N'Ụmụoji, A Gbaarala Igwe Enweze Ọfala Ikpeazụ

Apr 13, 2021 - 17:40
 0
N'Ụmụoji, A Gbaarala Igwe Enweze Ọfala Ikpeazụ

Izunna Okafor dere akụkọ a


Ọ zụrụ ka ahịa n'Ụmụoji dị n'okpuru ọchịchị 'Idemili North' nke steeti Anambra, dịka ndị obodo ahụ gbaara eze ọdịnala ha nwụrụ anwụ, bụ Dọkịta Cyril Nwabunwanne Enweze Ọfala ikpeazụ.

Mmemme ịgba Ọfala ikpeazụ ahụ bụ nke weere ọnọdụ n'obi eze ọdịnala ahụ, ma bụrụkwa nke dọtara ọtụtụ ndị mmadụ, bụ sitere ebe dị iche iche wee bịa iso kwanyere eze ọdịnala ahụ ugwu ikpeazụ.

Igwe Enweze, onye chịrị Ụmụoji ahp iri na anọ, nwụrụ ka ọ gbachara ahọ iri asaa, ma bụrụkwa onye rụrụ ọrụ dịka onyeisioche ụlọọrụ 'Anambra State Investment, Promotion, and Protection Agency (ANSIPPA)'.

N'okwu ya na mmemme Ọfala ikpeazụ ahụ, aka na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Willie Obianọ, nke ọ bụ Kọmishọna na-ahụ maka mgbasa ozi na ịkụziri ọhaneze ihe ha kwesiri ịma, bụ Maazị C-Don Adinuba kọwara Igwe Enweze dịka ezigbo mmadụ jiri amamihe ya na obi ya niile wee jeere steeti ahụ na obodo ya ozi, ma mekwa ka a mara na ya bụ eze ọdịnala dọtààrà steeti ahụ ego ihe mwunye karịrị ijeri dọlà anọ mgbe ọ bụ onyeisi ụlọọrụ ANSIPPA.

Dịka ọ na-akọwa ya bụ nwoke ka onye kwesiri nñomi, ya bụ gọvanọ kpèkwàzịrị ka mkpụrụobi ya zuo ike na ndokwa.

N'okwu nke ya, onyeisi ọchịchị obodo Ụmụoji, bụ Maazị Sly Onyima kọwara eze ọdịnala ahụ dịka onye udo na onye ihe banyere obodo ya na-echu ụra, ma kwuo na ya bụ Igwe rụrụ ọrụ nke ọma, kwàlitekwa udo na ezi ọndụ mmepe n'obodo ahụ. O mere ka a mara na a gaghị echefulata ezi ọrụ dị iche iche ya bụ agụ nwoke rụrụ n'obodo ahụ, ọbụladị dịka o kwere nkwà na ha ga-gbaso nzọụkwụ eze ọdịnala ahụ, iji hụ na obodo ahụ nọgidesiri n'ịga n'ihu na n'ezi ọnọdụ udo, n'agbanyeghị na ọ nọghịzị ndụ.
 
Ụfọdụ ndị ọzọ kwuru okwu n'ebe ahụ gbara ezi ama banyere ndụ Igwe Enweze, kasìé ndị Ụmụoji na ndị ezinụlọ ya obi, dụọ ha ọdụ ka ha gbasò ezi nzọụkwụ ya, ma kpekwa ka ka Chineke nye mkpụrụobi ya ezumike udo.

A nọrọ na mmemme ahụ tie mmanwụ, gbaa egwu ọdịnala dị iche iche, tinyere ọtụtụ ihe ngosi ndị ọzọ e mere, nke mezịrị ka mmemme ahụ zaa aha a kpọrọ ya.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484