Mama Chimamanda Adichie Anwụọla

Mar 6, 2021 - 16:04
 0
Mama Chimamanda Adichie Anwụọla
Ifeọma Grace Adịchie

 

Izunna Okafor dere akụkọ a

Ka ọ gachara ihe dịka ọnwa ise o jiri kwachaa nna ya, ihe mgbu ọzọ dakwasara Chimamanda Adịchie, bụ ode akwụkwọ na-ewu ewu na mba ụwa, dịka nne ya bụ Oriakụ Grace Ifeoma Adịchie nwụkwàrà.

Ya bụ nwaanyị gbara ahọ iri asaa na asatọ ka e kwuru na ọ nwụrụ n'Ọka (Awka) bụ isi obodo steeti Anambra ụbọchị Mọnde, abalị mbụ nke ọnwa Maachi ahọ a, bụkwa ụbọchị ncheta ọmụmụ di ya bụ Ọkammụta James Nwoye Adịchie lagoro mmụọ.

Tupu ọnwụ ya, Oriakụ Grace Ifeọma Adịchie bụ onye nhàzi, bụrụ nwaanyị mbụ jiri ọkwa dịka Rejistra (Registrar) nke Mahadum Nigeria dị na Nsukka, ma sorokwa n'òtù nlekọta nke ụlọọrụ Anambra State Universal Basic Education Board, ASUBEB.

N'okwu ya banyere nke ahụ, aka na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Willie Obiano gosipụtara obi mwute ya banyere akụkọ ọnwụ nwaanyị ahụ, bụ nke ọ kọwara dịka ihe mgbawa obì nyegara ezinụlọ ahụ, n'ihi na o techabeghị aka ha jiri kwaa nna, bụ onye e mere mmemme akwamozu ya n'abalị iteghete nke ọnwa Ọktooba ahọ gara aga, ka ọ nwụchara n'abalị iri nke ọnwa Juunu ahọ ahụ.

Ọ kọwara nwaanyị ahụ dịka onye biri ezi ndụ, rụọ ezi ọrụ, ma jirikwa ihe o nwere, ọgụgụisi ya na ndụ ya wee jeere Chineke na ụmụ mmadụ ozi oge ọ nọ ndụ n'ụwa. 

Ọ kasizịrị ezinụlọ ndị be Adịchie obi maka ọnwụ ezi nne ha ahụ, ma kpee ka Chineke nabàta ma nye mkpụrụobi ya ezumike udo n'eluigwe.

Ndị Oriakụ Grace Ifeoma Adichie hapụrụ ná-érú ụjụ ọnwụ ya gụnyere: Ijeoma Adichie, Uchenna Adichie, Chuks Adichie, Okey Adichie, Chimamanda Adichie, na Kenechukwu Adichie (ụmụ ya), tinyere ụmụ-ụmụ ya, ndị ọgọ ya na ụmụnne ha ndị ọzọ.

Ezinụlọ ahụ ga-ekwuzị ka mmemme akwmozu ya ga-esizị wee gaa n'oge kwesiri ekwesi.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484