Ọba Akwụkwọ Anambra Emerùbela Izu-ụka Ọba Akwụkwọ Nke Ahọ 2019

Nov 27, 2019 - 23:09
Jan 24, 2021 - 04:21
 0
Ọba Akwụkwọ Anambra Emerùbela Izu-ụka Ọba Akwụkwọ Nke Ahọ 2019

Izunna Okafor, Awka

Ọ bụ nnọ oge nkuzi na nkọwa pụrụ iche, dịka ọba akwụkwọ steeti Anambra, bụ nke a maara dịka ọba akwụkwọ Ọkammụta Kenneth Dike dị n'Awka, sònyèèrè ndị òtù ha n'imerùbè mmemme izu-ụka ọba akwụkwọ nke ahọ 2019.

', '

Ya bụ mmemme nke were otu izu-ụka bụ nke ha jiri ihe mmemme dị iche iche wee merùbe, ma bụrụkwa nke a nọrọ na ya wee nye nkuzi ma gagharịakwa n'ụfọdụ ụlọ ọrụ na n'ebe ndị ọzọ dị iche iche n'ịkọwara ndị mmadụ urù ọba akwụkwọ bàrà na ndụ mmadụ nà na mmepe obodo.

N'okwu ya oge ọ na-anabàta ndị ahụ n'isi ụlọ ọrụ ya, onyeisi ọba akwụkwọ mahadum Nnamdị Azikiwe dị n'Awka, bụ Ọkammụta Obiọra Nwosu kọwara oba akwụkwọ dịka ụlọ mmụta nakwa ebe nchekwa ozi, ma kwuokwa na ọba akwụkwọ nwèrè ọrụ pụrụ iche dịịrị ya n'ịkwàlite mmepe tọrọ àtọ n'obodo.

Ọ gbara akaebe na gọọmenti etiti na-agbasi mbọ ike n'ịkwàlite ọba akwụkwọ na ọrụ dịịrị ya n'ala Nigeria, sịkwa na Gọvanọ Obianọ na-emekwa otu ihe ahụ, bụ nke o kwùrù na o meela ka ọba akwụkwọ kwụdosie ike n'ịrụ ọrụ ya otu o kwesiri, ma kelekwazie ha maka ezi nkwàdo ha na ịdị uchu n'ihe metụtara ịkwàlite ọba akwụkwọ.

Ka ọ na-akọwàpụta isiokwu mmemme ahụ nke ahọ a dịka "Library Services For Sustainable Development In Nigeria", nke pụtara "Ọba Akwụkwọ Ịrụ Ọrụ Maka Mmepe Ala Nigeria" (ma a tụgharịa ya); onyeisi ọba akwụkwọ steeti Anambra, bụ Dọkịta Nkechi Udeze mere ka a mara na izu-ụka ọba akwụkwọ bụ izu-ụka pụrụ iche a mapụtara maka imerùbè ọba akwụkwọ na ịkuziri ọhaneze urù ọba akwụkwọ bàrà, kwà ahọ ọbụla.

O kwuru na ọba akwụkwọ, dịka ụlọ mmụta, na-eme ka ndị mmadụ nweta ozi nwere ike inyere ha aka iji chekwaba, gbakwụnyekwuo ma kwalite ihe ha mụtara, ihe ha mepụtara nakwa ihe ha mààrà, n'ihi na, dịka o siri kwuo, ụwa na-eme ntụgharị, nke mezịrị o jiri dị mkpà na mmadụ ọbụla ga na-agụsi akwụkwọ ike ma na-amụtakwa ihe ọhụrụ, iji hụ na ụwà agbanahịghị ya n'ọsọ, n'ihi mgbanwè.

Okwètèkwara na ọba akwụkwọ na-agba mbọ n'ịrụ ọrụ dịịrị ya, ma sị na n'agbànyeghị nke ahụ, na o kwesiri ka a gbasikwuo mbọ ike, ọ kachasị ịhụ na a na-akwàlite usoro mmụta nakwa ihe ndị mmadụ na-agụ n'ebe ahụ, mee ka ọ na-adịwanye ọhụụ kwa ụbọchị, iji nye aka na nkwàlite mmụta nakwa mmepe obodo.

Izu-ụka ọba akwụkwọ bụ mmemme a na-eme kwà ahọ ọbụla n'ala Nigeria, iji merùbe ọrụ ọma dị iche iche ọba akwụkwọ na ndị ọrụ ụlọ ọba akwụkwọ na-arụ n'ịkwàlite mmụta, nchọcha nakwa mmepe obodo n'izugbe.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.