Ndị Uweojii Anambra Anwụchiela Mmadụ Asatọ Maka Otu Nzuzo

Apr 23, 2021 - 17:33
 0
Ndị Uweojii Anambra Anwụchiela Mmadụ Asatọ Maka Otu Nzuzo

Izunna Okafor dere akụkọ a


Ụbọchị niile nwere ike bụrụ nke onye ohi, mana otu ụbọchị ga-abụrịrị nke onye nwe ụlọ.

O wee bụrụ n'ịgbasò nke ahụ ka ndị uweojii steeti Anambra jiri nwụchikọọ mmadụ ise a na-enyo ènyò na ha bụ ndị otu nzuzo.

Dịka ozi a kụpụrụ site n'aka onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhaneze na ndị uweojii na steeti Anambra, bụ DSP Ikenga Toochukwu siri kọwaa, ndị ahụ bụ ndị a nwụchikọrọ site na mpaghara ebe dị iche iche na steeti ahụ, ma bụrụkwa ndị a na-enyo ènyò na aka ha dị na nkwàtụ ahụ ndị òtù nzuzo kwàtụrụ n'Awka bụ isi obodo steeti ahụ ụbọchị ụka.

Nkwàtụ ahụ bụ nke e sitere na ya wee gbagbuo mmadụ abụọ a maghị ndị ha bụ na mpaghara azụ Mahadum Nnamdi Azikiwe dị n'Ifite Awka ụbọchị ụka.

O mere ka a mara na ha jikeere onwe ha ozigbo wee wụchaa n'ebe ahụ ngwangwa ha nwetara ozi banyere nkwàtụ ndị otu nzuzo ahụ; mana oge ha rutere n'ebe ahụ, ndị òtù nzuzo ahụ hụchatara ha, ha wee ripù ọsọ. Ndị uweojii ahụ chụsòrò ha ozigbo ka nkịta na-achụ nchì n'ọdọ ìrùrò, wee nwụchikọọ mmadụ ise n'ime ha.

DSP Toochukwu gakwazịrị n'ihu kọwaa na a ka na-eme nnyòcha banyere iji wee nwụchikọọ ndị òtù ahụ ndị nọ n'ọsọ ugbua.

N'akụkọ ọzọ dịkwa ka ibe ya, ndị uweojii steeti Anambra jìdèkwàrà mmadụ atọ ọzọ a na-enyo ènyò na ha bụ ndị òtù nzuzo. Mmadụ atọ ahụ gụnyere: Maazị Chinedu Aniegbunam ( gbara ahọ iri abụọ na atọ), Maazị Okoye Tochukwu (gbara ahọ iri na asaa), na Okechuwu Chijioke (gbara ahọ iri abụọ na atọ).

DSP Toochukwu kọwàra na ndị ahụ bụ ndị a nwụchikọrọ n'ụzọ Nise, ma bụrụkwa ndị jigoro ọnụ ha wee sàá asịsa oge a na-agba ha ajụjụọnụ, wee kwuo na ha bụ ndị otu nzuzo, ma kpọkwa aha otu nzuzo ha.

O mere ka a mara na ihe dị iche iche e nwetere n'aka ndị ahụ gụnyèrè nsụsụ egbè abụọ, mgbọ égbè ise, na ọgbaatumtum abụọ.

N'okwu ya banyere nke ahụ, onyeisi ndị uweojii na steeti Anambra, bụ CP Monday Bala Kuryas, fsi, katọrọ akparamagwa ndị otu nzuzo na ndị omekoome ndị ọzọ na steeti ahụ, ma foro ntutu taa, sị na ya na ụlọọrụ ya agaghị ezù ike,  wee ruo mgbe ha memìlàchàrà ndị omekoome n'ime obodo dị iche iche nà mpaghara niile nke steeti ahụ.

Dịka ọ na-ekele ndị Anambra maka nkwàdo ha, ọ kpọkùkwazịrị ha ka ha gaa n'ihu inye ha na ndị ọrụ ha ozi ga-enyere ha aka n'ọrụ. O kwukwazịrị na a ga-akpụpụ ndị ahụ ụlọikpe ma kpee ha ikpe ma ọ bụrụ na e mechaa nnyòcha banyere ihe ha mere.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484