalite izuụka a wee gaa mgbaru n'ezinụlọ Gọvanọ nkịtị mbụ chịrị steeti Anambra, bụ Dọkịta Chukwuemeka Ezeife, maka ọnwụ nwunye ya bụ Oriakụ Njideka Christiana Ezeife lagoro mmụọ.

Ọ dị ncheta na Oriakụ Ezeife nwụrụ ná mba U.S.A. n'ahọ gara aga ka ọ rị̀àchàrà obere ahụ, ma bụrụ onye e mere mmemme akwamozu ya na nsonso a, bụ́ nke weere ọnọdụ na ngwùrù be di ya dị na Igbo-Ukwu, n'okpuruọchịchị ime obodo Agụata nke steeti Anambra. Ọ gbàkwàrà ahọ iri asatọ na otu tupu ọ laa mmụọ.

N'okwu ya na nsonso a oge ọ gara ikele ndị ezinụlọ ahụ, Gọvanọ Soludo kọwara ya bụ nwaanyị dịka nwaanyị obi ọma na ezi omume, bụ onye kwụdooro ma kwàdosie di ya ike, ọkachasị tupu, mgbe ọ malitere, nà mgbe ọ chịchara ọchịchị dịka Gọvanọ mbụ a họpụtara ahọpụta n'usoro ọchịchị onye kwuo uche ya n'ime steeti ahụ.

Ọ kasizịkwàrà Dọkịta Ezeife na ndị ezinụlọ ya obi banyere ya bụ nnukwu ọnwụ dị mwute, ma kpekwazie ka mkpụrụobi ya zuo ike na ndokwa.

N'okwu ya bnyere nke ahụ n'usoro nzikọrịtaozi, Gọvanọ Soludo sị: “Ọnwụ onye mmadụ hụrụ n'anya bụ nke na-ewute ma na-egbukwa mmụọ nke ukwuu, ọkachasị ọ bụrụ na gị na onye ahụ ebitèéla aka tupu ọnwụ ya.

“Ọnwụ nke agụ nwaanyị, bụ Oriakụ Christiana Njideka Ezeife, nwunye Ọchị Ọra nkịtị mbụ chịrị Steeti Anambra, bụ́ Dkt. Chukwuemeka Ezeife (Ọkwadike Igbo Ukwu) bụ̀ nnukwu ihe mwute na nnukwu ihe nkèwa ọmarịcha oge gara aga.

“Agara m leta ya bụ Ọchị Ọra taa iji kasie ya na ndị ezinulọ ha obi. Ngosipụta obi ekele ya cheteere m ndụmọdụ ahụ sitere n'akwụkwọ nsọ, nke sị na anyị ga na-enyerịrị Chineke ekele na otùtó n'ime ọnọdụ ọbụla na n'oge niile.

“Ka Chineke gaa n'ihu inye ndị be Ezeife nkasiobi na agbamume iji dìé ya bụ nnukwu ọnwụ, ọbụladị dịka anyị na-ekpekwa ka mkpụrụobi Mama gaa n'ihu izu ike udo n'ime Onyenweanyị.”

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484