Ndị Anambra Agaala n'Ihu Izigara Soludo Na Ibezim Ozi Ekele Maka Mmalite Ọchịchị Ha

Mar 24, 2022 - 20:58
 0
Ndị Anambra Agaala n'Ihu Izigara Soludo Na Ibezim Ozi Ekele Maka Mmalite Ọchịchị Ha

Izunna Okafor dere akụkọ a


Ka ọ gachara ụbọchị olenaole e jiri duo Ọkammụta Chukwuma Soludo na Dọkịta Onyekachi Ibezim n'ọkwa dịka Gọvanọ na Osote Gọvanọ steeti Anambra n'ótù n'ótù, ọtụtụ ndị mmadụ ka na-aga n'ihu na-atụrụ ha mmamma ma na-ezigara ha ozi ekele maka nguzobe n'ọkwa ahụ, ma na-ekwupụtakwa ezi olileanya ha nwere na ọchịchị ha ga-eme nke ọma karịa ka a tụrụ anya.

Ọ dị ncheta na Gọvanọ Soludo na osote ya nọrọ ụbọchị Tọzdee izuụka gara aga wee malite ọchịchị n'ùjú na steeti ahụ, dịka oge ọchịchị nke aka chịpụ̀rụ̀ steeti ahụ, bụ Gọvanọ Willie Obianọ na osote ya bụ Dọkịta Nkem Okeke bịara n'isi njedobe.

Idu n'iyi ọrụ ahụ bụ nke weere ọnọdụ kpọnkwem n'obi gọọmenti dị n'Awka bụ isi obodo steeti ahụ, bụrụ nke e mere kpọnkwem site n'aka Ọkaikpe Nkwụmọtọ Steeti ahụ, bụ Ọkaikpe Ọnọchie Anyachebelụ; ma bụrụkwa nke dọtara ọtụtụ ndị dị icheiche okwu ha na-ada ụda na steeti ahụ, nke gụnyere aka chịbụrụ steeti ahụ mbụ, bụ Maazị Peter Obi, ndịisi ụka, ndịisi otu ndọrọndọrọ ọchịchị ‘All Progressive Grand Alliance (APGA)’; ndị selitere isi n'ọrụ gọọmenti, tinyere ọtụtụ ndị ọzọ e ji okwu ha agba izu.

Ọ bụkwa n'okwu ya oge e duchara ya n'iyi ọrụ ahụ ka Ọkammụta Soludo nọrọ wee kpọpụtasịa ụfọdụ ihe dị icheiche ọ ga-eme, ebe ọchịchị ya ga-elebakarị anya, na ihe ọ tụrụ anya n'aka ndị Anambra, iji mezupụta ebumnobi ahụ o nwere maka steeti ahụ.

Malite n'ụbọchị ahụ e duchara ya bụ Gọvanọ na osote ya n'iyi ọrụ, ha ka na-aga n'ihu na-enweta ozi ekele site n'aka ndị mmadụ nakwa ndị otu dị icheiche na steeti ahụ na mpụga ya, bụkwa ndị na-ekwupụta ezi olileanya ha nwere na ọchịchị ha ga-eme nkeọma karịa ka a tụrụ anya.

N'ozi ịtụ mmamma ha zipuru na nsonso a, nke osote onyeisi mbụ ha bụ Maazị Chiifu Patrick Oyeduba na odeakwụkwọ ha, bụ Maazị Joe Nwaegwu binyere aka na ya, ndị òtù jikọtara ndị Onoowu na steeti Anambr, bụ ‘Anambra State Council of Traditional Prime Ministers’ kọwara Ọkammụta Soludo dịka onye ñụjuru mmiri ara afọ na onye ma nke ekwe na-akụ n'ịhazi ọnọdụ akụnụba, na onye nwere ihe ọ ga-ewe iji bulie steeti ahụ n'ogoogo dị elu.

Ha kwuru na ọ ga-eji ịma mmadụ ya wee dọta ndị oji ego achụ ego sitere ala Nigeria na mba ofesi; kelee ya maka njem nleta ahụ ọ gara n'Okpoko n'okpuruọchịchị ime obodo Ọgbaru iji hụ ihe ndị bi na mpaghara ebe ahụ na-agabiga na etu ọ ka ọ ga-esi malite ọrụ n'ebe ahụ; ma kpọkuzie ụmụafọ steeti Anambra ka ha gaa n'ihu inye ya nkwàdo.

N'akụkụ nke ya, ézè ọdịnala Ebenator dị n'okpuruọchịchị ‘Nnewi South’, bụ Igwe Edwin Chinewubeze Ezejiburu, na onyeisi ọchịchị obodo ahụ, bụ Maazị Anthony Okechukwu tụ̀ụ̀rụ̀ Ọkammụta Soludo na Dọkịta Ibezim mmamma, ma kwupụta olileanya ha nwere na ha ga-eji ezi ọgụgụisi ha nwere wee kwàára steeti ahụ ụzọ, kwalite ọnọdụ mmepe ya, ma bulikwa ya n'ogoogo dn elu.

Ha kpọkukwazịrị ya bụ Gọvanọ na osote ya ka ha ghara ikwe ka ihe ọbụla kpasàá ha anya n'ịrụzupụta ezi ọrụ ha jiri bịa; ọbụladị dịka ha gọọrọ ha ọfọ ogologo ndụ, amamihe na ahụike, ma rịọkwa ndị Anambra ka ha nye ọchịchị ahụ nkwàdo zuru oke iji mee nke ọma.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484