Maazị Ezeanidike Ejirila Keke Iri Kwàdo Ndị Ntorobịa n'Akwaeze

May 6, 2022 - 11:42
 0
Maazị Ezeanidike Ejirila Keke Iri Kwàdo Ndị Ntorobịa n'Akwaeze

Izunna Okafor dere akụkọ a

Maazị John Ezeanidike nọrọ na nsonso a wee mee ka ihu ọchị wa ọtụtụ ndị ntorobịa n'obodo Akwaeze dị n'okpuruọchịchị ime obodo Anaọcha nke steeti Anambra, site n'ikesàrà ha ọgbaatumtum ụkwụ atọ a maara dịka Keke Napep, dịka ótù ụzọ isi kwàdo ha ka ha bụrụ ndị kwụụrụ onwe ha.

Ikesà Keke Napep ahụ bụ nke o mere n'okpuru òtù ọrụ obiebere ya ‘Ezeanidike Business Foundation’, ma bụrụkwa àgbà nke ise ọ na-eme. O sitegokwa n'atụmatụ ahụ wee kwàdo ndị ntorobịa karịrị iri asatọ n'ọnụọgụgụ n'obodo ahụ.

N'okwu ya oge ọ na-enyefè ndị ntorobịa ahụ Keke ahụ, Maazị Ezeanidike, nke onye nọchitere anya ya na mmemme ahụ bụ Maazị Osita Udemba kwùrù na ọdịmma na ọganihu obodo ahụ na ụmụafọ ya na-echu ya ụra, nke mezịrị o ji agbasi mbọ ike n'ụdị nke ya iji kwàlite ma kwàdó ha.

O kwuru na ọ malitere òtù ọrụ obiebere ahụ site n'inye ọtụtụ ndị mmadụ ohere agụmakwụkwọ n'efu iji kwàlite mmụta na mpaghara ahụ, wee megide, malite ikesà Keke nyegara ndị ntorobịa enweghị ọrụ n'obod ahụ, iji kpọpụ uche ha pụọ na mpụ na arụrụala, ya na iji mee ha ka ha bụrụ ndị kwụụrụ onwe ha.

Ọ gwara ndị ntorobịa ahụ e kesààrà Keke ahụ ka ha jiri ha baara onwe ha uru, ma dụkwa ha ọdụ ka ha na-ebi ezi ndụ ma bụrụkwa ezigbo ndị nnọchaianya obodo Akwaeze n'ebe ọbụla ha hụrụ onwe ha.

N'okwu ha n'otu n'otu, eze ọdịnala obodo ahụ, bụ Igwe Ndubuisi Okpala na onyeisi ọchịchị obodo ahụ, bụ Maazị Ignatius Maduka kelere Maazị Ezeanidike nà òtù ya maka ọmarịcha nkwàdo ahụ ọ na-enye ndị ntorobịa nà ntụnye ndị ọzọ dị icheiche o megoro n'ịkwàlite mmepe obodo ahụ.

Ha gwàkwàzịrị ndị ritere uru na Keke ahụ e kesara ka ha jiri ya gbasie mbọ ike ma na-enyekwara ndị ọrụ nchekwa aka n'ọrụ nchekwa obodo ahụ, ọkachasị site n'itinye anya nke ọma ịma ndị na-abata n'obodo ahụ, ọkachasị oge ha ji Keke ahụ agba n'ime obodo.

N'okwu nke ha n'otu n'otu n'aha ndị ọzọ, ụfọdụ n'ime ndị ritere uru na Keke ahụ, nke gụnyere Maazị Chukwuebuka Okafor na Obidi Okpala kwupụtara obiụtọ ha banyere nke ahụ, ma kelee nwa amadi ahụ maka ezi nkwàdo ahụ, kpekwa ka Chineke gaa n'ihu na-agọzi ya ma na-enyekwa ya ezi ahụike. He kwezịrị nkwà iji Keke ahụ wee gbaa mbọ nke ọma ma gbapụta ihe a hụrụ anya, nyekwa ndị ọzọ nkwàdo n'ụdị nke ha.

Ya bụ mmemme dọtara ọtụtụ ndị dị icheiche e ji okwu ha agba izu, ndị ọrụ gọọmenti, na ndị ji ọkwa dị icheiche n'obodo ahụ na mpụga ya.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484