N'Anambra, NSCDC Ejidela Mmadụ Abụọ Maka Mmanụọkụ Adịgboloja

Jul 13, 2021 - 21:31
 0
N'Anambra, NSCDC Ejidela Mmadụ Abụọ Maka Mmanụọkụ Adịgboloja

Izunna Okafor dere akụkọ a

Ndị ụlọọrụ nchekwa a maara dịka 'Nigeria Security and Civil Defence Corps' (NSCDC), ngalaba steeti Anambra, ejidela ma kpụgharịa mmadụ abụọ maka izuru mmanụọkụ adịgboloja (kerosene) na ịkpà nkàtà ịchọ ka ha ga-esi bupù ma ree ya.

Onyeisi ụlọọrụ NSCDC na steeti Anambra, bụ Maazị Vincent Ogu kwupụtara nke a n'okwu ọ gwara ndị ntaakụkọ n'isi ụlọọrụ ahụ dị n'Awka oge ọ na-akpụgharị mmadụ abụọ ahụ

O nyere aha mmadụ abụọ ahụ dịka Chukwuebuka Kalu and Solomọn Ogbonna, ma mee ka a mara na ọ bụ ndị ngalaba ụlọọrụ ya na-ahụ maka ibu agha megide imebisi ihe (bụ ngalaba 'Anti-Vandalism Squad') gbachibidòrò ma nwụchikọọ ndị ahụ na mpaghara okporoụzọ awara-awara ahụ siri Onitsha gaa Owerri, n'Ihiala dị n'okpuru ọchịchị ime obodo Ihiala.

O kwuru na ndị ọrụ ya ahụ nwụchìkọkwàrà ụgbọala nwere akara steeti Lagos 827YD ka o bùkwà mmanụ ụgbọala dịzụụl n'Ọkịja dịkwa n'okpuru ọchịchị ime obodo Ihiala ahụ; ndị ahụ wee bihapụ ma ụgbọala ha ma mmanụ dịzụụl ahụ ha bu, wee rie mbọmbọ ọsọ, nke na-egosi na aka ha adịghị ọcha banyere ya bụ mmanụ ha bu n'ụgbọala.

Dịka ọ na-enyekwu nkọwa banyere arụrụala ahụ ndị ahụ, Maazị Ọgụ katọrọ mpụ na arụrụala na-arịzị ibe ya elu ugbua na mpaghara ebe dị iche iche n'ala Nigeria, ma kpọkuo ndị ọbụla na-etinye aka n'ihe na-eweta ala adịghị mma ka ha kwakọrọ ngwongwo ha si na steeti ahụ pụọ, maka na ọnọdụ adịrịghị ha na steeti ahụ. 

Ọ gara n'ihu kwuo na ụlọọrụ ya etinyesiela ndị ọrụ, akụrụngwa na atụmatụ nlekọta bụ ịgbà na mpaghara ebe dị iche iche e si abata ma na-apụ na steeti ahụ, n'esepughị aka, ma n'ụtụtụ ma n'anyasị, kwà ụbọchị ọbụla.

O kelere ọchịchị steeti Anambra nà aka na-achị steeti ahụ bụ Gọvanọ Willie Obianọ maka mbọ dị iche iche ọ gbagoro na ezi ihe dị iche iche ọ rụgoro n'ịkwàlite ọnọdọ nchekwa steeti ahụ, ọkachadị site n'ịkwàdò ndị ọrụ nchekwa na ụlọọrụ nchekwa niile dị na steeti ahụ ma kpọkuo ya ka o jisie ike n'ọrụ; ọbụladị dịka o kwere nkwà na ụlọọrụ ya agaghị ada mbà n'ọrụ.

N'ajụjụọnụ a gbara ya, otu onye n'ime mmadụ abụọ ahụ e jidere, bụ Maazị Solomon Ogbonna kwetara ma kwuo n'ezie na ihe o mere adịghị mma, ma rịọkwazie ka a agbaghara ya.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484