Ndị Uweojii Ejidela Ndị Ohi Atọ n'Anambra

Jul 22, 2020 - 17:25
Jan 26, 2021 - 17:26
 0
Ndị Uweojii Ejidela Ndị Ohi Atọ n'Anambra

By Izunna Okafor

N'ịgawanye n'ihu n'agha ahụ ọ na-ebu megide ohi, mpụ na arụrụala n'ime steeti Anambra, ndị uweojii steeti ahụ nọrọ na nsonso a wee nwụchie mmadụ atọ maka izu ohi.

Onye na-ahụ maka mmekọrị ọhaneze na ndị uweojii na steeti ahụ, bụ Maazị Haruna Mohammed bụ ya kwụpụtara nke a site n'ozi ọ kụpụụrụ ndị nta akụkọ iji mee ka ụwa mara bànyere nke ahụ.

Dịka o siri kọwaa, mmadụ atọ ahụ gụnyere Maazị Onyebuchi Osadebe (gbara ahọ iri abụọ na asatọ ma bụrụkwa onye obodo Akwu-Ukwu, dị n'okpuru ọchịchị ime obodo Idemili South nke steeti Anambra); Maazị Chibuike Ebere (gbara ahọ iri abụọ na atọ, ma bụrụkwa onye okpuru ọchịchị ime obodo Isiala Mbano nke steeti Imo); na Maazị Umoke Kelechi (gbara ahọ iri abụọ na abụọ, ma bụrụkwa onye sitere okpuru ọchịchị Ikwo nke steeti Ebonyi).

O mere ka a mara na mmadụ atọ a nọrọ na abalị iri na otu nke ọnwa a, wee jiri egbe wakpò otu nwoke, bụ Maazị Emmanuel Obi n'Akwa-Ukwu, wee zuo ya ohi ego narị puku naịra asaa (700,000), puku yurò asatọ (£8000) na puku dọlà atọ ($3000), tinyere ọtụtụ ekwentị.

Kaosiladị, ndị uwe ojii nọrọ na abalị iri na asatọ nke ọnwa a wee nwụchie ndị ohi ahụ oge ha nwetachara mkpesa bànyere ihe ha mere. O mekwazịrị ka a mara na ndị ahụ asàálá asịsà, kwuo na ọ bụ ha zuru ohi ahụ n'eziokwu.

Ihe dị iche iche e nwekọtara n'aka ha gụnyere égbè abụọ, mgbọ égbè anọ, ego dị narị puku naịra isii na ụma iri (N610,000), puku yuro anọ na ụma isii (£4,600), narị dọla isii ($600), otu ụgbọala shọtụụl e goro ọhụụ, bụ nke ha zuuru n'aka onye nwe ya, ya na ego onye nwe ụgbọala ahụ, Keke abụọ a zụrụ ọhụụ, ya na ekwentị atọ, bụcha ihe ha zutere n'aka ndị mmadụ.

Maazị Mọhammed kwuru na nnyocha miri èmì ka na-aga n'ihu banyere ndị ahụ na ihe ha mere, dịka onyeisi ndị uweojii na steeti ahụ bụ Maazị John Abang siri nye ntụziaka.

O kwukwazịrị na a ga-akpụpụ ndị ahụ ụlọikpe mgwamgwa e mechara nnyocha banyere arụrụala ha, ebe a ga-eji usoro iwu wee kwụọ ha ụgwọ ọrụ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.