Korona: Ụmụafọ Ossomala Bi Na USA Ekesàràla Ndị Obodo Ha Erimeri

Jun 10, 2020 - 16:36
Jan 24, 2021 - 16:36
 0
Korona: Ụmụafọ Ossomala Bi Na USA Ekesàràla Ndị Obodo Ha Erimeri

By Izunna Okafor, Awka, Nigeria

Ụmụafọ obodo Ossomala dị n'okpuru ọchịchị Ọgbaru bi na mba USA ekesàarala ndị obodo ahụ akpa osikapa ruru iri abụọ na asatọ n'ọnụọgụgụ, iji belatara ha agụụ na ihe isi ike ndị ọzọ ha nwere ike ịdị na-agabiga n'ime oge ugbua n'ihi ọrịa nje korona.

N'okwu ya na mmemme ikesà erimeri ahụ, bụ nke weere ọnọdụ n'obi eze ọdịnala obodo ahụ, bụ Igwe Victor Awogu; onye nyefere ihe ndị ahụ n'aka ndị obodo ahụ (n'aha ndị butere ya), bụ Oriakụ Ijeoma Uche kọwara na ọrịa korona a metụtara ma onye ukwu ma onye nta n'ụzọ dị iche iche.

Ọ kọwara na ọbụnadị ndị ahụ butere ihe erimeri ahụ ka e kesesàára ha ketàkwàra òkè na mmetụta nke oge ọrịa korona a, n'ihi na ha anaghịzị aga ọrụ ogologo oge niile ahụ gọọmenti mba USA tiri iwu onye apụtakwala ezi; kama na o metụrụ ha n'obi inyere ha bụ ụmụnne ha aka, bụzị nke mere ha jiri kpebie ikesàrà ha akpa osikapa ahụ.

N'okwu nke ya na mmemme ahụ, eze ọdịnala obodo ahụ, bụ Igwe Victor Awogu, nke onye nọchitere anya ya bụ otu onye n'ime ndị ichie ya, bụ Maazị Patrick Chukwuma fọrọ ekele n'ụkpa wee bunye ndị ahụ tụkọtara erimeri ahụ, ma kọwaa ha dịka ndị obodo ahụ ji eme ọnụ.

Ọ gakwazịrị n'ihu kpee ka Chineke gọzie, kwụghachi ha mmaji kwuru mmaji, ma na-echekwaba ha oge  pụọ n'ajọ ọrịa ahụ.

Maazị Stephen Mbieri bụ onyeisi ógbè Isiolu dị n'obodo ahụ tinyekwara olu wee kelee ndị ahụ bunyere ha erimeri ahụ, ma kwe nkwà na a ga-ekesa ya etu o siri kwesi

A nọkwazịrị na mmemme ahụ wee kee akpa osikapa ahụ nyegara ndị nnọchianya ógbè iteghete e nwere n'obodo ahụ ka ha gazie kesaara ndị ógbè ha dị iche iche.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.