Ndị Ikedịnobi Etoola Ọchịchị Obianọ Maka Nkwàdó

Aug 11, 2021 - 20:54
 0
Ndị Ikedịnobi Etoola Ọchịchị Obianọ Maka Nkwàdó

.

Izunna Okafor dere akụkọ a

.

A kọwaala ọchịchị Gọvanọ Willie Obianọ dịka ọchịchị nwere mmasị pụrụ iche n'ebe ndị ikedịnobi nọ, na n'ihe metụtara ha

Ọ bụ onye ndụmọdụ pụrụ iche nye Gọvanọ Obianọ n'ihe gbasaara ndị ọlụsị/ndị ikedịnobi na steeti Anambra, bụ Ọkaiwu Chuks Ezewuzie kwupụtara nke a na nnukwu ọgbakọ ndị nnọchianya otu jikọtara ndị ọlụsị dị iche iche na ndị nwere nkwarụ n'otu akụkụ ahụ ha maọbụ nke ọzọ n'ime steeti ahụ nwere na nsonso a n'Awka bụ isi obodo steeti ahụ.

Nnukwu ọgbakọ ahụ bụ nke ha nọrọ na ya wee kpaa ma tụlee uche n'ụfọdụ atụmatụ na amụma dị iche iche gọọmenti steeti ahụ tụpụtagoro na ndị nke o ji n'aka ugbua, ọkachasị dịka ha siri metụta ndị ọlụsị.

O kwuru na atụmatụ dị iche iche ọchịchị nọ ugbua na steeti ahụ wepụtagoro maka ndị ọrụsị na ọdịmma emeela ka ọnọdụ maara ha mma ma mekwa ka ha soro n'ihe a na-eme, ma n'ọchịchị steeti ahụ, ma na ngalaba dị iche iche.

Ọ kpọpụtasịrị ebumnobi asaa Gọvanọ Obianọ wepụtara maka ndị ikedịnobi na steeti ahụ mgbe ọ batara n'ọkwa ọchịchị ọhụrụ, nke gụnyere inye ha ọrụ, itinye ha n'ọkwa, inye ha ohere n'ọchịchị ya, ime ka ha nwee ikike, ịhụ na ha gụrụ akwụkwọ, na inwe ezi mmekọrịta n'etiti ha na ọchịchị ya.

O mekwara ka a mara na Gọvanọ eme emepụtechaala ihe dara ụda na ngalaba niile nke nkwà ahụ o kwere ha, ma kọwakwa na ọ na-enyekwa ha nkwàdo, ma n'ọrụ aka na n'ọtụtụ ụzọ ndị ọzọ dị iche iche.

Ọ kọwara na ọ bụrụla ikike dịịrị onye ọlụsị ọbụla na steeti Anambra ịgụ akwụkwọ n'efu n'ihi na aka na-achị steeti ahụ bụ Gọvanọ Obianọ na-ewepute amụma ego e ji akwàdo agụmakwụkwọ ha kwà ahọ ọbụla, bụ nke a na-eme n'okpuru ụlọọrụ na-ahụ maka agụmakwụkwọ na steeti ahụ; ma kọwaa na nke ahụ bụ nke a hụtàbèghị mbụ na steeti ahụ.

Maazị ezewuzie jikwazịrị aha ndị òtù ya wee kelee ọchịchị steeti ahụ  na Gọvanọ Willie Obianọ maka inwe mmasị pụrụ iche n'ihe banyere ha, inye ha ọtụtụ ọmarịcha ohere ọrụ pụrụ iche n'ọchịchị ya, na ime ka ha nwee ọnụokwu ma sorokwa n'ihe a na-eme, ọbụladị dịka o kwere nkwa na ha ga-aga n'ihu inye ọchịchị nọ ugbua na steeti ahụ nkwàdo kwesiri ekwesi.
 
Mmemme ahụ dọtàrà ọtụtụ ndị ndu na ndị nnọchianya òtù jikọtara ndị nwere ụdị ọlụsị dị iche iche n'otu akụkụ ahụ ha maọbụ nke ọzọ, tinyere ndị ji mmegharịahụ akọwa okwu, na ndị enyemaka pụrụ iche nye Gọvanọ Obianọ n'ihe gbasaara ndị ikedịnobi na steeti ahụ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484