Ndị Uweojii Azọpụtala Agadi Nwaanyị Ndị Ntọ Tọ̀ọ̀rọ̀, Jide Otu Onye n'Ime Ha

Dec 6, 2021 - 22:04
Dec 6, 2021 - 22:30
 0
Ndị Uweojii Azọpụtala Agadi Nwaanyị Ndị Ntọ Tọ̀ọ̀rọ̀, Jide Otu Onye n'Ime Ha

Izunna Okafor dere akụkọ a


Ndị ọrụ uweojii na steeti Delta steeti anapụtala otu nwanyị dị afọ iri isii na atọ ndị ntọ tọọrọ ma jidekwa otu onye otu ndị ntọ ahụ tọọrọ ya, bụ Davidson Odigho.

Onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhaneze na ndị uweojii na steeti ahụ, bụ DSP Bright Edafe kwupụtara nke a ụbọchị ụka, ma mekwa ka a mara na onye a na-enyo enyo bụ Davidson Odigho, bụ onye a nwụchiri ka ya na ndị otu ya na-achọkwa ịtọ̀rọ̀ otu nwoke si mba Europe wee lọta na nsonso a.

Ọ sị na ọ bụ n'abalị iri atọ nke ọnwa Nọvemba ka ha nwetara ozi site n'aka onye ọgbaatùmtùm banyere ụmụnwoke abụọ jigasị mma we nwụchie ma jide otu nwanyị bụ onye obodo Ughelli na mpaghara okporoụzọ ebe dara òwù dị n'akụkụ obodo Irri-Aviara, ma bụrụkwa ndị a na-enyo enyo na ha bụ ndị ntọ.

Ọ gara n'ihu kọwaa na ka ha nwetachara ozi ahụ, onye ji ọkwa DPO mpaghara Oleh, bụ SP Paul Oboware kpọkọtara ndị ọrụ ya ngwangwa, wee duru ha na ndị nche obodo Irri, wee gbochie ma gbaa ọhịa dị ebe ahụ gburugburu.  Ngwangwa ndị ntọ ahụ hụrụ ha, ha gbahapụrụ onye ahụ ha tọọrọ, wee gbaba n'ime ọhịa.

Nnyocha e mere na-egosi na a tọọrọ nwaanyị ahụ n'abalị iri na isii nke ọnwa Nọvemba ahọ a na mpaghara okporoụzọ Olori dị n'Ughelli ka ọ na-ala be ya.

N'okwu nke ya banyere ihe ahụ, Kọmishọna ndị uweojii na steeti ahụ, bụ CP Ari Muhammed Ali nyere onye DPO ahụ ntụziaka ka ọ hụ na a a nwụ̀chiri ndị ntọ ahụ ngwangwa.

N'ịgbaso ya bụ ntụzịaka nke CP Ali, DPO ahụ bidoro nyocha na ịgba mbọ iji jide ndị omekome ahụ. Nke mere na o tinyesịrị ndị ọrụ ya na ndị nche ahụ na mpaghara ebe dị ańaa iji nye aka n'ọrụ ịhụ na a nwụ̀chikọ̀rọ̀ ndị ahụ.

Agbambọ ya ahụ mechaara mị̀ta mkpụrụ a tụrụ anya n’abalị abụọ nke ọnwa Desimba a oge ha bụ ndị uweojii nwètàrà òkù mberede ọzọ l site n’aka ndị nche obodo Irri, na a hụrụ ụfọdụ ndị omekome n’akụkụ ebe ahụ ka ha bù otu ụgbọala  Toyota Hilux ọcha na-enweghị ákàrà wee na-arụ ọrụ ọjọọ na mpaghara ebe ahụ.

Ọ gara n’ihu kwuo na ọ bụ oge ndị omekome ahụ na-achọ ịtọrọ otu nwoke si mba Europe lọta ka ha bidoro nwebe nghọtàhie, nke mezịrị ka esemokwu dapụta n’etiti ha, nke na ndị bi na mpaghara ahụ malitere nụba olu ha ma nyòbe ha enyobe; ha wee kpọtụrụ ndị nche obodo ahụ; ndị nche ahụ n'onwe ha wee kpọtụrụ ndị uweojii.

DPO ahụ durukwàrà ndị ọrụ ya ozigbo wee jiri uche gaa n'ebe ahụ, wakpò ndị ahụ ozigbo, ma nwụchie otu onye n'ime ha, bụ Davidson Odigho (gbara afọ iri abụo na isii) ma bụrụkwa onye obodo Irri dị n'Oleh, ebe ndị òtù ya ndị ọzọ buru ụgbọala Hilux ọcha ahụ wee rie mbọmbọ ọsọ.

Mgbe a gbara ya ajụjụọnụ, onye ahụ e jidere jiri ọnụ ya kwupụta na ya so na ndị otu ahụ tọọrọ nwaanyị ahụ dị afọ iri isii na atọ n'abalị iri atọ nke ọnwa Nọvemba, ma kwuo na ha gbahapụrụ ya mgbe n'ime ọhịa ahụ wee rie mbọmbọ ọsọ, mgbe ha chọpụtara na ndị uweojii ahụla ha.

Ya bụ nwoke durukwàrà ndị uweojii gaa n'ụlọ ya, ebe e nwetere otu egbe Ak 47, mgbọ égbè 7.62mm ruru iri na itoolu (19), otu égbè Magazine, otu egbe agbaa asụ̀chie, na mgbọ égbè katrij a ghaghị agba di iri abụọ na isii (26) n'ọnụọgụgụ, bụkwa nke ọ zogasị̀rị̀ n'ime akpa akpa ma lie ya n'ime ala n'ụlọ ya.

DSP Edafe kwukwara na a na-aga n'ihu ịchụ nta ndị otu ya ndị ahụ nọ n'ọsọ ugbua.

CP Ali, ka ọ na-ekele ndị ọrụ ya maka ezi mbọ niile, ọ gwakwara ụmụafọ steeti Delta ka ha gaa n'ihu na-erube isi n'iwu ma na-enyekwa ndị uweojii ozi kwesiri ekwesi na ozi ga-enyekwara ha aka n'ọrụ ya, iji hụ na e nwere ezi ọnọdụ nchekwa bụ ị̀gbà na steeti ahụ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484