Soludo Akpọlitela Mmadụ Isii n'Ọkwa

Mar 24, 2022 - 20:52
 0
Soludo Akpọlitela Mmadụ Isii n'Ọkwa

Izunna Okafor dere akụkọ

N'ihi na Igbo sị na otu osisi anaghị eme ọhịa, aka na-achị steeti Anambra, bụ Ọkammụta Chukwuma Soludo akpọlitela mmadụ isii ndị ha na ya ga-eso rụọ ọrụ n'ogoogo dị icheiche n'ọchịchị ya na steeti ahụ, bụ nke malitere ụbọchị Tọzdee izuụka gara aga.

Ọkammụta Soludo bụ onye nọrọ ụbọchị ahụ e duru ya n'iyi ọrụ kpọnkwem, wee kpọlite mmadụ atọ n'ọkwa atọ dị icheiche, ka ọ gachara awà olenaole o jiri malite ọrụ n'uju.

Mmadụ atọ ahụ ọ kpọlitere ụbọchị ahụ gụnyèrè Ọkammụta Solo Chukwulobelu (bụ onye ọ kpọlitere dịka odeakwụkwọ izugbe steeti Anambra, ma bụrụkwa onye jibụ ya bụ ọkwa n'ọchịchị nke Gọvanọ Willie Obianọ gwụrụ agwụ); Dọkịta Chukwudi Okoli (bụ onye ọ kpọlitere n'ọkwa dịka onye ọgbakọego izugbe nke steeti ahụ); na Maazị  Chinedu Nwoye (bụ onye ọ kpọlitere iji ọkwa dịka osote onyeisi ndị ọrụ nye Gọvanọ).
 
Ka ọ gachara abalị olenaole o jiri kpọlite ndị ahụ, Gọvanọ Soludo nọkwàrà ụbọchị Mọnde wee kpọlite mmadụ atọ ọzọ n'ọkwa atọ ọzọ dị icheiche, nke mezịrị ka ha zuo mmadụ isi na mkpokọta, bụ ọnụọgụgụ ndị ọ kpọlitegoro n'ọkwa iso ya rụọ ọrụ.

Mmadụ atọ ahụ ọ kpọlitere ọhụrụ gụnyèrè Maazị Ernest Ezeajughi (bụ onye ọ kpọlitere n'ọkwa dịka onyeisi ndị ọrụ nye Gọvanọ); Maazị Richard Nwora Madiebo (bụ onye ọ kpọlitere dịka onyeisioche ụlọọrụ na-ahụ maka ego a na-enweta n'ime steeti ahụ, bụ ụlọọrụ ‘Anambra State Internal Revenue Service, AIRS’); nà ‘Air Vice Marshall’ Ben Chiobi lagoro ezumike nka (bụ onye ọkpọlitere dịka onye ndụmọdụ pụrụ iche nye Gọvanọ n'ihe gbasaara nchekwa.

N'ime mmadụ atọ ndị a ọ kpọlitere n'ọkwa ọhụrụ, Maazị Ezeajughi bụ onye jibụrụ ọkwa dịka ‘Mayor’ na mba London, ma bụrụkwa nwa afọ obodo Awgbu dị n'okpuruọchịchị ime obodo ‘Orumba North’; Maazị Madiebo bụ onye obodo Ụmụokpu dị n'okpuruọchịchị ime obodo ‘Awka South’; ebe AVM Chiobi bụ onye obodo Abagana dị n'okpuruọchịchị ime obodo Njikoka.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484