Nwa Akwụkwọ UNIZIK Anwụọla, Oge Ọkụ Gbara Ebe Obibi Ụmụakwụkwọ n'Awka

Oct 6, 2021 - 19:38
 0
Nwa Akwụkwọ UNIZIK Anwụọla, Oge Ọkụ Gbara Ebe Obibi Ụmụakwụkwọ n'Awka

Izunna Okafor dere akụkọ a

Otu nwata akwụkwọ mahadum Nnamdị Azikiwe dị n'Awka, zùtèrè ọnwụ mberede ya na nsonso a, oge ọkụ ọgbụgba dapụtara n'otu ụlọ ebe obibi ụmụakwụkwọ mahadum ahụ dị n'Ifite Awka, na steeti Anambra.

Ya bụ ọkụ ọgbụgba bụ nke dapụtara ụbọchị Tuzdee n'ụlọ ụmụakwụkwọ a kpọrọ 'El-Shadai Lodge', ma bụrụkwa nke mere oge ite ikuku mmụọ (gas cylinder) e ji esi nri gbawara n'otu ime ụlọ dị n'ebe obibi ahụ mgbe onye nwe ya ji ya eghe ihe ọtịta 'pop corn'

Dịka ndị ọnọmgbeomere siri kọwaa, ọkụ ọgbụgba ahụ mebisiri ọtụtụ ihe ụmụakwụkwọ ahụ jiri biri n'ụlọ ahụ. Mbọ niile ndị nọ ebe ahụ oge ahụ gbara iji gbanyụọ ọkụ ahụ bụ nke mara afọ n'ala, ma bụrụkwa nke amịtaghị mkpụrụ ọbụla, wee ruo oge ndị ọrụ nsọnyụọkụ steeti Anambra bịara ebe ahụ, wee gbanyụọ ọkụ ahụ, ma bupute ngwongwo ndị nke fọrọ afọ.

Nwata akwụkwọ mahadum UNIZIK ahụ nwụrụ n'ọkụ ọgbụgba ahụ bụ onye e nyere aha ya dịka Precious, ma bụrụkwa onye e kwuru nà aja ụlọ ahụ dagidere n'elu, ebe ndị otu ya gbapụzịrị maka ndụ nke ha oge ha nyegideere ya aka, mana ha enweghị ike ịzọpụtanwu ya; o wee kwògide ọnwụ, wee nwụọ n'ime ebe ahụ.

Ụfọdụ ndị ọzọ bikwa n'ụlọ ahụ nwètèrè mmerụahụ n'ụdị dị icheiche, n'ihi ọkụ ọgbụgba ahụ. 

Ka ọ dị ugbua, mbọ niile a gbara iji nwete ọnụmmiri okwu nwoke nwe ụlọ ahụ amịtàghị mkpụrụ ọbụla.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484