Igwe Achebe Agbaala Ọfala Ahọ 2021

Oct 16, 2021 - 22:26
 1
Igwe Achebe Agbaala Ọfala Ahọ 2021

Izunna Okafor dere akụkọ a


Ọ kpotụrụ akpọtụ ma zụọ azụọ na nsonso a, dịka eze ọdịnala Onitsha, bụ Igwe Alfred Nnaemeka Ahebe mere mmemme Ịgba Ọfala ya nke ahọ 2021.

Ya bụ mmemme bụ nke weere ọnọdụ n'obi ezeọdịnala ahụ, dị n'Ọnịtsha n'ime steeti Anambra, bụrụkwa nke dọtara ọtụtụ ndị sitere ebe dị icheiche wee bịa ịnọnyere ya bụ eze ọdịnala nà ndị Ọnịtsha.

Mmemme omenala ahụ bụ nke a na-anọ na ya wee gbaa egwu ọdịnala, ma mekwa ọtụtụ ihe ngosi dị icheiche. Mana, kaosiladị e meghị ihe ndị ahụ ka e si eme ya oge mbụ na mmemme ahụ nke ahọ a, n'ihi ọrịa nje korona.

Abalị abụọ nke mmemme ahụ a maara dịka Azụ Ọfala bụ ụbọchị ndị òtù dị icheiche n'obodo ahụ na-eji eme ihe ngosi n'ùjú éwèrèghịkwà ọnọdụ, n'ihi ike nkwụchà ahụ na iji gbanahị ikesà ọrịa korona. 

Kaosiladị, Mmemme Ịwa Jị Ọhụrụ, nke malitere n'abalị iri abụọ na anọ nke ọnwa Septemba na-agawanye n'ihu n'ịgbasò iwu na-achị mgbochi nkesà ọrịa korona, ma bụrụkwa nà nke a ga-eji Ikelebe-Ji (iri ji ọhụrụ igwe) wee chịkọta n'abalị iri abụọ na otu nke ọnwa Ọktooba a.

N'okwu ya n'ebe ahụ, Igwe Achebe kọwara mmemme ahụ dịka ihe nke mmụọ, bụrụkwa nke a na-eme ma ọ gachaa nnọpụga (seclusion), bụkwa ebe ọ na-anọ wee rịọ maka ọdịmma obodo ahụ na ihe ndị ọzọ kwesiri. Ọ nọkwara na mmemme ahụ wee kpee ka Chineke wete nsogbu, ọgbaghara ihe isiike na ajọ ọnọdụ ndị ọzọ na-adapụta n'ala Nigeria n'isi njedobe.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484