Nteje Emeela Emume Ịlọ Mmụọ Nke Ahọ 2021

Sep 11, 2021 - 19:58
 0
Nteje Emeela Emume Ịlọ Mmụọ Nke Ahọ 2021


Izunna Okafor dere akụkọ a


Igbo sị na omenala bụ ọbara n'ehu n'agbụrụ n'agbụrụ, ma bụrụkwa nwata tote o tokwuru.

Ka ọ dị taa, ndị obodo Nteje Abọgụ, dị n'okpuruọchịchị ime obodo Oyi n'ime steeti Anambra emeela mmemme Ịlọ Mmụọ nke ahọ 2021, bụ otu oke mmemme e jiri mara ya bụ obodo, ma bụrụkwa mmemme ịwa na iri ji ọhụụ nke eze ọdịnala obodo ahụ.

Oke mmemme ahụ bụ nke weere ọnọdụ n'obi eze ọdịnala obodo Nteje, ma bụrụ nke dọtara ụkwụtụụkwụ ụmụafọ obodo ahụ, ma ndị nọ n'ụlọ ma ndị nọ n'ụzọ ijè, tinyere ndị ọrụ gọọmenti, ndị e ji okwu ha agba ìzù na steeti ahụ, ndị enyị, ikwu na ibe, ndị ọgọ, ndị nwadiala na ndị ọzọ na-echere ha ezi echichè, bụ ndị bịara ịnọnyere ha na isoro ha nwee ya bụ obi añụrị.

N'okwu ya na mmemme ahụ, eze ọdịnala obodo ahụ, bụ Igwe Rowland Odegbo weliiri kelere Chukwu maka onyinye ndụ na ụbara ngọzị ya n'isi ụmụafọ Nteje, Ndị Anambra, Ndị Igbo, na ụmụafọ ala Nigeria n'izugbe. Ọ gọrọ ọfọ ogologo ndụ, ihe akụakụ na ihe onwunwe, ya udo tọrọ atọ na ọganihu n'isi obodo ahụ na ụmụafọ ya niile, n'ebe na ebe onye anọna.

Igwe Odegbo kelèzịkwara aka na-achị steeti Anambra bụ Gọvanọ Willie Obianọ maka ezi ịgba mbọ ya n'inwòghàrị ngalaba niile nke steeti ahụ, ya na ọrụ mmepe dị iche iche ọ na-abàgide, ọkachasị n'ime-ime obodo, ma dụọ ya ka o jisie ike na nzọpụ ụkwụ dike ahụ ọ na-azọpụ, ọbụladị dịka o kpèrè ka Chineke gaa n'ihu ịgbà ya ume n'iwètàrà ụmụafọ steeti ahụ ezi ọchịchị. 

Dịka ọ na-ekwupụta ezi olileanya o nwere na Gọvanọ Obianọ ga-achịcha ọchịchị ya nke ọma, ya bụ eze ọdịnala kpèkwazịrị ka ọ bụrụ onye ma nke ekwe na-akụ, dịka Ọkammụta Chukwuma Soludu, ga-enweta mmeri na nhọpụta ọchịchị ahụ a ga-eme na steeti ahụ n'abalị isii nke ọnwa Nọvemba ahọ a, màlite n'ebe Gọvanọ Obianọ kwụsịrị.

Oge ọ wachara ji ahụ kpọmkwem, bụ nke ọ wara mpewa atọ, nke nọchitere anya mpaghara atọ nke obodo ahụ (bụ mpaghara Ezi, Ikenga and Ivite Nteje), Igwe Odegbo, onye nyekwazịrị ndị kacha bụrụ okenye na mpaghara ógbè atọ ahụ ji ahụ, ma kwuwaa, mekwazie ka ụmụafọ Nteje mara na ji ọhụụ etozuola oke ma dịkwa njikere maka oriri n'obodo ahụ.

Ka nke ahụ gachara, ya bụ emume malitezịkwara n'uju. Dịka e si eme ya, ọtụtụ ndị dị iche iche bịárá mmemme ahụ tụụrụ Igwe Odegbo mmamma site n'inye ya ihe onyinye dị icheiche, nke a na-akpọkwa ibu ìhù.

N'okwu ya na mmemme ahụ, onye nọchitebụrụ anya ọgbọnta nkwàdo Anambra Etiti n'ụlọ omeiwu sineeti ala Nigeria, bụ Sinetọ Victor Umeh kọwara mmemme iri ji ọhụrụ dịka oge ndị Igbo ji ekele Chukwu maka onyinye ji na owuwe ihe ubi, ọbụladị dịka ọ kpọkuru ndị obodo ahụ ka ha jisie ike na-enye eze ọdịnala ha nkwàdo kwesiri ekwesi.

N'okwu nke ya, onyeisi ụlọ mgbasaozi 'Anambra Broadcasting Service (ABS), bụ Dọkịta Uche Nworah kelere Igwe Odegbo na ụmụafọ Nteje maka ịchịkọba ya bụ oke mmemme, ma kọwaa mmemme iri ọhụrụ dịka mmemme e ji akwalite ọdịnala na omenala Igbo. 

Oke mmemme ahụ dọtàrà ndị eze ọdịnala obodo dị iche iche, tinyere onyeisi ụlọọrụ na-ahụ maka njem awele, bụ ụlọọrụ 'Federal Road Safety Corps (FRSC)', bụ Maazị Adeoye Irelewuyi; onyeisi òtù 'Asaba Development Union Worldwide', Ọkammụta Epiphany Azinge; onyeisi ụlọụka 'Living Olive Evangelical Outreach Ministry', bụ  Chijindu Samuel, tinyere ọtụtụ ndị ọzọ so n'isi ọchịchị steeti ahụ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484