Ndị NSCDC Ejidela Nwoke Ahọ Iri Anọ Na Asatọ Kwasoro Ụmụ Ya Atọ Iko n'Anambra

Jun 2, 2021 - 20:01
 0
Ndị NSCDC Ejidela Nwoke Ahọ Iri Anọ Na Asatọ Kwasoro Ụmụ Ya Atọ Iko n'Anambra

Izunna Okafor dere akụkọ a

Ọ bụ nnukwu arụ kwọ nwa ka a gbara n'anwụ, dịka ndị ọrụ 'Nigeria Security and Civil Defence Corps (bụ 'NSCDC' n'aha mkpirisì), ngalaba nke steeti Anambra, jidere ma kpụgharịa otu nwoke gbara ahọ iri anọ na asatọ maka ịkwasò ụmụ ya ụmụnwaanyị atọ iko n'ike na steeti ahụ.

Arụrụala nwoke na njide e jidere ya bụ nke a gbara n'anwụ site n'aka onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhaneze na ụlọọrụ NSCDC na steeti Anambra, bụ ASC I Okadigbo Edwin, bụ onye kụpụụrụ ndị ntaakụkọ ozi na nsonso a n'Awka bụ isi obodo steeti Anambra, banyere ihe ahụ ya bụ nwoke mere.

Dịka o siri kọwaa, nwoke ahụ, bụ Maazị Igbo Thomas, bụ onye obodo Okolo Anị dị n'okpuru ọchịchị ime obodo Igbo Etiti nke steeti Enugu, ma biri ebiri n'obodo Enuọjị dị n'Enugwu-Ukwu, n'okpuru ọchịchị Njikọka dị na steeti Anambra, bụ ebe ọ nọrọ wee kụọ akụmakụ ahụ.

O mere ka a mara na ọ bụ n'ọnwa gara aga ka a nọrọ wee wètara ha mkpesa site n'aka ótù òtù nnọrọonwe a maara dịka 'Child Protection Network (CPN)' wee gwa ha na otu nwoke nọ be ya wee na-akpọrikọ ma na-amazụrị ụmụaka atọ ọ mụrụ amụ, bụ ụmụaka gbara ahọ asatọ, ahọ atọ, na ọnwa iri na asatọ n'otu n'otu.

Nke a, dịka o siri kọwaa, mézịrị ka onyeisi ha n'ụlọọrụ NSCDC ahụ, bụ Comdt David Bille, FCIA, chịkọba ndị ọrụ ya ozigbo wee zipu ha ka ha ga nwụchikọọ ya bụ nwoke arụrụala, bụ nke ha mere ozigbo ngwangwa ha ruru n'ebe ahụ, wee kpụrụ ya bịa n'isi ụlọọrụ ha dị n'Awka.

Ọ kọwara na oge a gbara ya ajụjụọnụ, na nwoke ahụ tụbụrụ asị na mbụ wee sị na o meghị ihe ahụ a na-ekwu na o mere; mana o mechaziere kweta na ọ bụ eziokwu na o mere ya bụ ihe oge ụmụ ya bịara wee nọrọ n'ihu ya gbaa akaebe na o riri pịara ha ọkụ n'eziokwu, ma kwuo na ọ bụghị nke mbụ ọ na-eme ihe dị etu ahụ.

Maazị Edwin kwukwazịrị na a kpọrọ ụmụaka ahụ gaa ụlọọgwụ maka ilele ha ahụ na inye ha ọgwụgwụ na nleruanya kwesiri ekwesi; ọbụladị dịka o mere ka a mara na ha ka na-eme nnyocha banyere arụrụala nwoke ahụ, nke mgbe ha mechaara ya, a kpụpụ ya ụlọikpe, ebe a ga-eji usoro iwu wee nye ya ntaramahụhụ ruru ya.


N'akụkọ ọzọ dịkwa ka ibe ya, ndị ọrụ NSCDC ahụ nọkwara na nsonso a wee jide otu onye a na-enyo ènyò na ọ bụ onye otu nzuzo.

Akụkọ kọrọ na ya bụ nwoke wụrụ aja ngwuru wee mabata n'ogige isi ụlọọrụ NSCDC dị n'Awka, nke mezịrị e jiri nwụchie ya. 

Mgbe e jidere ya, nwaokorobịa ahụ kọwara na ọ bụ ọsọ ndụ ka ọ na-aga wee wụbàta n'ebe ahụ, n'ihi na ndị otu nzuzo na-achụ ya ọsọ oge ahụ ka ha memilaa ya.

Nnyocha ka na-agakwa n'ihu banyere nwaokorobịa ahụ, nke mgbe e mechara ya, a kpụpụkwa nwoke ahụ ụlọikpe.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484