A Tụọla Di na Nwunye Nga Maka Ịkwà Iko n'Okporụzọ

Nov 14, 2021 - 22:59
 0

Izunna Okafor dere akụkọ a


Dinanwunye ahụ a hụrụ n'Uganda na nsonso a ebe ha nọ n'okporoụzọ akwa iko abụrụla ndị a tụrụ nga ọnwa iri atọ maka akpramagwa ahụ
 
Ọ dị ncheta na mmadụ abụọ ahụ, nke gụnyere Hafashimana Paskari, bụ nwoke gbara ahọ iri abụọ na iteghete ma bụrụkwa onye na-anyà bodaboda n'ime obodo Migeshi nke mpaghara Rwaramba, na Muhawenimana Colodine Mukamulenzi, bụ nwaanyị gbara ahọ iri abụọ na anọ ma bụrụkwa onye Nyakinama dị na mpaghara Kisoro nke Uganda, bụ ndị a nwọchikọrọ n'izuụka gara aga ma kpụpụ ha ụlọikpe maka ime omume ahụ gbara ụka n'ọhà, nke ụlọikpe kpọrọ 'public nuisance' na bekee, bụ nke ha mere n'okporoụzọ awara-awara 'Kisoro-Bunagana Highway'.
 
Ọ bụ ụlọọrụ onye ji ọkwa 'Director of Public Prosecutions' hụrụ maka ịkpụpụ ndị ahụ ụlọikpe na ikpe ha ikpe maka ihe ahụ ha mere, bụkwazị ebe ọ nọrọ wee kọwaa na ọ bụ n'elekere ise nke uhuruchi ka a hụrụ ndị ahụ ka ha na-epotòri ma na-amazụrị onwe ha n'okporoụzọ ahụ.

Ọ bụzị ụbọchị Tuzdee ka a kpụpụrụ ha ụlọikpe, bụ ebe Muhendo Peter nọrọ dịka onye ji ikpe ahụ, Fred Gidudu wee nọkwa dịka onye nọ n'isi ikpe ahụ. Mmadụ abụọ ahụ e jidere kwetekwara na ha mere ihe ahụ n'eziokwu ma kwukwa na ikpe mara ha, e wee nye ha ntaramahụhụ ịga ụlọ mkpọrọ ọnwa iri atọ.

Onyoonyoo e nwetara na-akọwa na mmadụ abụọ ahụ gagidere n'ụzọ, wee nọchà n'akụkụ, sị ka ha wèchara otu ọnụ tupu foto wee sète ha ebe ha na-eme ya bụ ihe.
 

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484