Buhari Akpọlitela Onyeisi Ndị Uweojii Ọhụrụ

Apr 7, 2021 - 21:44
Apr 7, 2021 - 23:16
 0
Buhari Akpọlitela Onyeisi Ndị Uweojii Ọhụrụ
Izunna Okafor Igbo sị na ọ na-adị mma a sụgide ụtara e hogharịa ọdụ, maka na ọ na-abụ akpụ kwụọ ụdọ, a chọọrọ ya mmiri ịkwọ aka. Ka ọ dị taa onyeisial Nigeria, bụ Muhammadu Buhari agwala onyeisi ndị uweojii, bụ IGP Muhammed Adamu ka o jegodi zuo ike; ma kpọlitekwazie DIG Usman Alkali Baba ka ọ ka jidegodi ọkwa ahụ ugbua ma malitekwa ọrụ ozigbo dịka onyeisi ndị uweojii n'ala Nigeria. Minista na-ahụ maka ihe gbasaara ndị uweojii n'ala Nigeria, bụ Maigari Dingyadi bụ ya mere ka a mara nke a n'okwu ọ gwara ndị nta akụkọ n'isi ụlọọrụ ya dị n'Abuja, bụkwa nke ọ nọrọ na ya wee kọwaa na mkpọlite ahụ a kpọlitere Dingyadi bụkwa nke malitere dịba ìrè ozigbo ozigbo. Ọ dị ncheta na oge ezuola mgbe IGP Adamu kwesiri iji laa ezumike nka, mana onyeisiala Buhari nọrọ n'abalị anọ nke ọnwa February ahọ a wee gbatịwanyekwuo oge ya, sị ya nọkwuo ọnwa atọ. Mana ka o sila dị, oge ya bụ onyeisi ndị uweojii IGP Adamu gara njem nleta n'ebe ndị ahụ ndị omekoome gbara ogige ndị uweojii ọkụ ma kpakwa mkpamkpa dị iche iche na nsonso a na steeti Imo; onyeisiala Buhari, onye nọ na London ugbua, nọrọ ebe ahụ gwa IGP Adamu ka o sizie ebe ahụ laba ezumike nka ya, ma kpọlitekwazie DIG Baba ka ọ nọchie anya ya; n'agbanyeghị na ọ ka fọrọ otu ọnwa ka IGP Adamu nọzuo ọnwa atọ ahụ onyeisiala Buhari nyekwuru ya. N'ajụjụọnụ a gbara ya banyere nke ahụ, Minista Dingyadi mere ka a mara na onyeisiala Buhari ma ihe niile ahụ, ma sịkwa na ọ bụkwa ya (Buhari) ji ikike ịkpọlite maọbụ ịchụtù n'ọkwa, nke na ọ bụ ihe o kpebiri ka o mere, dịka o siri bụrụ ọchịchọ ya na ezi ebumnobi ya banyere ọnọdụ nchekwa ala Nigeria. O kwukwazịrị na onyeisiala Buhari enyela onyeisi uweojiii ọhụrụ ahụ ntụziaka ka o were ịdị uchu, ọnụnụọkụnobi, ọgụgụisi ya nakwa ahụmahụ ya dịka onye maara nke ekwe na-akụ n'ọrụ uweojii were rụọ ọrụ ya nke ọma, karịa ka a tụrụ anya n'aka ya.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484