E Nyela Ndị Eze Ọdịnala Ọhụrụ Asambodo n'Anambra

Mar 21, 2022 - 22:32
 0
E Nyela Ndị Eze Ọdịnala Ọhụrụ Asambodo n'Anambra


Izunna Okafor dere akụkọ a

Ọ na-abụ a nyụọ nsị, a kapịàghị ya ọnụ, ọ bụrụ òtòrò, maka na ọ na-adị mma, a kpụchaa Diji, a kpụnye ya óké ji n'aka.

N'ịgbaso nke a, ọchịchị steeti Anambra nọrọ na nsonso a wee nye ụfọdụ ndị eze ọdịnala e chiri ọhụrụ na steeti ahụ asambodo, iji gosi na gọọmenti kwàdòro ma nye ha ikike ịbụ eze ọdịnala obodo ha dị icheiche.

Ụfọdụ ndị eze ọdịnala ahụ e nyere asambodo ahụ gụnyèrè eze ọdịnala obodo Enugwu Otu Aguleri dị.n'okpuru ọchịchị ime obodo ‘Anambra East’, bụ Igwe Emmanuel Ejiofor; eze ọdịnala obodo; eze ọdịnala obodo Akili Ogidi dị n'okpuru ọchịchị Ogbaru, bụ
Igwe Ikechuchukwu Nwafili; na eze ọdịnala obodo Nando dị n'okpuru ọchịchị ime obodo ‘Anambra East’, bụ Igwe Frances Aghaeze.

Mmemme ahụ bụ nke weere ọnọdụ n'obi gọọmenti dị n'Awka bụ isi obodo steeti Anambra ma bụrụkwa nke dọtara ọtụtụ ndị dị icheiche sitere obodo ndị ahụ wee bịara ịnọnyere na ịnabata eze ọdịnala ha.

N'okwu ya oge ọ na-enye ha asambodo ahụ n'aha gọọmenti Anambra, onye na-ahụ maka mgbasaozi n'ụlọọrụ na-ahụ maka ọchịchị ime obodo na echichi ọdịnala, bụ Maazị Henry Nwasike kọwàrà na asambodo ahụ bụ nke e nyere ha iji gosi na gọọmenti anabatala ma kwàdo ha dịka ndị eze ọdịnala obodo ha dị icheiche.

O chètààrà ha na ọ bụ ndị obodo ha dị icheiche họpụtara ma guzobe ha ka ha bụrụ ndị eze ọdịnala ha; ma dụkwazie ha ọdụ ka ha ghara ịgharịpụ ndị obodo ha na ntụkwasịobi ha nwere n'ebe ha nọ.

Ọ kọwàrà omenala Igbo, ọdịnala Igbo, na ọdịbendị dịka ihe dị ezi mkpa na nke bakwara urù nke ukwuu, ma kwupụta mkpa ọ dị na ụmụafọ Igbo na-asọpụrụ ma na-echekwaba ihe ndị ahụ nke ọma, malite na ndị eze ọdịnala obodo ọbụla wee ruo na ndị ha na-achị achị. 

Ọ kọwakwara ndị eze ọdịnala dịka ndị bara oke úrù na ndị nwere nnukwu ọrụ nà ntụnye pụrụ iche n'ichekwaba omenala na ọdịnala, na n'ịkwàlite udo ọganihu na mmepe obodo. 

O kwuru na ọ bụ mmasị ọchịchị  steeti ahụ ịkwàlite ezi mmepe tọrọ àtọ n'ime-ime obodo niile e nwere na steeti ahụ, ma kpọpụtasịa ụfọdụ ụzọ dị iche iche o sigòrò mee nke ahụ. Ọ kpọkùkwazịrị ndị eze ọdịnala ahụ ka sonyesie ike n'ịkwàdo na imezùputa amụmà na atụmatụ ọrụ mmepe dị icheiche ọchịchị steeti ahụ na-ewepụ̀ta n'aka na steeti ahụ, ọkachasị n'ime obodo ha dị icheiche. 

N'okwu nke ya n'ebe ahụ, onye ndụmọdụ pụrụ iche nye Gọvanọ Willie Obianọ n'ihe gbasaara echichi ọdịnala na ọchịchị ime obodo, bụ Dọkịta Vera Okonkwo dụrụ ha ọdụ ka gba mbọ mee ka udo chịa n'obodo ha dị icheiche, iji kwàlite ọnọdụ mmepe na ọganiru.

Na nzaghachi ha n'otu n'otu, ndị eze ọdịnala ahụ, kèlère gọọmenti steeti Anambra maka inye ha asambodo ahụ, bụ nke gosiri na ha abụrụla ndị steeti ahụ mà dịka ndị eze ọdịnala obodo ha dị iche iche. Ha kwekwazịrị nkwa na site n'enyemaka Chineke, na ha ga-eji ocheeze ha wee rụọ ọrụ nke ọma, kwàlite udo na ọnọdụ mmepe n'obodo ha dị iche iche na steeti ahụ n'izugbe.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484