Gọọmenti Anambra akụtùóla ụlọ ahụ tigburu otù nwatakịrị n'Onịtsha

May 29, 2020 - 06:41
Jan 22, 2021 - 20:36
 0
Gọọmenti Anambra akụtùóla ụlọ ahụ tigburu otù nwatakịrị n'Onịtsha

Izunna Okafor, Awka

Dịka o kwere na nkwà, gọọmenti steeti Anambra akụtùóla ụlọ ahụ tigburu ótù nwata nwaanyị nọ n'agbata ahọ asatọ mgbe gara aga na mpaghara Modebe Avenue dị n'Ọnịtsha.

Ọrụ ịkụtù ụlọ ahụ bụ nke a bàgidere site n'aka ụlọọrụ ahụ na-ahụ maka atụmatụ ewumewu na steeti ahụ, bụ 'Anambra State Physical Planning Board', ma bụrụkwa nke onyeisi oche ụlọọrụ ahụ, bụ Maazị Chike Maduekwe sonyere na ya.

Ọ dị ncheta na Ka Ọ Dị Taa kọrọ akụkọ na mgbe gara aga banyere ụlọ ótù ogìdì ya dapụrụ, wee tigbuo otù nwatakịrị nwaanyị n'abalị asatọ nke ọnwa Eprel ahọ a.

Nke ahụ mezịrị ndị gara ebe ahụ ụbọchị ahụ (nke gụnyere onye ji ọkwa dịka onyeisi ụlọọrụ ASPPB, Maazị Anene Nwabufor; nnukwu onye enyemaka pụrụ iche nye Gọvanọ n'ihe gbasaara nlekọta ala na atụmatụ ewumewu (bụ SSA, Monitoring and Supervision on Lands and Physical Planning) Oriakụ Joy Nneli, na ndị ọzọ soro gaa ebe ahụ) jiri kaa ya bụ ụlọ ákàrà nkutù ma kwuwakwa na a ga-akụtù ya.

Ndị ahụ sikwara n'ebe ahụ wee gaa ụfọdụ ebe ndị ọzọ a rụrụ ụlọ n'ebe ezighị ezi n'okpopru ọchịchị Ihiala, nke gụnyere Azia, Uzoawka na Okija, bụkwa ebe ụfọdụ ndị na-arụ ọrụ ebe ahụ chọrọ ịwakpò ha; e wee nwụchikọọ ha niile maka ịhafè ha n'aka ndị uweojii.

N'okwu ya banyere ọrụ ahụ, Maazị Nwabufor katọrọ etu ọtụtụ ndị mmadụ si abàgide n'ịrụ ụlọ etu na ebe ọbụla masịrị ha n'ime steeti ahụ n'ebughị ụzọ nata ikike maọbụ nweta nkwàdo site n'aka gọọmenti; ma sizie n'ụzọ dị etu ahụ na-etinye ndụ na akụnụba mmadụ ibe ha n'ihe egwù na ihe izè ndụ.

O mere ka a mara na ha na-ebu ụzọ zigara ndị nwe ụlọ ọbụla a rụrụ n'ebe ezighị ezi ozi banyere nke ahụ tupu ha amalite ime ihe ọbụla ha kpebiri ime n'ebe ahụ.

O jikwazịrị ohere ahụ kpọkuo ndị na-ewu ewumewu na onye ọbụla chọrọ ịrụ ụlọ ka o buru ụzọ nweta nkwàdo na akwụkwọ ikike n'ụlọọrụ ahụ tupu ọ malite ime nke ahụ, maka ịkwa 'ngara m mara' n'oge ikpeazụ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.