Obianọ Eguzobela Òtù Atụmatụ Ọrụ Mmepe Anambra Maka Ahọ Iri Ise Na-Abịa Abịa

Nov 27, 2019 - 23:11
Jan 24, 2021 - 04:16
 0
Obianọ Eguzobela Òtù Atụmatụ Ọrụ Mmepe Anambra Maka Ahọ Iri Ise Na-Abịa Abịa

Izunna Okafor, Awka

Igbo sị na nwaanyị maara ihe na-ebido n'afọ ime wee tụtụkọba ihe nwa, maka nchebiri ụbọchị ọmụmụ ya. N'ịgbaso nke a, aka na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Willie Obianọ eguzobela otu pụrụ iche ga-ahụ bànyere atụmatụ ọrụ mmepe steeti ahụ maka ahọ iri ise na-abịa abịa, bụ ahọ 2070, bụ nke a kpọrọ "Anambra Vision 2070 Development Plan Committee."

Iguzobe ndị a nakwa ime ka ha mara ọrụ chere ha n'ihu bụ nke weere ọnọdụ n'ebe obibi Gọvanọ dị n'Amawbịa, ma bụrụkwa nke dọtara ndị dị iche iche ọnụ na-eru n'okwu na steeti ahụ.

N'okwu ya ka ọ na-egùzobe ya bụ òtu, Gọvanọ Obianọ chètààrà ha na nhọrọ a họọrọ ha adàbèrèghị n'otu ndọrọ-ndọrọ ọchịchị, kama na a hụtàrà ha dịka ndị maara nke ekwe na-akụ, ma gwazie ha ka ha mapụta atụmatụ mmepe ga-edu steeti ahụ ruo ahọ iri ise na-abịa abịa.

Ọ dụrụ ha ka ha tụpụta atụmatụ nlegara anya na okwu nlegara anya na steeti ahụ, chọpụtasịa ngalaba dị iche iche steeti ahụ ga-etinye uchu, usoro mmepe a ga-agbaso, ihe ndị pụrụ ịkwàlitekwu mmepe na ọganihu, tinyere ebe ndị ọzọ dị iche iche ha ga-elebàra anya; ọbụnadị dịka ọ kọwara na ya bụ ọmarịcha atụmatụ mmepe bụ maka nchekwa, ọganihu na obi ụtọ Ndị Anambra.

N'okwu nke ya, otu onye so na ya bụ òtù, ma bụrụkwa odeakwụkwọ izugbe steeti ahụ, bụ Ọkammụta Solo Chukwulobelụ kpọpụtasịrị ọrụ ndị ahụ chere ha n'ihu ma kèé ha n'ọgbà n'ọgbà dịka nke ga-ewe nwa mgbe nta, nke ga-ewe oge etochàghị aka, nakwa nke ga-ewe ogologo oge iji mezupụta, ma kwupụtaziekwa ezi olileanya o nwèrè na ọchịchị dị iche iche ga-ewere ọnọdụ n'ọdịnihu na steeti ahụ ga-ahụta atụmatụ ahụ dịka ihe bara oke uru, ma gbasòkwa ya n'ịrụ ọrụ ha.

Ka ọ na-ekele ọchịchị steeti ahụ maka ya bụ ọmarịcha atụmatụ na inye ha ohèrè ijere steeti ahụ ozi; nwa amadi ahụ jibụrụ ọkwa dịka onyeisi ụlọ ọba ego ala Nigeria n'oge mbụ, ma bụrụkwa onyeisi oche òtù ọhụrụ ahụ e guzòbère, bụ Ọkammụta Chukwuma Soludo, kwèrè nkwà na ya na ndị òtù ya ga-arụsi ọrụ ike, ma mezùpụta ezi ebumnobi ahụ e jiri guzobe ya bụ atụmatụ, site n'inye aka Chineke.

Ndị ọzọ so n'òtù ahụ gụnyèrè onyeisi ndị ọrụ nyegara Gọvanọ, bụ Maazị Primus Ọdịlị; Kọmishọna na-ahụ maka agụmakwụkwọ na steeti ahụ, bụ Ọkammụta Azụka Omenụgha; Kọmishọna na-ahụ maka mgbasa osi na ịkụziri ọhaneze ihe ha kwèsiri ịma, bụ Maazị C-Don Adịnụba, na ògbò ya nke na-ahụ maka akụnụba na atụmatụ ego ọrụ, bụ Maazị Mark Okoye. Ndị ọzọ gụnyèrè Oriakụ Uju Nwọgụ, Dọkịta Ikem Odumodu, Maazị Uche Nwọrah, tinyere ndị ọzọ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.