Na Delta, Ndị Uweojii Ejidela Ndị Otu Nzuzo Ebe Ha Na-Anabata Ndị Ọhụrụ

Oct 4, 2021 - 22:24
 0
Na Delta, Ndị Uweojii Ejidela Ndị Otu Nzuzo Ebe Ha Na-Anabata Ndị Ọhụrụ

Izunna Okafor dere akụkọ a


Ndị uweojii steeti Delta anwụchikọọla ndị a na-enyo ènyò na ha bụ ndị otu nzuzo na ndị omekoome n'ebe nzuzo ha dị n'ime ọhịa, oge ha na-anabata ndị ọhụrụ n'otu nzuzo ha.

Ndị ahụ e jidere ruru mmadụ iri n'ọnụọgụgụ, ma bụrụkwa ndị a nwụchikọrọ n'ime anyasị n'obodo Onicha-Ugbo dị n'okpuru ọchịchị ime obodo 'Aniocha North' nke steeti ahụ, ma bụrụkwa ndị a na-enyo ènyò na ha bụcha ndị otu nzuzo Aiye, ndị e jiri 'Black Axe' wee mara.

Onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhaneze na ndị uweojii na steeti Delta, bụ DSP Bright Edafe bụ ya mèrè ka ụwa mara nke a site n'ozi ọ kụpụụrụ ndị nta akụkọ na steeti ahụ, n'aha onyeisi ndị uweojii n'ime steeti ahụ, bụ CP Ari Mohammed Ali.

O mere ka a mara na e nwetere ótù nsụnsụ egbe n'aka ndị ahụ, tinyere ọtụtụ mgbọ egbe dị icheiche site n'aka mmadụ abụọ n'ime ndị otu nzuzo ahụ. O kwukwara na e nwetara anwụrụ ike, otu ụgbọala 'Honda Accord' (nwere akàrà Lagos KSF 586 DU), ọgbatumtum ise na otu àkpa osikapa ákwà juru n'ime ya n'ebe ahụ ndị otu nzuzo ahụ nọ eme ya bụ ihe.

Ya bụ ọnụ ba-ekwuru ndị uweojii kwukwàrà na a ga-akpụpụ ndị ahụ ụlọikpe ngwangwa e mechara nnyocha banyere ihe ahụ ha mere.


N'akụkọ ọzọ dịkwa ka ibe ya, ngalaba ọrụ uweojii pụrụ iche a maara dịka 'Delta State Crack Squad' jidekwara otu nwoke gbara ahọ iri atọ na asaa, bụ Maazị Akpofure Lucky ka o ji nsụnsụ egbe na mgbọ egbe atọ n'obodo Eri, dị nso n'obodo Oleh n'okpuru ọchịchị ime obodo 'Isoko South' nke steeti ahụ.

Oge a gbara ya ajụjụọnụ, nwoke ahụ  jiri ọnụ ya sàá asịsà na ya bụ onye otu nzuzo 'Vikings', ma bụrụkwa onye a nwụchiri oge ndị uweojii wakpòrò ebe dị icheiche ndị omekome na-ezo na mpaghara ahụ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484