Ndị Uweojii Anambra Ejidela Mmadụ Isii Maka Izuru Ma Reghaa Ngwahịa Mmadụ

Jun 3, 2020 - 15:53
Jan 24, 2021 - 15:55
 0
Ndị Uweojii Anambra Ejidela Mmadụ Isii Maka Izuru Ma Reghaa Ngwahịa Mmadụ

By Izunna Okafor, Awka, Nigeria | Igbo Radio | News in Igbo Language

Aka ndị uweojii steeti Anambra anwụchiela mmadụ isii maka ikonùkọ, zuo ma reghaa ngwaahịa aluminum ingot gburu ego karịrị nde naịra iri, bụ nke a kwajubere n'otu nukwu ụgbọala e ji ebu ibu.

Ọ bụ onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhaneze na ndị uwe ojii na steeti ahụ, bụ Maazị Haruna Mohammed mere ka a mara maka njide ahụ e jidere ndị ahụ oge a na-akpụgharị ha n'ụlọọrụ ndị uweojii dị n'Ọnịtsha.

O mere ka a mara na mmadụ isii ahụ gụnyere Maazị Abdullahi Umar (bụ onye Kastina, gbara ahọ iri anọ na asatọ); Maazị Alhaji Aliyu Idris (bụ onye Kastina, gbara ahọ iri ise na abụọ); Maazị Dickson Ada (bụ onye steeti Edo, gbara ahọ iri ise na ise); Maazị Friday (bụ onye steeti Edo, gbara ahọ iri anọ na abụọ); Maazị Suleiman Abdulkareem (bụ onye steeti Oyo, gbara ahọ iri anọ); na Maazị Godswill Ebirim (bụ onye steeti Imo, gbara ahọ iri ise na ise)

Dịka o siri kọwaa, ngwaahịa ahụ bụ nke ọ bụ ụlọọrụ Lloyd Industries Limited, dị na Sango Ota n'ime Steeti Ogun nwè ya; ma bụrụkwa nke e tinyere n'ụgbọala Mac Truck nwere akara KRD 771XX ka e buga ya ebe a na-edobe ngwaahịa n'ọdụ ụgbọ mmiri Apapa, bụ 'Apapa Wharf'. 

Mana onye na-anyà ụgbọala ahụ, bụ Maazị Suleiman Abdulkareem gbàra ìzù ọjọọ, ya na mmadụ ise ndị ọzọ; ha wee tinye ngwaahịa ahụ na nnukwu ụgbọala abụọ ọzọ nwere akàrà ABH389XA nah UGH434XR.

Ha butezịrị ngwaahịa ahụ n'ahịa ebe a na-ere akpakara dị n'Ọnịtsha, bụkwa ebe ha nọrọ wee resi ya onye ha zùbèrè iresi ya, bụ Maazị Godswill Ebirim n'ọnụ ego dị nde naịra abụọ na ụma ise. Otu ọ dị, a nwụchikọzịrị ya bụ nwoke n'ụlọ ọba ego Zenith dị na mpaghara ụzọ 'Port Harcourt Street', oge ha gara iweta ego ọ ga-eji zụrụ ngwaahịa ahụ n'ọnụ akpakara. 

Ya bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii, bụ Maazị Mohammed gara n'ihu kọwaa na ndị ọrụ ha nọ na mpaghara Ọnịtsha gbachibidoro ma jide nnukwu ụgbọala abụọ ahụ bu ngwaahịa ahụ oge ha nwetara ozi banyere nke ahụ. Ọ kọwakwara na ha achọpụtala onye ọ bụ ya nwe ngwaahịa ahụ n'eziokwu, ọbụnadị dịka ọ kpọkùrù ọhaneze ka ha na-akpachapụ anya ịmara ụdịrị ngwaahịa ha na-azụ na ụdị ndị na-eresi ha ahịa, iji zèéré ịdabà n'aka ndị ọjọọ maọbụ zụọ ahịa ga-eme ka ha kwaa ngara m mara n'oge ikpeazụ.

N'ajụjụ ọnụ a gbara ya, onye ahụ nya ụgbọala ahụ, bụ Maazị Suleiman Abdulkareem ((bụkwá onye na-anyàra ụlọọrụ 'Lloyd Industries' ụgbọala, kwuru n'eziokwu na ọ bụ ya na ndị ọzọ kpàrà nkàtà imemìla ngwaahịa ahụ, bụ nke a gwara ya ka o buru gaa ebe a na-edobe ngwaahịa n'ọdụ ụgbọ mmiri Apapa, bụ 'Apapa Wharf'.

Onye ahụ e resikwara ahịa ahụ, bụ Maazị Godswill Ebirim kwuru eziokwu na ọ bụ ya kwụrụ ụgwọ e jiri buru ngwaahịa ahụ gbadata Ọnịtsha, bụ nke ọ tụnyere ego dị narị naịra anọ.

Maazị Mọhammed mekwara ka a mara na a ka na-eme nnyocha banyere nke ahụ, nke, mgbe e mechara ya, a kpụpụ ndị ahụ ụlọ ikpe.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.