Anthony Joshua Enwetakwala Nturu Ugo Ya

Anthony Joshua Enwetakwala Nturu Ugo Ya

Dec 12, 2019 - 01:17
Jan 19, 2021 - 01:18
 0
Anthony Joshua Enwetakwala Nturu Ugo Ya

By Ibe Kelechukwu, Ibadan, Nigeria

Igbo sị na onye na-amụ iti ọkpọ buru ụzọ tie akpa aja tupu ọ chọwa onye ọ ga-etigbu. Ya were bụrụ ihe kọwara otu nwa amadị a, bụ Anthony Joshua, siri tichaa akpa àjà ma tigbue Andy Ruiz Jr, na asọmpi ha abụọ nwere.

Anthony Joshua bụ onye gbara afọ iri atọ, nwetaghachiri nturu ugo okaibe nke mba ụwa ya dị iche iche ụbọchị Satọdee na mba Saudi Arabia ebe ya bụ asọmpi nọ were ọnọdụ. Anthony Joshua, bụ okwu akpụ n'ọnụ na mgba ahụ dịka o meriri onye otu ya si mba Mexico na agba karịrị iri na abụọ ha kụrụ ọkpọ.

Dịka ọ tụrụ ya n'anya ka Andy Ruiz si were merie ya ma nara ya nturu ugo ya ihe dịka ọnwa isii gara aga, Anthony Joshua kwuru na o zughị oke na ya onwe ya na-agba mbọ. Dịka o merichara Ruiz, o biri ya ọma ma kelee ya nke ọma. Ọ sị na abalị ahụ bụ abalị bụ ha ga-echeta.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.