Ntozu AFCON: Ugo Naijiria Eburu Uze Benin

Ntozu AFCON: Ugo Naijiria Eburu Uze Benin

Nov 14, 2019 - 17:52
Jan 19, 2021 - 17:52
 0
Ntozu AFCON: Ugo Naijiria Eburu Uze Benin

By Ibe Kelechukwu, Ibadan, Nigeria

Ugo Ukwu nke Naijiria nọrọ n'amaegwuregwu Godswill Akpabio dị na Uyo were gosi Uze Benin na ha ka na-amụ amụ n'ebe egwu bọọlụ dị. Ugo Ukwu jiri ọkpụ abụọ asatara nanị otu were merie Uze na asọmpi nke otu L maka ntozu nke iko Afrịka.

N'agbanyeghị na ọgbanihu Stéphane Sessègnon mepere inye goolu na nkeji ise, ọgbanihu ndị Lille, Victor Osimhen, sara goolu ahụ site na-adoba agbaa penariti dịka agba nke mbụ na abịa na njedebe.

Ka ebidosịrị agba nke abụọ, ọgbanihu nke otu egwu bọọlụ Bordeaux Samuel Kalu, gara n'ihu were nye Naijiria mmeri na nkeji iri isii na atọ dịka goolu ya nwetara akara atọ niile Naijiria chọrọ n'asọmpi otu L ahụ.

Ugo Naijiria ga-aga n'ihu na asọmpi maka it ozu ịsonye AFCON 2021 ụbọchị ụka oge ha na mba Lesotho ga-ezute n'amaegwuregwu Setsoto dị na Maseru.

Naijiria bụzi ndị mbụ ugbua n'otu L site na akara atọ dịka mba Sierra Leone na Lesotho gbara onwe ha otu ọkpụ, otu ọkpụ na Freetown. Kwame Quee na-agba bọọlụ na mba Iceland nyere goolu ndị Sierra Leone n'amaegwuregwu mmadụ anọghị na nkeji iri isii na iteghete.

Onyeisi otu egwu bọọlụ mba Lesotho bụ onye nke a chụpụrụ ka o nwetachara akwụkwọ edo edo nke abụọ na nkeji iri asatọ na atọ, ebe George Kweke Davies nwetara akwụkwọ ọbara ọbara maka ịlụghachi ọgụ. Ndị ọbịa ahụ gbalisiri ike nweta otu akara na nkeji nke atọ oge etinyere etinye site n'aka Thobanston Jane.

N'asọmpi ndị ọzọ, Guinea Bissau jiri ọkpụ atọ asataghị otu merie Eswatini na otu I, mba Rịpọbụliki Etiti Afrika meriri Burundi site n'inye ha ọkpụ abụọ asataghị otu, ebe Malawi zọrọ isi onwe ya ma merie mba South Africa site na inye ha otu ọkpụ. N'ebe nke ọzọ, Cameroon na Cape Verde gbara onwe ha onye laba onye laba n'otu F, ebe Namibia gosiri Chad ike ha site n'iji ọkpụ abụọ asatara otu were merie ha n'otu A.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.