E Jidela Mmọnwụ Abụọ Zuru Ohi Na Steeti Ondo

Oct 24, 2021 - 21:29
 0
E Jidela Mmọnwụ Abụọ Zuru Ohi Na Steeti Ondo

Mmọnwụ abụọ ezuola ohi ma merụọ ndị mmadu bi n’ogbe Melege nke dị n’okwuru ọchịchị Owo na steeti Ondo, ahụ.

Dịka ọ na-ekwuputa na ya bụ ihe mere eme n’ezie, okwuputa okwu kọmand ndị uweoji steeti ahụ, Funmi Odulami kwuru na ndị mmọnwụ ahụ e nyere aha ha dịka Sheriff Ojo na Muhammed Lukman ka a nwuchikọrọ ka ha zuchara mmadụ ohi. Onye ahụ ha zuru ohi bụ Adinoyi Mohammed ka ekwuru na ha napụrụ ya ego dị puku narị naịra atọ na iri asaa (N370,000) tinyekwara ekwentị ya.

Odulami kwuru sị: “Mmadụ abụọ ahụ a na-enyo enyo, bụ ndị na-akpagharị n’onwe ha dịka mmọnwụ ji mma merụọ otu onye aha ya bụ Adinoyi Mohammed ahụ ma napụ ya N370,000, ekwentị gburu ego dị N32,000 na otu akwa a na-eyi n’elu (shirt) gburu naira N2,500.”

  Ọ gara n’ihu kọwaa na ha merukwuru nna nwoke ahụ ahụ, onye aha ya bụ Saliu Ajayi tupu ha hapụ ebe ahụ ha nọrọ kpa mkpamkpa, ma ndị ọrụ nchekwa mechara jide ha. Ihe e nwetara n’aka ha bụ nnukwu mma abụọ, ogwụ (charms) na akwa mmọnwụ ga.

  Ka ọ dị ugbu a, a nwuchikọọla ha dịka a ga-akpụpụ ha ụlọikpe mgbe adighi anya. Otu o sila dị, oge ozi ruru anyi aka, a na-amazi imi n’ala ịhụ na a nwụchikọrọ ndị mmọnwụ ndị ọzọ nọ n’ọsọ

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484