Ọkaokwu Anambra Emeela Ncheta Ụbọchị Ọmụmụ Ya, Kesàárà Ndị Mmadụ Ihe Nkwàdo

Apr 8, 2022 - 19:53
 0
Ọkaokwu Anambra Emeela Ncheta Ụbọchị Ọmụmụ Ya, Kesàárà Ndị Mmadụ Ihe Nkwàdo

Izunna Okafor dere akụkọ a

Ọ kpọtụrụ akpọtụ ma zụọ azụọ na nsonso a n'Ifite-Ogwari, dị n'okpuruọchịchị ime obodo Ayamelum, dịka Ọkaokwu steeti Anambra, bụ Rt. Hon. Uchenna Okafor mere emume ncheta ụbọchị ọmụmụ ya, bụkwa nke ọgbụgba ahọ iri anọ na ise o jiri bịa ụwa.

Oke mmemme ahụ bụ nke weere ọnọdụ n'ụlọakwụkwọ ‘Central Primary School, Ifite-Ogwari, ma bụrụkwa nke dọtara imirikiti ndị mmadụ sitere mpaghara ebe ahụ, nakwa ọtụtụ ndị ọzọ e ji okwu ha agba izu, nke gụnyere ndị ọrụ gọọmenti na ndị ọzọ okwu ha na-ada ụda n'ọrụ gọọmenti na ngalaba ndị ọzọ dị icheiche, tinyere aka na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Chukwuma Soludo na ọtụtụ ndị ụlọ omeiwu steeti ahụ.

Ya bụ mmemme bụkwà nke Ọkaokwu ahụ nọrọ na ya wee kesàára ọtụtụ ndị mmadụ sitere n'ọgbọ nta nkwàdó ya ọtụtụ ihe nkwàdo na akụrụngwa dị icheiche ha ga-eji wee nyere onwe ha aka, na-achụtakwa ihe ha ga-eri, ma bụrụkwa ndị kwụụrụ onwe ha 

Ihe dị icheiche o kesààrà ndị ahụ gụnyere àkpà nri ala (fetịlaịza) ruru narị isii n'ọnụọgụgụ, ụgbọala Toyota Camry ruru iri na otu, akụrụngwa e ji akwa ákwà ruru iri atọ na atọ, ọgbaatumtum ruru iri atọ na ise, akụrụngwa e ji akwọ ihe, akụrụngwa e ji agba ọgwụ ahụhụ n'ugbo, tinyere ihe ndị ọzọ gburu ego ruru nde kwuru nde naịra.

N'okwu ya n'ebe ahụ, Rt. Hon. Okafor kọwàrà nkwàdo ahụ o nyere ndị ahụ dịka nke o jiri merube ncheta ụbọchị ọmụmụ ya, bụkwa nke o kwuru na ọ dabàkwàrà àdábà na nkwà dị icheiche o kwere ha mgbe ọ na-achụ nta nkwàdo, bụ mgbe o kwere nkwà ime ka ọtụtụ n'ime ha nwee ihe ha na-arụ, ma ịkwàlitèkwa ọnọdụ obibindụ ha.

O kèlèrè ndị ọgbọ nta nkwàdo ahụ maka nkwàdo pụrụ iche ha na-enye gọọmenti otu ndọrọndọrọ ‘All Progressive Grand Alliance (APGA)’ na steeti ahụ; ọbụladị dịka o kwere nkwà ịga n'ihu na-anọchite anya ha nke ọma n'ụlọ omeiwu steeti ahụ ma na-arụkwa ọrụ ya n'ikwesi ntụkwasịobi, iji kwàlité ámụmà iwu bụ ị̀gbà maka ọdịmma steeti Anambra n'izugbe.

Ọ nọkwàrà n'ebe ahụ wee nye ego dị nde naịra abụọ nyegara ndị wọọdụ ndọrọndọrọ ọchịchị dịgasị n'okpuru ọgbọ nta nkwàdo ahụ maka ọrụ ọma pụrụ iche ha rụrụ nà ezi mbọ dara ụda ha gbara ịhụ na APGA nwètèrè mmeri na nhọpụta ọchịchị ọkwa gọvanọ ahụ e mere n'abalị isii nke ọnwa Nọvemba ahọ gara aga. 

Rt. Hon. Okafor kèlèzịkwàrà ndị òtù nkwàdo a kpọrọ ‘Uche Okafor Support Group’ maka inye ya ego dị nde naịra abụọ na ụma ise ka o wee gbata akwụkwọ ọ ga-eji zọgharịa ọkwa ịnọ̀chìtè anya ọgbọ nta nkwàdó ahụ na nhọpụta izugbe ahụ a ga-eme n'ahọ na-abịa abịa, bụ nke ha kwuru na ha nyere ya ego ahụ n'ihi ezi ọrụ ya na ihe o mepụ̀tàgòrò n'ime ahọ ole ọ nọ̀gòrò anọ ebe ahụ, maka na nke ahụ dị ha ahụ mma.

N'okwu nke ya n'ebe ahụ, onyeisioche otu ndọrọndọrọ APGA n'okpuruọchịchị Ayamelụm, bụ Maazị Livinus Onyenwe mere ka a mara na ịhọpụta Ọkaokwu Uche Okafor ka ọ nọchite anya ha so n'ihe ọma kachasị ihe ọma meere ndị mpaghara ahụ, ọbụladị dịka o kwuru na ha ga-aga n'ihu inye ya nkwàdo.

N'okwu ha n'aha ndị ọzọ ritere uru n'ihe ahụ e kesara ụbọchị ahụ, nke gụnyere Maazị Ken Onyeabo na Oriakụ Bridget Nnonyelu kèlèrè ya bụ onye omeiwu maka akụrụngwa nkwàdo ahụ o bunyere ha, ma kwupụta ezi olileanya ha nwere na nke ahụ ga-enye aka ịkwalite ọrụ ha na ihe dị icheiche ha ga-eji ya mee.

Na mbụ n'okwu nke ya, ótù n'ime nnukwu ndị ọbịa sonyéré na mmemme ahụ, bụ Gọvanọ Soludo jikwàrà ohere ahụ wee kelee ndị Ayamelum maka etu ha siri tụnyere ma kwàdo APGA na nhọpụta ahụ e mere n'ahọ gara aga; ma kọwakwa na nke ahụ bụ nnukwu ihe ịgba akaebe na Ọkaokwu Uchenna Okafor na-eme nke ọma.

Dịka ọ na-atụrụ Ọkaokwu Okafor mmamma maka ọgbụgba ahọ iri anọ na ise ya, Gọvanọ Soludo kpọpụtasịrị ụfọdụ ihe dị icheiche ọchịchị ya ji n'aka na steeti ahụ, ma nọrọkwazie ebe ahụ wee kwe nkwà na ọrụ ga-amalite oge adịghị anya n'okporoụzọ ahụ siri Omor gaa Awba-Ofemmili, bụ ‘Omor-Awba-Ofemmili Road’ dị n'okpuru ọchịchị ime obodo Ayamelum ahụ.

Ikesàrà ndị ahụ ihe nkwàdo ahụ na ịwa achịcha bekee ọgbụgba ahọ iri anọ na ise Ọkaokwu Okafor so n'ụfọdụ ihe pụtakarịchara ihè n'óké mmemme ahụ, tinyere emume ịkụ ngazị n'eze, nke e jiri mee ka ya bụ óké ụbọchị magbuo onwe ya ma zakwa aha a kpọrọ ya.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484