Ọnwụ Na Akwamozu n'Ala Igbo: Oge Mbụ Na Oge Ugbua

Apr 5, 2021 - 08:44
 0
Ọnwụ Na Akwamozu n'Ala Igbo: Oge Mbụ Na Oge Ugbua
Ndi na-eje akwamozu

Izunna Okafor dere edemede a


Akwamozu bụ e mee nwata ka e mere ibe ya. Ọ bụ otu n'ime emume zuru ụwa ọnụ ma bụrụkwa mmemme zuru ọnwa na ahọ ọnụ, maka na ụwa bụ ahịa na-azụ kwa ụbọchị; ndị na-eje eje ndị a na-ala ala.

Akwamozu bụ ùgwù ikpeazụ a na-akwanyere onye nwụrụ anwụ na emume ikpeazụ a na-emere ya iji sị ya gaa ije ya nke ọma. Nke a bụ n'ihi na ọ bịara ije ga-alarịrị ala, ụdị ogologo ọ sọkwara ije ya too; maka na o nweghị onye ga-epu ome n'ụwa a. Ndị ọbụla, ọbụnadị ndị Awụsa na ndị ọcha na-emegbàdo emume akwamozu maka na anwụọ elighị elu na-ebute anwụba ebighị ebi. Ọ bụ eziokwu na ndị ọbụla na agbụrụ dị iche iche nwere etu ha si eme nke ha, mana etu ọbụla e siri mee ya, ihe adịghị mgbagha bụ na a kwaala ozu.

N'ala Igbo, a hụtara akwamozu dịka mmemme 'ọ bụ m ka ọ bụ gị?' maka na ebe onye na-akwa mmadụ ka ọ na-akwa onwe ya. Òkù ọnwụ bụ mgbe chi onye ụwa jiri kpọọ ya maka na ụwa bụ ahịa, onye zụchaa nke ya ọ laa. Onweghịkwa onye maara oge nke ya ga-abụ. Ọbụnadị ndị chere na ha na-ahụ ụzọ apụghị ịhụ mgbe ha ga-anwụ maka na ihe Chukwu zonahịrị Mmụọ ozi, ọ bụzị mmadụ pụrụ ịmata ya? Ọ bụ nke a mere na ndị Igbo ejighị akwamozu egwu egwu, ọkachasị n'oge mbụ.

Na mgbe gboo n'ala Igbo, ọ bụrụ na mmadụ nwụọ maọbụ e nwee ka e siri tie mkpu akwa, o wee bụrụ mkpu ọnwụ, ntị ọbụla nụrụ ya, ọbụnadị onye ntị ochi, ga-ebihapụ ihe ọbụla ọ na-eme ma agbara gaba ebe ahụ ozigbo ịga mara ihe na-akpọtụ. E ruo ebe ahụ, ọ bụrụ na isi dara n'ezie, onye ọbụla (ọkachasị ụmụnwaanyị) na-atawara akwa na-ebe iji besuo ozu ahụ. Ụfọdụ n'ime ha ndị enweghị obi na-ebekarịkwuzị ndị mmadụ nwụnahịrị, ọ kachasị ọ bụrụ ezigbo mmadụ, mmadụ ọha, maọbụ onye bụ isi a hụrụ kwaba okpu n'ezinụlọ nwụrụ.

Mgbe nke ahụ gachara, ụmụ okorobịa na-amalite gwube ílì ozigbo ozigbo maka olili ya n'ihi na o nweghị ihe dịka ụlọ nchekwa ozu n'oge ahụ. A sịkwa na ozu e lighị èlì nọ ọdụ ka nsị e kpoghị ekpo, maka na awọ kòó, a nụ isi ya. E lichaa ozu, ọ bụrụ na ọ bụ nke e nweghị ike ịkwa akwa oge ahụ n'ihi otu ihe maọbụ nke ọzọ; a ga-akànye ụbọchị a ga-akwa ya, ma zisasịara ndị nke ahụ metụtara ozi ka ha wee kwadobe, maka na ọ bụ mmadụ ka e ji aka.

Tupu ụbọchị akwamozu ahụ kpọmkwem, ndị inyom, bụ ụmụnwaanyị a lụtara n'ógbè ahụ maọbụ na okirikiri ahụ na-akpata ùkwù nkụ n'otu n'otu ma chute mmiri, buje n'ezinụlọ ahụ dịka enyemaka nke ha nyégárá ndị ahụ na ntụnye nke ha iji hụ na ya bụ akwamozu gàrà nke ọma. Ha na-agakwa rụchasịa ma zàchasịa mbara ebe ahụ niile, ọ na-eti korikori ka ọnwa, maka na ihe dị mma na anya gbara, ọbụnadị n'ebe e nwere ihe dị njọ. Ụmụnwoke na-agakwa gbuo achara na ígù nkwụ, were máá/rụọ ọwọkọ, ma gbochisikwa ebe e kwesiri ime mgbochi n'iji kwadobe ya bụ ebe maka akwamozu ahụ. 

N'echi ya bụ ụbọchị mmemme akwamozu ahụ kpọnkwem, onye ọbụla nọ n'obodo ahụ torugoro ihe e ji mmadụ eme na-apụta n'ùjú ma sonye na ya bụ mmemme anyammiri, ma 'ọnọ n'ụlọ ma ọnọ n'ọhịa' (ndị bi n'obodo ahụ na ndị obodo ahụ bi n'ebe dị iche iche). Nke a bụ n'ihi na ebe onye na-akwa mmadụ ka ọ na-akwa onwe ya. Gidigidi bụ úgwù ézè, maka na ọ zụọ gidigidi, a hụ ọhà, a mara na obodo nwere mmadụ. Nke ahụ wee bụrụ otu e si akwa ozu n'oge mbụ, bụ mgbe elu bụ ala ọsa, oge e ji mmadụ akpọrọ ihe karịa akụ, oge a na-emere ndị na-akwa ozu ebere, nà oge ndị na-akwa ozu na-emekwara onwe ha ebere.

Mana oge ugbua, ihe ndị a adịghịzịkwa otu ha dị na mbụ maka na amamihe kọzịrị ụkọ n'àkpà onye amamihe, ebe uche zuru oke funahịgokwàrà onye àkpà uche. Ihe niile wee na-adazị 'hakoro hakoro' maka na onye ghara ụzọ si ọhịa, ya na osisi ọhịa ana-alụ. Isi ghara èdè kụọ mkpi, ọgịga abụrụ ọgụ na mgba.

Ugbua bụzị oge ọ ga-abụ mmadụ nwụọ, kama a ga-eli ya, e buru ya ga dọbagodi n'ụlọ nchekwa ozu, dịkà a ga-asị na ọ bụghịzị akwa ala ga-ata ya, maọbụ na ọ bụghị n'ala ka a ga-eli ya. Ozu onye ahụ ga-anọzịkwa ebe ahụ wee mụọ ọtụtụ ego, tinyere ọtụtụ ego ndị ọzọ a na-emefuzị n'akwamozu ugbua.

Ugbua bụzịkwa oge mmadụ na-aga ree ala, ree ngwongwo ya, maọbụ mee ihe ndị ọzọ dị iche iche ka o wee nweta ego ọ ga-eji kwa ozu, maka na ndị mmadụ na-amàzị aka onye akwamozu ya ga-aka dàá ụda maọbụ kwòó èkwòó ugbua. O wee dịzie ka a ga-asị na a na-agba asara maọbụ na a na-eme mmemme okpensi. Nke a wee bụrụ n'ihi na ọ gbara anyị bụ ndị Igbo nchezọ, ihe akwamozu pụtara.

Ugbua, ọtụtụ ndị nwere ndị nne na nna, ụmụnne, ndị ọrịa na ndị ogbenye dị iche iche n'ụlọ na-agbachị ha nkịtị ma leghàrá ha anya. Ma ha ana-anwụ ma ha ojì isi aga ije, ma ha èbì n'ụlọ akịrịka maọbụ ụlọ mere ndakpọsị, ma agụ ana-echi ha ọnụ n'ala; ndị nke ha ji ego achọghị ịma. O nweghị onye ọbụla ga-ajụ ha ka ọna-anwụ anwụ ka ọna-ete ete, ma ndị ụlọ ma ndị ama. 

Mana ngwangwa onye ahụ mere kpọgèm n'ala, ọ bụrụ ọnwụ; ị hụ ka ndị be ya ga-esi màlite ịnyụsị ego ka nsị. Ha ga-ebugodi ụzọ kụtuo ụlọ ọkpọkịrị aja ahụ onye ahụ bì na ya, ma rụọ agidigba ụlọ elu ọhụụ ebe ahụ. Ha ga-ekpochasịkwa ebe ọbụla ma were ego tie ya ịgbà, ọ chawàpụ. Ọ dịzie ka a ga-asị na anya onye ahụ adịghị mma ịhụ ụlọ elu maọbụ ihe ọma na ndụ ya. Ụfọdụ na-aga zụọrọ onye ahụ akpati ozu kacha wee galaa ọnụ n'ahịa, dịka a ga-asị na ílì bụ ebe obibi, maọbụ na ego na-dị ha ahụ mma n'ọnwụ. Ụfọdụ ndị ọzọ na-agakwa bìé ego ma ọ bụ n'ihu arụsị ma ọ bụ n'ebe ndị ọzọ, ka ha wee mee ka akwamozu onye nke ha dakarịa ụda, ebe ụfọdụ na-eresisi ihe a gara eji zụpụta ndị dị ndụ, were ego ya kwaa onye nwụrụ anwụ.

Ọbụnadị ndị ụka, ndị obodo, ụmụọkpụ na òtù dị iche iche na-achọzịkwa ka ha were ịtụ ụtụ gbuo onye na-akwa ozu. Nke ahụ wee bụrụ na ala adịghị mma bụ úrù ndị nze. Nke a gosiri n'ebe o doro anya na ndị ụka na ndị otu dị iche iche socha agbanye mmadụ anya n'oke mmefusi ego n'akwamozu site n'óké ụtụ afọ eju akpa ego ha na-ana onye na-akwa ozu. Ha na-ekwechiri ma gbaa isi akwarà nà onye dị ndụ ná-akwá ozu ga-akwụrịrị ụgwọ niile onye nwụrụ anwụ ji; ma e meghị ma ya, ha agaghị akwa ozu ahụ. Obi ebere adịghịzịkwa, ma ya fọdụzie obi nwanne. A na-eji ụtụ wee tichakọchaa onye na-akwa ozu ego dị ya n'aka, ma gwakwa ya ụdị nri na mmanya ọ ga-esi debere ha ụbọchị akwamozu ahụ.

Ndị obodo dị iche iche enweghịzịkwa obi enyemaka ma ya fọdụzie inye onye na-akwa ozu nkwàdo maọbụ agbamume, dịka e si emebụ ya na mbụ oge elu bụ ala ọsa. Ihe ha na-emezị ugbua bụ ịbịa ñụsịrị onye na-akwa ozu mmanya ma risiere ya nri o ji akwọ ndị bịara akwa. Ụfọdụ na-echèkwubezị ụbọchị akwamozu echekwube n'ihi na ọ bụ n'ebe ahụ ka ha ga-eri nri ụtụtụ, nri ehihie na nri abalị ha ụbọchị ahụ tinyere mmanya ha ga-eji gbanyere ya ụgbọ nwamkpi.
Ndi Igbo be anyị ọ bụzị gịnị na-eme?
Ọ bụzị a na-ekwu na ụlọ na-agba ọkụ, anyị ana-awụnyekuru ya abịrịbọ?
Ụfọdụ ndị bi ebe dị iche iche nụ na mmadụ nwụrụ n'obodo ha, ha anaghịdị akpọ n'ekwentị maọbụ zie ozi, ma ya fọdụzịe ịbata ụlọ maka akwamozu ya. Ha na-asị na ihe siri ike, dịka a ga-asị na ha onwe ha agaghị anwụzị anwụ, maọbụ na ọ bụghị mmadụ ga-eli ya.

Ndị Igbo be anyị, ka anyị werenụ uche na-ata akara maka na ihe e mere na-ejighị uche na-aghọ nzuzu n'anya onye akpa uche.
Ya mere, ka anyị burugodinụ ụzọ ghọta na akwamozu abụghị ịgba asara, ime okpensi maọbụ mmemme ekeresimeesi, nke o ji abụ mmemme alụmdinanwunye. Kama, ọ bụ ihe anyammiri na ihe iru uju, maka na ọ bụ mmadụ nwụrụ.

Ka anyị kwụsị ịgbakọ ego na mkpọ chere mgbe mmadụ nwụọrọ ka anyị wee nyere ya aka. Ka anyị kwụsịkwa ịgbakụta onye nke anyị, onye ogbenye, onye ọrịa na ihe ndị ọzọ a ga-eme eme azụ rukwaa mgbe onye ahụ dara n'ụra ọnwụ, anyi e wee malite ịnyụlasị ego elu ka nsị, ịrụ ụlọ elu na ime ihe ndị ọzọ, iji sị na anyị kwara onye ahụ n'ụzọ dara ụda. Akpati abụghị ebe obibi, nke o ji abụ ebe mkpụrụobi onye ahụ ga-anọ ọnọdụ ebighị ebi.

Ihe ndị a niile ga-enyere anyị aka ịhụ na anyị mere ihe ndị anyị kwesiri ime mgbe mmadụ ka na-ekù ume, ma nyekwara anyị aka belata oke mmefù ego anyị na-emefuzị n'akwamozu na n'isi onye nwụrụ anwụ n'oge ugbua. 

Ndị ụka n'aka nke ha kwesikwara iji ire ha gụọ eze ha ọnụ ma welata aka n'ụtụ na ihe oriri dị iche iche ha na-ana n'aka ndị na-akwa ozu tupu ha abịa ya bụ akwamozu, ka ihe wee hara ha na nso. Ka m gharakwa ịsị na ọ bụghịkwanụ ndị ụka ịkwa mmadụ na-ebuga onye ahụ elu igwe. Mana ihe a gba n'aka, e jighị enyo elele ya.

Ọtụtụ ndị mmadụ na-akwazịkwa ụdịrị akwa ụjụ dị iche ugbua ma a na-eme mmemme akwamozu; ị bịazie ebe a na-akwa ozu, ọ dị ka ebe a na-agba nkwụ nwaanyị.

Ya bụ, ndị be anyị, ka onye ọbụla hàá nke o kwesiri ịhà ma mee nke o kwesiri ime, iji hụ na akwamozu gara nke ọma, n'abụghịkwa nke mmefusi ego, maka na a dịghị ama ụma agbasa mmiri n'okwute.
Onye a gwara kwe, ahụ ọzọ, a gwakwa ya, mana onye a gwara agwa ma ọ nụghị anụ, o mee emee, ọ hụ ahụ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484