Ụwa Agbaala Ezi Àmà, Dịka Pa Chukwumalu Malitere Njem Ikpeazụ Ya n'Ebenator

Apr 14, 2021 - 20:33
Apr 14, 2021 - 21:19
 0
Ụwa Agbaala Ezi Àmà, Dịka Pa Chukwumalu Malitere Njem Ikpeazụ Ya n'Ebenator
Chieloka Okoye (n'etiti), Celestine Chukwumalu (onye nke atọ n'aka ekpe); Michael Okafor-Ezelie (nke atọ n'aka nri); Chioma Chukwumalu (nke abụọ n'aka nri) na ọtụtụ ndị ọzọ sonyere na mmemme akwamozu ahụ

Izunna Okafor dere akụkọ a 

Ọnwụ bụ ọzọ a mà na onye ọbụla ga-echirịrị, ma bụrụkwa òkù a ma na onye ọbụla dị ndụ ga-azarịrị chi ya oge ọbụla o jiri kpọọ ya.

Nke a bụ isi sekpụ ntị n'okwuchukwu mmemme ụka akwamozu Papa Sylvester Chukwumalu bụ nke weere ọnọdụ na nsonso a n'ezinụlọ be ya dị n'Ebenatọr, n'okpuru ọchịchị ime obodo 'Nnewi South' nke steeti Anambra. 

N'okwuchukwu ya n'ebe ahụ, 'Rev. Fr.' Johnpaul Onyiloha, nke ụlọụka 'St. Matthew's Catholic Church, Ebenator' kọwàrà mkpa ọ dị mmadụ ibi ezi ndụ n'ụwa ka o wee keta alaeze Chineke, ọbụladị dịka ọ gbàrà akaebe na Papa Chukwumalu bìrì ezi ndụ n'ụwa ma jeere Chineke na mmadụ ozi, tupu ọ lakwuru Chi ya.

Dịka ọ na-agba ezi àmà maka ndụ Pa Chukwumalu, 'Fr.' Ọnyịlọha kasìrì ndị na-eru uju ọnwụ ya obi, ma dụkwa ha ọdụ ka ha ñòmie ma gbaso ezi nzọụkwụ nna ha, bụ onye o kwuru na ọ nọrọ ogologo ndụ ma nwekwa ọtụtụ ezi ihe mmụta jupụtara na ndụ ya. 

N'okwu ya oge ndị ntaakụkọ na-agba ya ajụjụọnụ, diọkpara Pa Sylvester Chukwumalu, bụ Maazị Celestine Chukwumalu kọwàrà nna ya dịka onye udo na nwoke obiọma jupụtara n'amamihe.

Ọ sị, "Nna m bụ onye obiebere, nwoke obiọma, onye udo na onye nwere ịhụnanya n'ebe mmadụ ibe ya nọ. O nweghị ezigbo ihe ị ga-arịọ ya ọ gaghị emere gị. Na ndụ ya niile, ọbụla ma n'ọnwụ ya ugbua, ụwa na-agbara ya akaebe na ọ bụ ezigbo mmadụ." 

Dịka ọ na-akọwa na nna ya hapụụrụ ha ọtụtụ ezi ihe nñòmi, ọ gakwara n'ihu kwuo na otu ihe ọ gaghị echefu echefu banyere ndụ nna ya bụ na ọ tọọrọ ya ezi ụkpụrụ ọ ga-agbasò wee kèta ndụ ebighịebi.

Na ntụnye nke ya, nwa nwanne Papa Sylvester, bụ Maazị Raphael Chukwumalu kpọpụtasịrị ihe dị iche iche agụnwoke ahụ mepụtara mgbe ọ dị ndụ, ọkwá dị iche iche o jiri, ezi nzọụkwụ ọ tọgbọọrọ ha, nà ezi ihe dị iche iche ọ hapụụrụ ha wee laa mmụọ, ma kpee ka mkpụrụobi ya zuo ike na ndokwa n'ime Chineke.

N'akụkụ nke ya, otu onye ọzọ akwamozu na ọnwụ nwoke ahụ metụtara, bụ Maazị Chukwuemeka Michael Okafor-Ezelie, kèlèrè Chineke maka ezi ndụ o biri, ogologo ndụ o nyere ya n'ụwa, na etu o siri mee ka akwamozu ya gaa siriri-wèrèrè n'enweghị ọdachi ọbụla.

O kelekwazịrị ndị siri ebe dị iche iche wee bịa sonyere ha na mmemme akwamozu ahụ nà ndị ọzọ nyere aka n'otu ụzọ maọbụ nke ọzọ iji hụ na ọ gara nke ọma, ma kpee ka Chineke kwụghachi ha mmaji kwuru mmaji.

Mmemme akwamozu ahụ dọtàrà ọtụtụ ndị dị iche iche, tinyere Onyeisioche nchere oge n'okpuru ọchịchị 'Nnewi South', bụ Maazị Chieloka Henry Okoye, na ọtụtụ ndị ọzọ.

A mụrụ Sylvester Orjiakor Chukwumalu n'ahọ 1913 dịka nwa nke anọ nke nne na nna ya bụ Maazị Chukwmalu na Lọọlọ Dibianeri Chukwumalu; ma ogologo ndụ ya niile jupụtara n'akụkọ ọgbụgba ezi ama, wee ruo ụbọchị ọnwụ ya, ka ọ gbàchàrà ahọ otu narị na asaa (107). 

Tupuu ọnwụ ya, Papa Chukwumalụ, ónyé mụrụ ụmụ asatọ, jèèrè Chineke na mmadụ ozi n'ụzọ dị iche iche, jie ọkwa n'ogoogo dị iche iche (ma n'obodo ma n'ụlọụka), ma bụrụkwa okenyè tọchara mmadụ niile n'ụlọụka St. Mattew's Catholic Church' na n'obodo ya bụ Ebenator niile n'izugbe.

Ọ dara n'ụra ọnwụ n'ime Onyenweanyị ka o kpechara ekpere ụtụtụ ya n'ụtụtụ ụbọchị Mọnde, abalị iri abụọ na ótù nke ọnwa Disembà ahọ 2020. 

Ka mkpụrụobi ya zuru ike na ndokwa.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484