Ndị Onowu Anambra Ekesàárála Ndị Ụwa Na-Atụ n'Ọnụ Ihe Onyinye Ekeresimeesi

Dec 18, 2019 - 23:14
Jan 24, 2021 - 03:13
 0
Ndị Onowu Anambra Ekesàárála Ndị Ụwa Na-Atụ n'Ọnụ Ihe Onyinye Ekeresimeesi

Izunna Okafor, Awka

Igbo sị na omepùru nwa ogbenye na-emepùru chi ya; ma sịkwa na ọ bụ o jide o nye ka ọha mmụọ na ọha mmadụ na-ekwupùru. N'ịgbaso nke a, òtù ahụ jikọtara ndị onowu na steeti Anambra, bụ òtù a maara dịka 'Anambra State Council of Traditional Rulers' agbaarala ndị ụwa na-atụ n'ọnụ na steeti ahụ ekeresimeesi, site n'ikesà ọtụtụ ihe onyinye, nke gụnyere ego na akpa osikapa nyegara ha nà òtù ọrụ obi ebere ndị ọzọ dị iche iche sitere okpuru ọchịchị iri abụọ na otu nke steeti ahụ nàkwa mpụga ya.

N'okwu ya oge ya na ndị nta akụkọ na-akparịta ụka bànyere ihe mmemme ahụ, onyeisi ndị òtù ahụ ma bụrụkwa onowu obodo Neni, bụ Maazị Anthony Enukeme kọwàra ya bụ atụmatụ dịka ịgbasò ọchịchọ obi Chineke na irube isi nye ihe akwụkwọ nsọ kwùrù, ma sị na ha na-eme nke ahụ iji hụ na ndị ahụ ụwa na-atụ n'ọnụ nwere ihe ha ga-eji gbaa ekeresimeesi ha nke ọma ma gbaakwa ya nyàfụ nyafụ.

Maazị Enukeme, bụkwa onyeisi ụlọ ọrụ na-emepụta mmanụ ụgbọala Tonimas jìkwàzịrị òhere ahụ kpọkuo ndị aka ji akụ nakwa ndị òtu dị iche iche ka ha chèta ndị ụwa na-atụ n'ọnụ, ọ kachasị n'oge mmemme ekeresimeesi a, ọbụnadị dịka ọ dụzịkwara ndị nnọchi anya otu dị iche iche ketara òkè n'ihe onyinye ahụ n'aha òtu ha, ka ha gbaa mbọ hụ na ha wèlàrùrù ihe ahụ ụlọ ma mekwa ka o ruo ndị e mebèère ya aka.

Na mbụ n'okwu ya, onyeisi òtù ọrụ hụrụ maka ya bụ ọrụ obi ebere ma bụrụkwa onowu obodo Uke, bụ Maazị P.I.C. Agụbụisi kwàrà arịrị na n'ihi agadaga ọrụ ngo òtù ahụ ji n'aka ugbu a n'Awka, na ha enweghị ike ibutesi ọtụtụ ihe nkesà n'ahọ a dịka ha si eme n'ime ahọ ole na ole gara aga. Ma otu ọ dị, o gosịpụtàra ezi olileanya o nwèrè na ha ga-agbasàpụkwu aka n'ahọ na-abịa abịa ma debànyekwuo aha ọtụtụ òtù ndị ga na-erita uru n'rèrè ahụ dịka ha si eme ya kwa ahọ ọbụla, nke ha sitegòrò na ya wee debànye aha ndị sitere steeti dị iche iche ha na Anambra gbàrà agbataobi.

N'okwu nke ha n'otu n'otu, ụfọdụ ndị nọchitere anya òtu dị iche iche ritara uru n'amụmà ahụ, nke gụnyere Oriakụ Nọnye Achebe sitere ebe a na-elekọta ụmụaka dị n'Idemili North, na Oriakụ Christiana Eboh, sitere ebe nlekọta ụmụaka dị na Ndịkeliọnwụ kelere ndị onowu ahụ maka ọmarịcha ọrụ obi ebere ha, bụ nke ha kwuru na ha atụghịdị anya ya n'ahọ a n'ihi otu ihe siri kpọọ ka chịn chịn n'ahọ a.

Ha jikwazịrị ihu ọchị wee kelee ndị òtù ahụ maka ótu ha si echeta ndị ụwa na-atụ n'ọnụ oge ọbụla, tinyere ọrụ ọma ndị ọzọ ha na-arụ n'ịkwalite ọnọdụ obibi ụmụ mmadụ, ma kpee ka Chineke kwụghàchi ma gọziekwa ha mmaji kwùrù mmaji.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.