Nwoke Agbaala Onwe Ya Ọkụ Ebe Ọ Chọrọ Ịgba Ọdụ Mmanụ Ụgbọala Ezeemo Ọkụ n'Umuchu

Dec 5, 2021 - 13:18
Dec 5, 2021 - 13:32
 0


Izunna Okafor dere akụkọ a

Igbo sị na 'ọbịara egbu m gbùó onwe ya' abụghị ajọ ọgwụ; maka na ọ na-adị mma onye iro kèkata àjà, ọ tụnye isi ya.

Ka ọ dị taa, otu nwoke nọrọ na nsonso a wee gbaa onwe ya ọkụ na ndụ mgbe ọ na-achọ ịgba ọdụ mmanụ ụgbọala Maazị Godwin Ezeemo ọkụ n'Umuchu, n'okpuruọchịchị ime obodo Agụata nke steeti Anambra. Ọ dị ncheta na Maazị Ezeemo bụ onye a ma ama n'igwù okwe ndọrọndọrọ, ma bụrụkwa otu onye n'ime ndị gosipụtara mmasị ha iso zọọ ọkwa Gọvanọ steeti Anambra.

Dịka akụkọ siri kọọ, ya bụ nwoke gara n'ọdụ mmanụ ụgbọala ahụ wee zụrụ mmanụ ụgbọala puku naịra ise. Ka o mechara nke ahụ, o buuru ya bụ mmanụ wee bàá n'ime ụlọọrụ dị n'ọdụ mmanụ ahụ, wee wụọ ya n'ebe e si arịgo ụlọelu ahụ, wụrụ ya wee bàkwa n'ime ụlọọrụ dị icheiche dị n'ebe ahụ.

Ka o mechara nke ahụ, ọ kpanyezịrị ọkụ n'ebe ahụ ozigbo ma jirizie ọsọ na-agbapụ ka ọ pụọ, chi ya wee bụọ ya ọnụ, maka na o chefuru na onye nyụchiri nsị ụzọ mgbe ọ na-eje eje, na ọ laba alaba na ọ ga-ezùte ijiji. Mgbe nwoke ahụ ji ọsọ agbapụ ka ọ waa, ụkwụ mmụọ kpọrọ ya, o wee dàá ádà. Ka ọ nọzị n'ala ebe ahụ, mmanụ ndị ahụ ọ gbasara n'ụzọ mgbe ọ na-eje eje ghọghààràr ọkụ ozigbo, ọkụ wee tokpò ya ka ijummiri ma gbaa ya tọọtọọ. 

Ndị mmadụ ndị nọgasị n'ime ụlọọrụ ahụ mgbe ya bụ ihe na-eme jizịrị ọsọ ndụ wee tikasịa ọnụụzọ na windo dịgasị ebe ahụ, ma si ebe ahụ mapụsịa, zọọ isi onwe ha, ma ụmụnwoke ma ụmụnwaanyị.

Mgbe a gbanyụchazịrị ya bụ ọkụ, nwoke ahụ n'onwe ya anọrọla n'ọnọdụ 'ọdị ndụ ọnwụ ka mma', maka na ọkụ agbakasịchaala ya ma n'ihu ma n'ihe o jiri bụrụ nwoke, nà n'akụkụ ahụ ya ndị ọzọ.

Ka a gbara ya ajụjụọnụ mgbe ahụ ọ na-ekuzị ọnwụ-ọnwụ, nwoke ahụ kọrọ ka ya na ihe siri jee, ma kpọpụtasịkwa aha ụfọdụ ndị mmadụ, ndị o kwuru na ọ bụ ha dunyere ya ọrụ ahụ ọ bịara ụbọchị ahụ. Ọ bụ etu ahụ ka nwaokorobịa a siri wee tụfuo ndụ ya ma laba obodo afụdobe.

E kwuru na nwoke ahụ bụ onye ezinụlọ Offor dị n'ime ógbè Ebele dị n'Achina dịkwa n'okpuruọchịchị Agụata ahụ. Ụfọdụ ndị ma ya na-ekwukwa na ya bụ nwoke na-añụ mkpụrụmmiri.

Kirie onyoonyoo a ka i jiri anya gị hụka ya bụ ihe siri mee.

Files

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484