Oke Ọñụ Adaa, Dịka A Gbapere Ọdụ Ụgbọelu Anambra

Nov 7, 2021 - 21:29
 0


Izunna Okafor dere akụkọ a

O kwòrò èkwò ma zụọ azụọ, dịka imirikiti mmadụ nupùtàrà n'uju wee bịa jiri anya ha gbara ekeresimeesi na mmemme ịgbape ọdụ ụgbọelu mba ụwa ahụ a rụrụ ọhụrụ na steeti Anambra, bụ nke a maara dịka 'Anambra International Cargo and Passenger Airport', ma bụrụkwa nke a rụrụ n'Ụmụeri, dị n'okpuruọchịchị ime-obodo 'Anambra East' nke steeti ahụ.

Mgbape  ọdụ ụgbọelu ahụ bụ nkè mmemme ya dọtàrà ọtụtụ ndị e jị okwu ha agba ìzù n'ime steeti ahụ, ma bụrụkwazie nke gosipụtara na ya bụ ọdụ ụgbọelu akwụrụla chịm, zuo òkè ma dịkwa njikere ịrụ ọrụ n'uju dịka ọdụ okwu na ụgbọelu.

N'okwu ya na mmemme ahụ, aka na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Willie Obianọ, onye ya na nwunye ya bụ Oriakụ Ebelechukwu Obiano soro wee wụchaa na mmemme ahụ, mere ka a mara na ọdụ ụgbọelu ahụ enwetezuola akwụkwọ ikike niile nà nkwàdo niile kwesiri ekwesi site n'aka ụlọọrụ dị icheiche okwu gbasaara ọdụ ụgbọelu dị n'aka, nke na-egosi na o zuola òkè ịbụ ebe ụgbọelu, ndị njem na nwgaahịa ga na-efeli ma na-efetù ebe na mgbe na mgbe

O kelezịkwara onyeisiala Nigeria, bụ Muhammadu Buhari; kelee Minista na-ahụ maka njem ụgbọelu n'ala Nigeria, bụ Hadi Sirika, tínyéré onyeisi ụlọọrụ Nigeria Civil Aviation Authority, bụ Capt. Musa Shuaibu Nuhu, maka agbambọ ha iji hụ na o nwetazuru akwụkwọ ikike niile ọdụ ụgbọelu ahụ kwesiri inwete, ya nà ezi nkwàdo niile ha nyere ogologo oge niile a na-arụ ya bụ ọdụ ụgbọelu, wee ruo mgbe a rụchara ya.

Banyere ihe mere na ụgbọelu kwesiri ịdà ebe ahụ ụbọchị ahụ adàghịzị, Gọvanọ Obianọ kọwàrà na ụlọọrụ ahụ ihe gbasaara ọdụ ụgbọelu na njem ụgbọelu dị n'aka na-atụ anya na ụlọọrụ ụgbọelu niile ahụ e nyegoro ikike ịdà ebe ahụ ga-enwerịrị ngalaba (counter) n'ebe ahụ tupu ha amalite ọrụ ifeli na ifetù n'ebe ahụ, bụkwanụ nke ha enwebèghị tupu ụbọchị ahụ a gbapere ya bụ ọdụ ụgbọelu.

O mere ka a mara na ụgbọelu ndị e nyegoro ikike ịdà na ifeli ebe ahụ ugbua gụnyere ụgbọelu Airpeace , Ibom Air, Dana Air, na Anap Jets, ma kọwaa na a ka ga-enyekwa ndị ọzọ ikike dịka oge na-agawanye n'ihu, maka na ọ na-abụ a na-egbu awaị, ọ ná-atọ ụtọ, a na-abachawanye ji.

Dịka ọ na-akọwa na ndị Anambra bụ ndị na-emete njem nke ọma, nke mezịrị o jiri dị mkpà na ha nwere ọdụ ụgbọelu nke ha, Gọvanọ Obianọ gara n'ihu kwunwòó ya ọzọ na ọchịchị ya rụrụ ọdụ ụgbọelu ahụ n'ime ọnwa iri na ise n'enweghị mmadụ maọbụ ụlọakụ ọbụla o biri kọbọ maọbụ afụ wee bido n'isi, rụgide ya, wee rụchaa ya. 

Ọ kpọpụtasịzịkwara ọtụtụ uru dị icheiche ọdụ ụgbọelu ahụ ga-abara Ndị Anambra, Ndị Igbo, ala Nigeria na mbà Afrịka n'izugbe; kwuo na e nyela mmadụ ruru narị abụọ ọzụzụ  maka ịmàlite ọrụ n'ọdụ ụgbọelu ahụ, ọbụladị dịka o mekwara ka a mara na a ka ga-eji nwanyọ na-ewekwu ụfọdụ ndị mmadụ n'ọrụ n'ebe ahụ n'ọdịnihu.

O kelekwazịrị ndị Anambra maka nkwàdo ha nyere ọchịchị ya nà otu ndọrọndọrọ 'All Progressive Grand Alliance (APGA)', ma kpọkuo ha ka ha gaa n'ihu ime nke ahụ.

Na mbụ n'ozi nnọọ ya, Kọmishọna na-ahụ maka ọrụ n'ime steeti ahụ, bụ Injinia Marcel Ifejiofor nyere nkọwa banyere ọdụ ụgbọelu ahụ, ụfọdụ ego dị icheiche a tụnyere na ya, ogoogo, akụrụngwa na usoro e jiri rụọ ya, ya na ụlọọrụ dị icheiche bịara njem nleta n'ebe ahụ, ma oge a na-arụ ya na oge a rụchara ya, ọkachasị ụlọọrụ ndị ahụ ihe gbasaara ọdụ ụgbọelu dị n'aka, nke gụnyere 'Federal Airport Authority of Nigeria (FAAN)', Ụlọọrụ 'Nigeria Civil Aviation Authority (NCAA)' na ụlọọrụ ndị ọzọ bịara ebe ahụ ma kwupụtakwa afọojuju ha banyere ihe ha hụrụ, ma gbakwa akaebe na ya bụ ọdụ ụgbụelu adịla njikere maka njem ụgbọelu.

N'okwu nke ya n'ebe ahụ, Ọkaokwu ụlọ ọgbakọ omeiwu steeti Anambra, bụ Maazị Uchenna Okafor kọwara na ọ bụ ihe ọke ọñụ na steeti Anambra enweela ọdụ ụgbọelu, bụkwa ọdụ ụgbọelu mba ụwa. O kelezịkwara ọchịchị steeti Anambra maka ime ka nrọ ahụ a rọbara kemgbe bịa na mmezu; ọbụladị dịka ọ kpọpụtasịkwara ụfọdụ ụzọ dị icheiche ọdụ ụgbọelu ahụ ga-esi kwàlite ọnọdụ akụnụba na ọnọdụ mmepe steeti ahụ.
 
Ịgbape ọdụ ụgbọelu ahụ kpọmkwem bụ nke e mere site n'aka Bishọọpụ Paulinus Ezeokafor nke ụka katọliiki na Dayọsiisi Awka. 

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484