A Gbapeela Ahịa Akụrụngwa E Ji Arụ Ụlọ n'Ogidi

Nov 27, 2019 - 23:13
Jan 24, 2021 - 04:08
 0
A Gbapeela Ahịa Akụrụngwa E Ji Arụ Ụlọ n'Ogidi

Izunna Okafor, Awka

Oke ọñụ dara na nso-nso a n'Ogidi dị n'okpuru ọchịchị Idemili North nke steeti Anambra, dịka gọọmenti steeti ahụ gbàpèrè agadaga ụlọ ahịa ọhụrụ bụ ebe a na-ere akụrụngwa e ji ewu ụlọ. Ya bụ ahịa, bụ nke a kpọrọ "Building Materials International Market, Ogidi" bụ nke nwere ọnụ ụlọ ahịa karịrị otu puku n'ọnụ ọgụgụ, ma bụrụkwa nke a rụrụ site na njikọ aka ndị na-azụ ahịa ebe ahụ, iji mee ka ọnọdụ kawanyere ha mma, ha na ndị na-abịa azụ ha ahịa.

N'okwu ya oge ọ na-agbape ya bụ ahịa, aka na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Willie Obianọ, nke onye nọchitere anya bụ osote ya, bụ Dọkịta Nkem Okeke kelere ndị ahụ wubére ya bụ agadaga ụlọ ahịa maka ezi agbambọ ha, bụ nke o kwuru na o nwere ezi ọdịnihu nye nkwàlite akụnụba steeti ahụ, ọbụnadị dịka ọ kpọkùrù ha ka ha gbakwa mbọ na-atụ ụtụ isi ha mgbe na otu o kwèsìrì, iji nyere gọọmenti aka n'ịrụ ọrụ ya otu o siri kwesi, ọ kachasị nyegara ha bụ ndị na-azụ ahịa na ụmụafọ steeti ahụ n'izugbe.

Ya bụ aka na-achị achị jikwàrà ohèrè ahụ wee kpọkuo Ndị Anambra nọ n'ebe dị iche iche ka ha wèlataruo akụnụba ha ụlọ ma tụnye ụtụ nke ha n'ịkwàlite mmepe steeti ahụ, site n'iwunye ụlọ mmepụta ngwọahịa nà ụlọ ọrụ ndị ọzọ na steeti ahụ, bụkwa nke o kwuru na ọ ga-enyekwa aka kewàpụtara ndị ntorobịa ohèrè ọrụ, ma kwàlitekwa ọnọdụ akụnụba na ego a na-enweta n'ime steeti Anambra.

Na ntụnye nke ya, Kọmishọna na-ahụ maka azụmahịa na ịtụ mgbere ahịa na steeti Anambra, bụ Maazị Uchenna Okafọr kèlèrè ọchịchị nọ ugbu a na steeti ahụ maka ezi ọrụ ya n'ịkwàlite ọnọdụ dị larị maka azụmahịa, ọ kachasị n'ịkwàlìtè ọnọdụ nchekwa steeti ahụ, bụzị nke o kwuru na o meela ka Anambra bụrụ ebe mbụ ndị oji ego achụ ego na-elegara anya n'ihe gbasaara iwunye akụnụba.

Ọ gakwazịrị n'ihu bunye ndị ahịa ahụ ụkpa ekele maka ya bụ ezi ọrụ ha rụpụtara nakwa njikọ aka ha, ma dụọ ha ka gbaa mbọ hụ na ya bụ ezi mmekọrịta, udo na ịdịnotu dị n'etiti ha ga-adị ọkpụtọrọkpụ.

Na mbụ n'ozi ọ gụpụtàra, onyeisi òtù ahụ jikọtara ndị ahụ na-azụ ahịa n'ebe ahụ, bụ Maazị Jude Nwankwọ tòrò Gọvanọ Obianọ maka itinye uchu n'ihe metụtara azụmahịa na ndị na-azụ ahịa na steeti ahụ, ma nyekwazie ya owuwe anya na ha ga-aga n'ihu ịtụ ụtụ isi ha oge na otu o kwèsiri. Ọ rịọkwazịrị gọọmenti steeti ahụ doo ka ọ rụọrọ ha ụzọ ahụ siri ụlọikpe ukwu dị n'Ogidi wee gaa n'ahịa ahụ, iji mee ka ọnọdụ dịrị ha na ndị na-azụ ha ahịa n'ebe ahụ mfe ibupu maọbụ ibubàtà ahịa.

Ndị dị iche iche sonyere na mmemme ahụ gụnyèrè eze ọdịnala Ogidi, bụ Igwe Alex Ụzọr Ọnyịdo; ògbò ya nke Ụmụawụlụ, bụ Igwe Joel Egwuọnwụ, tinyere ndị nọ dịka nna ndụmọdụ nke ya bụ otu jikọtara ndị ahịa, nke gụnyere Maazị Silas Ejeabọcha na Maazị Ben Okafọr, tinyere ọtụtụ ndị ọzọ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.