Aha Ighalo, Ndidi, Iwobi na Uzoho Apụtala Maka Ọkachi Agba n'Afrịka

Nov 22, 2019 - 20:25
Jan 24, 2021 - 04:44
 0
Aha Ighalo, Ndidi, Iwobi na Uzoho Apụtala Maka Ọkachi Agba n'Afrịka

Ibe Kelechukwu, Ibadan

Mmadụ anọ n'ime otu egwu bọọlụ Ugo Naijiria bụ Odion Ighalo, Alex Iwobi, Wilfred Ndidi na Francis Uzoho abụrụla ndị aha ha pụtara na ndị enwere ike ịhọpụta dịka ọkachi agba nke otu egwu bọọlụ Afrịka nke afọ 2019. Nkea sitere n'aka otu egwuregwu bọọlụ Afrịka dị n'aka, akpọrọ CAF n'aha mkpirisi.

Ndị egwu bọọlụ ndia akpọrọ soronyere Ugo Ukwu Naijiria na asọmpi Iko Mba Afrịka nke afọ 2019 agbara na Ijipt n'ime afọ a. Ugo Naijiria nwetara ọla nchara oge ha jiri otu ọkpụ asataghị chaa merie mba Tunisia n'amaegwuregwu Al-Salam, dị na Cairo. N'ihi ụdị egwu ọkpa ha gbara, ha nwere ike idebanye aha na ncheta AFCON dịka ọ dị ugbua.

Onye na-agba n'ihu nke otu egwu bọọlụ Shanghai Shenhua bụ Ighalo kwụpụtara iche na Ijipt n'ihi na ọ jighị anya ahụ ebe ọnụ goolu dị mere o ji agbanye goolu elu na ala. Nkea nyere ya nturu ugo dịka onye kachasị nye goolu na asọmpi Iko mba Afrịka nke afọ a site na goolu ise o nyere nke ritara ya akpụkpọ ụkwụ ọlaedo tupu ọ kwụsị ịgba bọọlụ n'obodo Naijiria.

Onye ọzọ na-agbakwara Leicester n'etiti, Ndidi, bụ akpọọ a zaa oge ọ bụla otu egwu bọọlụ ya na mba ofesi na Naijiria kpọkuru ya ebe ọ na-eme ihe ike. Ọgba n'etiti ndị Everton, Alex Iwobi na oche goolu ndị AC Omonia Uzoho bụ ndị sonyere Ugo Naijiria na Ijipt nwere olileanya na ha ga-esonye na mmadụ iri na otu ikpeazụ. Mmadụ iri na otu kacha agba CAF bụ ndị a ga-akpọpụta na mmemme n'abalị asaa nke ọnwa Jenụwarị, 2020.

Aha Ndị Niile Ahọpụtara

Ndị Oche Goolu: Moez Ben Cherifia , Yassine Bonnou, Mohamed El Shenaway, Sylvain Gbohouo, Rais M ’ bolhi, Edouard Mendy , Richard Ofori , Andre Onana , Denis Onyango , Francis Uzoho

Ndị Na-agba N'azụ: Youcef Atal, Serge Aurier, Mehdi Benatia , Ahmed El - Mohammadi, Lamine Gassama, Faouzi Ghoulam, Achraf Hakimi, Ahmed Hegazi, Kalidou Koulibaly , Christian Luyindama , Issa Mandi, Joel Matip, Noussair Mazraoui , Yassine Meriah , Youssouf Sabaly

Ndị Na-agba N'etiti: Andre- Frank Anguissa , Ismael Bennacer , Sofiane Feghouli , Idrissa Gueye , Tarek Hamed , Alex Iwobi , Wahbi Khazri , Naby Keita , Franck Kessie , Wilfried Ndidi , Riyad Mahrez, Thomas Partey , Mubarak Wakaso , Victor Wanyama , Hakim Ziyech

Ndị Na-agba N'ihu: Pierre Emerick Aubameyang , Jordan Ayew , Anis Badri , Cedric Bakambu , Youcef Belaili , Baghdad Bounedjah , Odion Ighalo , Sadio Mane , Moussa Marega , Mbaye Niang , Nicolas Pepe , Mohamed Salah , Islam Slimani, Percy Tau , Wilfried Zaha.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.