Ụmụawụlụ Eriela Ji Ọhụrụ Ahọ 2021

Oct 5, 2021 - 22:10
Oct 5, 2021 - 22:13
 0
Ụmụawụlụ Eriela Ji Ọhụrụ Ahọ 2021

Izunna Okafor dere akụkọ a

A kọwaala n'ebe o doro anya na mmemme iri ji ọhụrụ n'ala Igbo abụghị ikpere arụsị, dịka ụfọdụ si eche.

Eze ọdịnala obodo Ụmụawụlụ dị n'okpuru ọchịchị ime obodo 'Awka South' nke steeti Anambra, bụ Igwe Joel Egwuonwu kwupụtara nke a na mmemme iri ji ọhụrụ obodo ahụ nke ahọ 2021.

Ya bụ mmemme dọtara ụmụafọ obodo ahụ sitere ebe dị icheiche wee bịa, ma bụrụkwa nke a nọrọ n'obi eze ọdịnala ahụ wee mee.

Igwe Egwuọnwụ, oge ọ na-awa ji kpọmkwem na mmemme ahụ, mere ka a mara na mmemme iri ji ọhụrụ bụ nnukwu mmemme n'ala Igbo, ma bụrụkwa mmemme e ji akwanyere ji ùgwù dịka eze ihe a kọrọ n'ugbo, dịka omenala Igbo siri dị.

O kwuru na ọ bụ nke adabàghị adaba chaachaa, bụ echiche ahụ ụfọdụ ndị mmadụ na-eche na ihe ụfọdụ na-ekwu oge ụfọdụ na iri ji ọhụrụ bụ ihe ikpere arụsị maọbụ ihe ọgọ mmụọ, ọbụladị dịka ọ dụrụ ndị na-eche ụdị echiche dị etu ahụ ka ha kwụsị ya, n'ihi na o nweghị ihe ọbụla jikọọrọ iri ji ọhụrụ na ikpere arụsị, maọbụ nwee ka ha abụọ si bụrụ otu ihe.

O kelere Chineke maka ichekwaba na idu ụmụafọ obodo ahụ n'ogologo oge niile nke ọrụ ugbo, ha wee kọọ, ma dịkwa ndụ wetekwa ihe ubi n'uju. O tòkwàrà Chukwu maka nchekwa Ya na ngọzị Ya n'isi obodo ahụ na ụmụafọ ya, ha wee na-apụ, na-abata, ma na-agawanye n'ihu ma na-emekwa nke ọma n'ihe dị icheiche ha na-eme.

Ka Igwe Egwuọnwụ mechara omenala ịwa ji ahụ, ya bụ mmemme kpògharazịrị ọkụ n'ozuzuoke, dịka a malitezịrị ịgba egwu na ime ihe ngosi ndị ọzọ dị icheiche site n'aka ndị òtù ụmụnwaanyị na òtù ndị ọzọ dị icheiche pụtara ìhè na mmemme ahụ. 

Mmemme ahụ, nke Igwe Egwuọnwụ, ndị ichie ya, na ndị eze ọdịnala ndị ọzọ bị́árá nọnyere ya jìrì egwu Ịgbà Eze wee bata na ya, bụkwa nke a nọrọ na ya wee tụọrọ eze ọdịnala mmamma site n'aka ndị otu dị icheiche.

A nọkwazịrị na mmemme ahụ tie mmanwụ, kpaa ma kpee ekpere maka ọdịmma obodo ahụ; rie erimeri dị icheiche, ọkachasị ji ọhụrụ a hụrụ ahụ, nke e jiri mmanụ akwụ ọhụrụ na ụtazị mara abụba wee hazie, tinyere mmanya ngwọ jụrụ oyi e jiri wee gbanyere ya ụgbọ nwamkpi; nke mezịrị ka mmemme ahụ zaa aha a kpọrọ ya n'ezie.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484