Eze Ọdịnala Nsugbe Eguzobela Ndị Ichie Ga-Eso Ya Rụọ Ọrụ

Jun 3, 2020 - 15:47
Jan 24, 2021 - 15:49
 0
Eze Ọdịnala Nsugbe Eguzobela Ndị Ichie Ga-Eso Ya Rụọ Ọrụ

By Izunna Okafor, Awka, Nigeria | Igbo Radio | News in Igbo Language

Igbo sị na ótù osisi anaghịa eme ọhịa, ma sịkwa na ótù onye anaghị achụ ngwere mgbahige aja.

N'ịgbaso nke a, eze ọdịnala obodo Nsugbe, bụ Igwe Victor Ntoka eguzobela ndị ichie ọhụụ ha na ya ga-eso wee rụọ ọrụ idu obodo ahụ.

Mmemme iguzobe ndị ichie ahụ bụ nke weere ọnọdụ n'Amagu Nsugbe dị n'okpuru ọchịchị ime obodo Anambra East, ma bụrụkwa nke dọtara ndị dị iche iche e ji okwu ha agba izu na steeti, nke gụnyere nnukwu onye enyemaka pụrụ iche nye Gọvanọ Obianọ n'ihe gbasaara ọdụ ụgbọala na ahịa, bụ Maazị CY Obiano; eze ọdịnala obodo Ụmụọba Anam, bụ Igwe George Ekwealor, tinyere ụfọdụ ndị ọzọ.

N'okwu ya oge ọ na-anabata ndị ahụ ịbụ ndị ndị ichie ya, Igwe Ntoka kọwara na ọ bụ mmasị ya, kemgbe e jiri guzobe ya dịka eze ọdịnala obodo ahụ, iguzobe ndị ichie ga-eso ya wee rụọ ọrụ, ọkachasị iji kwàlite ezi ọchịchị, mmepe na ọganihu nke obodo ahụ.

O kèlèrè aka na-achị steeti Anambra bụ Gọvanọ Willie Obianọ maka ịkwàdo ndị eze ọdịnala, ọchịchị obodo na mmepe ime-ime obodo, bụ nke mụtagoro ezi ọtụtụ mpụtara a na-ahụ anya n'ebe dị iche iche n'ime steeti ahụ, tinyere obodo Nsugbe.

Ọ kpọkùkwazịrị ndị ichie ahụ ka ha were eziokwu na ịkwụba aka ọtọ wee rụọ ọrụ ha nke ọma na etu o siri kwesiri, iji kwalite ezi ọnọdụ mmepe, ọganihu na udo tọrọ àtọ na Nsugbe.

Na ntụnye nke ya, onyeisi ọchịchị obodo ahụ, bụ Maazị Osita Nwoye kọwapụtara na obi bụ ya sọ añụrị banyere mmepe ọhụụ na ọganihu a na-ahụtazị n'ime obodo ahụ kemgbe. O mere ka a mara na obodo ahụ anọọla ihe karịrị ahọ asatọ n'enweghị ndị ichie, ma sịzie na ugbua, na obodo ahụ ga-amalitezị ịgawanye n'ihu na iji otu olu ekwu okwu, karịa ka ọ dị n'oge mbụ. Ọ dụkwazịrị ndị ichie ahụ ka ha gbado anya n'ọrụ ma gharakwa ikwe ka ihe ọbụla kpasaa ha anya, maọbụ weta nkewa n'etiti ha.

N'okwu nke ya, otu nwaafọ ododo ahụ ọnụ na-eru n'okwu, bụ Maazị Emmanuel Agu kọwara nguzobe ahụ e guzobere ndị ichie ahụ dịka nke magburu onwe ya, mee ka a mara na ọ na-enye aka n'ụzọ pụrụ iche n'ime ka ezi ihe gaa n'ihu ịchawapụta n'obodo ahụ, ma kpọkukwazie ndị Nsugbe ka ha gaa n'ihu inye eze ọdịnala ahụ na ndị ichie ya nkwàdo zuru òkè.

Na nzaghachi ya n'aha ndị ichie ahụ, Onoowu ọhụụ obodo ahụ, bụ Maazị Mike Ilobi kelere Igwe Ntoka maka ịhụta ha dịka ndị kwesiri ntụkwasị obi na ndị tozuru òkè iji ọkwa ahụ dị elu, ma kwezie nkwa iji ohere ọma ahụ wee tụnye ụtụ nke ha n'ụzọ pụrụ iche n'ịkwalite ezi ọchịchị, mmepe, udo na ọganihu  nke obodo ahụ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.